Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/97 p. 8
  • Dabere na Jehova Ime Ka Ihe Na-aba Ụba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dabere na Jehova Ime Ka Ihe Na-aba Ụba
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ n’Ozi Ubi Bụ́ Ndị A Tụrụ Aro Ha
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ịmalite Ọmụmụ Ihe na Broshuọ Na-achọ
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 8/97 p. 8

Dabere na Jehova Ime Ka Ihe Na-aba Ụba

1 “Enwetara m na nke mbụ ya ọṅụ pụrụ iche nke inye aka iguzobe ọgbakọ ọhụrụ. Nke a were ihe karịrị afọ abụọ nke ịrụsi ọrụ ike, ịnọgidesi ike n’ekpere na ịtụkwasị Jehova obi bụ́ onye ‘na-eme ka ihe na-aba ụba.’” Otú a ka otu onye ọsụ ụzọ nwere nlezianya dere bụ́ onye mụtara mkpa ọ dị ịdabere na Jehova maka ịba ụba. (1 Kọr. 3:5-9) N’ọchịchọ anyị na-achọ ndị nwere mmasị n’ihe ime mmụọ, nkwado Chineke dịkwa anyị mkpa ma ọ bụrụ na ije ozi anyị ga-amịpụta mkpụrụ.—Ilu 3:5, 6.

2 Ịba Ụba Chọrọ Nzụlite: Ọ dị mkpa ịzụlite mkpụrụ nke eziokwu ma ọ bụrụ na ọ ga-aba ụba. Ịgaghachi ọzọ mgbe otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ nke nleta mbụ anyị gasịrị na-arụpụta ezi ihe mgbe mgbe. Na-ekpo ọkụ, na-enwekwa omume enyi. Mee ka ahụ ruo onye nke ọzọ ala. Ekwula okwu nile. Kwee ka ọ mara gị, gosikwa na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ dị ka mmadụ.

3 Na July ruo August, anyị ga-elekwasị anya n’inyefe ndị mmadụ anyị ga-ezute ụdị broshuọ dị iche iche. Otú ọ dị, ọ dịkwa anyị mkpa isochi mmasị ndị e gosiri n’akwụkwọ ndị anyị nyefere. Anyị na-eme nke a site n’ime nletaghachi na inyefe ọmụmụ Bible. (Mat. 28:19, 20) Iji mee nke a, a pụrụ iji broshuọ Na-achọ malite ọmụmụ ihe. Ị pụrụ ịhụ aro anọ ndị a na-esonụ dị ka ndị na-enye aka.

4 Ọ bụrụ na i sooro onye na-enwe nchegbu banyere ọnọdụ ụwa nke na-akawanye njọ kwurịta okwu, ị pụrụ ịmaliteghachi nkwurịta okwu ahụ site n’ikwu, sị:

◼ “Ọ ghaghị ịbụ na i nwere nchegbu dịkwa ka mụ onwe m nwere banyere ndakpọ omume n’ọha mmadụ. Anyị na-anụ akụkọ ndị na-enye nsogbu banyere ime ihe ike n’ezinụlọ, na-akpata mmetọ ụmụntakịrị, nne na nna, na di ma ọ bụ nwunye. O yikwara ka ọtụtụ ndị mmadụ na-agha ụgha ma ọ bụ na-ezu ohi iji mezuo ọchịchọ ha. Ì chere na Chineke ji ụzọ ndị mmadụ si ebi ndụ ha akpọrọ ihe? [Nye ohere maka nzaghachi.] Chineke guzobere ụfọdụ ụkpụrụ maka mmadụ iji ebi ndụ, ha adịghịkwa arọ.” Gụọ 1 Jọn 5:3. Nyefezie broshuọ Na-achọ, ma sapeta ya n’ihe ọmụmụ nke 10. Gụọ paragraf mbụ. Rụtụ aka n’okwu na nkebi ahịrị okwu ndị ahụ e dere n’ụdị dị iche dị ná mmalite paragraf nke 2-6, ma jụọ onye nwe ụlọ omume nke o chere kasị emerụ ọha mmadụ ahụ. Gụọ paragraf nke na-esonụ ma gụọ otu akụkụ akwụkwọ nsọ ma ọ bụ abụọ ka oge kwere mee. Mechie site n’ịgụ paragraf nke 7, ma mezie ndokwa ịlọghachi maka nkwurịta okwu ọzọ.

5 Nye ndị i zutere bụ́ ndị nwere nchegbu banyere ezinụlọ ha, ị pụrụ ikwu ihe dị ka nke a:

◼ “Ì chere na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na Onye Okike ga-enye anyị ngwá ọrụ ndị dị anyị mkpa iji wulite ndụ ezinụlọ na-aga nke ọma?” Nye ohere maka nzaghachi. Webata broshuọ Na-achọ, sapeta ihe ọmụmụ nke 8, ma kọwaa na o nwere ụkpụrụ dị iche iche sitere na Bible maka ndị òtù ezinụlọ nile. Kwuo ka i gosi ya otú e si eji broshuọ ahụ ya na Bible nweta uru kasịnụ n’ime ya. Gbasoo ndụmọdụ ndị ahụ dị na peji nke 2 nke broshuọ ahụ. Mee ndokwa ịlọghachi iji gaa n’ihu n’ịmụ ihe ọmụmụ ahụ, ma ọ bụ ọ bụrụ na unu mụchara ya, mụọ ihe ọmụmụ ọzọ nke onye nwe ụlọ họọrọ n’ime broshụọ ahụ.

6 Nke a bụ ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem nke ị pụrụ iji nyefee usoro ọmụmụ Bible anyị. Gosi broshuọ “Na-achọ,” ma kwuo, sị:

◼ “Broshuọ a nwere usoro ihe ọmụmụ a chịkọtara n’otu metụtara ozizi ndị bụ isi nke Bible. Na peji nke ọ bụla, ị ga-enweta azịza nye ajụjụ ndị nyeworo ndị mmadụ nsogbu eri ọtụtụ narị afọ. Dị ka ihe atụ, Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?” Sapeta ihe ọmụmụ nke 5, ma gụọ ajụjụ ndị dị ná mmalite nke ihe ọmụmụ ahụ. Jụọ onye nwe ụlọ nke kasị masị ya, mgbe ahụkwa gụọ paragraf (ndị) kwekọrọ na ya, na-agụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị kwesịrị ekwesị. Kọwaa na a pụrụ ịchọta azịza na-eju afọ nye ajụjụ ndị ọzọ n’ụzọ dị mfe dịkwa ka nke a. Tụọ aro na ị ga-alọghachi ọzọ iji tụlee ajụjụ na azịza ọzọ.

7 Ma ọ bụ ị pụrụ ịhọrọ ịnwale ụzọ e mere ka ọ dị mfe e si ejekwu mmadụ maka ịmalite ọmụmụ Bible site n’ikwu, sị:

◼ “Ị̀ maara na n’ime nanị minit ole na ole, ị pụrụ inweta azịza nye ajụjụ Bible dị mkpa? Dị ka ihe atụ, . . .” Mgbe ahụ gụọ otu ajụjụ nke dị ná mmalite nke otu n’ime ihe ọmụmụ dị na broshuọ ahụ, otu nke i chere ga-amasị onye ahụ. Iji nweta ajụjụ ụfọdụ nke ị pụrụ iji mee ihe, lee paragraf nke 15 na 16 n’ime ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke March 1997, nke isiokwu ya bụ: “Nweta Obi Ike Ime Nletaghachi.”

8 Iji ọṅụ na-anara ihe ịma aka nke ime nletaghachi na iduzi ọmụmụ Bible bụ akụkụ nke ịbụ onye ya na Chineke “na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Ka anyị na-arụsi ọrụ ike iji zụlite mmasị ndị e gosiri ma dabere na Jehova iji mee ka ihe na-aba ụba, anyị ga-enweta ezi afọ ojuju nke ọrụ ọzọ na-apụghị inye.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya