Chekwaa Ya
Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ n’Ozi Ubi Bụ́ Ndị A Tụrụ Aro Ha
Ụzọ Isi Jiri Ihe Ntinye A Na-eme Ihe
Ihe ka ukwuu n’ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị na-esonụ pụtara ná mbipụta ndị gara aga nke Ozi Alaeze Anyị. Nwalee ole ị chọrọ n’ọrụ ịgba àmà gị, ma hụ ihe ga-esi na ya pụta. Chekwaa ihe ntinye a, ma tụlee ya mgbe ọ bụla ị na-akwadebe maka ozi.
Ị pụrụ ịkpali mmasị mmadụ n’Okwu Chineke ma ọ bụrụ na ị gaa n’isi ihe kpọmkwem. Jụọ otu ajụjụ gara n’ihe kpọmkwem, mgbe ahụ gụọ azịza ya dị mkpirikpi bụ́ nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ị pụrụ ịnwale aro ndị na-esonụ:
“Ka ị na-eche banyere ọdịnihu, ị̀ na-enwe olileanya ka ị̀ na-enwe obi abụọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible buru amụma banyere ihe ndị na-akpata nchegbu na-eme taa na ihe ndị ga-esi na ha pụta.”—2 Tim. 3:1, 2, 5; Ilu 2:21, 22.
“E nwere nchegbu dị ukwuu taa banyere nlekọta ahụ ike. Ị̀ maara na Chineke na-ekwe nkwa na ya ga-agwọ nsogbu ahụ́ ike nile ruo mgbe ebighị ebi?”—Aịsa. 33:24; Mkpu. 21:3, 4.
“Ị̀ maara na Bible na-ebu amụma na a ga-emesị nwee nanị otu ọchịchị ga na-achị ụwa dum?”—Dan. 2:44; Mat. 6:9, 10.
“Gịnị ka i chere ọnọdụ ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na Jizọs Kraịst achịwa ụwa?”—Ọma 72:7, 8.
“A na-akpa ókè megide ọtụtụ ndị n’ihi na ha bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, n’ihi okpukpe ha, ma ọ bụ agbụrụ ha. Olee otú i chere Chineke si ele ajọ mbunobi dị otú ahụ anya?”—Ọrụ 10:34, 35.
“Anyị maara na Jizọs Kraịst rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube n’oge ya. Ọ bụrụ na ị pụrụ ịgwa ya ka ọ rụọ otu ọrụ ebube ọzọ, gịnị ka ọ ga-abụ?”—Ọma 72:12-14, 16.
“Ịnụ banyere nsogbu agwụla ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ike. Ha chọrọ ịnụ banyere ngwọta. Ma olee ebe anyị pụrụ ịchọta ezi ngwọta nye nsogbu anyị?”—2 Tim. 3:16, 17.
“Ị̀ maara Alaeze ahụ ị na-ekpe ekpere maka ya n’Ekpere Onyenwe Anyị (ma ọ bụ, Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe)?”—Mkpu. 11:15.
Okwu Ndị E Ji Amalite Nkwurịta Okwu
Ndepụta ajụjụ ndị dị n’okpuru, bụ́ ndị e nwetara site n’isiokwu ndị dị n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, na-egosipụta nọmba peeji akwụkwọ nta ahụ bụ́ ebe a ga-ahụ azịza nke ọ bụla:
N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? (hw 4)
N’ihi gịnị ka e ji nwee ajọ omume nke ukwuu? (hw 4)
È nwere ezi ihe ndị mere a ga-eji kwere na Chineke? (hw 3)
È nwere ihe mere a ga-eji nwee obi ike na Chineke? (hw 3)
Olee otú anyị pụrụ isi nagide nsogbu nke ndụ ezinụlọ n’ụzọ ka mma? (hw 4)
Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndụ ezinụlọ anyị gaa nke ọma? (hw 4)
Bible ọ̀ bụ Okwu Chineke n’ezie? (hw 3)
Ọ̀ pụrụ ikwe mee ịdị ndụ ezi obi ụtọ? (hw 5)
Gịnị bụ nzube nke ndụ mmadụ? (hw 5)
Ụdị ụwa dị aṅaa ka i chere ụmụ anyị na-aga ibi na ya mgbe ha tolitere? (hw 4)
Gịnị ka Alaeze Chineke ga-arụzu? (hw 2-3)
Ànyị na-ahọrọ ọchịchị Chineke karịa nke mmadụ? (hw 3)
Ì kwenyere na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ? (hw 5)
Ì chere na ọ dị mgbe ọ bụla anyị ga-ahụ ezi udo n’ụwa a? (hw 6)
Ọnwụ ọ̀ bụ ebe ihe nile jedebere? Ka e nwere ihe ọzọ dịnụ mgbe a nwụsịrị? (hw 5)
Gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? (hw 5)
Gịnị mere anyị ji aka nkà na-anwụkwa anwụ? (hw 5)
Ọ̀ dị mgbe ọ bụla a ga-enwe ụwa ime mpụ na-adịghị na ya? (hw 5)
N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji agakwuru ndị mmadụ mgbe mgbe? (hw 7)
Aro Dị Iche Iche Maka Iche Broshuọ Na-achọ n’Ihu Mmadụ
“Obi abụọ adịghị ya na ị ga-ekweta na ọtụtụ mmadụ kweere na Chineke. Ndị nile kweere na ya na-ekweta na ọ dị ihe Chineke na-achọ n’aka anyị. Ihe ndị mmadụ na-apụghị ikwekọrịta na ya bụ, Gịnị ka Chineke na-achọ n’aka anyị?” Mgbe ahụ chee broshuọ Na-achọ n’ihu ya, sapeta ihe ọmụmụ nke 1, ma kwurịta ya.
“N’inwe ọtụtụ nsogbu ná ndụ ezinụlọ taa, ọ̀ dịwo mgbe i chere banyere isi ihe dị n’inweta obi ụtọ ezinụlọ?” Mgbe ọ zaghachisịrị, kọwaa na n’ime Bible, Chineke na-ekpughe ihe bụ́ isi na-eweta obi ụtọ ezinụlọ n’ezie. Gụọ Aịsaịa 48:17. Mgbe ahụ sapeta ihe ọmụmụ nke 8 na broshuọ Na-achọ, ma rụtụ aka n’ụfọdụ amaokwu Bible e zoro aka na ha ndị na-enye nduzi a pụrụ ịtụkwasị obi maka onye òtù ọ bụla n’ime ezinụlọ. Gụpụta ajụjụ ndị e depụtara ná mmalite nke ihe ọmụmụ ahụ. Jụọ ma onye ahụ ọ̀ ga-achọ ịgụpụta azịza ahụ.
“Broshuọ a nwere usoro ihe ọmụmụ sara nnọọ mbara banyere ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. Na peeji nke ọ bụla, ị ga-enweta azịza nye ajụjụ ndị nyeworo ndị mmadụ nsogbu eri ọtụtụ narị afọ. Dị ka ihe atụ, Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa?” Sapeta ihe ọmụmụ nke 5, ma gụọ ajụjụ ndị dị ná mmalite nke ihe ọmụmụ ahụ. Jụọ onye nwe ụlọ nke kasị masị ya, mgbe ahụkwa gụọ paragraf (ndị) kwekọrọ na ya, na-agụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwesịrị ekwesị. Kọwaa na a pụrụ ịchọta azịza na-eju afọ nye ajụjụ ndị ọzọ n’ụzọ dị mfe dịkwa ka nke a. Tụọ aro ka ị lọghachi iji tụlee ajụjụ ọzọ.
“Gịnị ka i chere na-akpata ihe ike nile a na-eme n’ụlọ akwụkwọ ọha na eze? Ọ̀ bụ ndị mụrụ ụmụ enyeghị ụmụ ha ọzụzụ na-akpata ya? Ka ọ̀ pụrụ ịbụ ihe ọzọ, dị ka aka ọrụ Ekwensu?” Nye ohere maka nzaghachi. Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ọ bụ aka ọrụ Ekwensu, gụọ Mkpughe 12:9, 12. Kọwapụta òkè Ekwensu na-ekere n’ịkwalite ọgba aghara n’ụwa. Mgbe ahụ sapeta ihe ọmụmụ nke 4 na broshuọ Na-achọ, ma jụọ onye ahụ ma ò chetụwo echiche ebe Ekwensu si bịa. Gaa n’ihu n’ịgụ na ịtụle paragraf abụọ mbụ. Ọ bụrụ na onye ahụ ahọrọ “ndị mụrụ ụmụ enyeghị ụmụ ha ọzụzụ” dị ka ihe na-akpata ime ihe ike n’ụlọ akwụkwọ, gụọ 2 Timoti 3:1-3 ma kọwapụta omume ndị o doro anya na ha so na-akpata nsogbu a. Mgbe ahụ sapeta ihe ọmụmụ nke 8 na broshuọ Na-achọ, gụọ paragraf nke 5, ma gaa n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ.
“Ì chere na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na Onye Okike ga-enye anyị ihe ọmụma ndị dị anyị mkpa iji wulite ndụ ezinụlọ na-aga nke ọma?” Mgbe ọ zaghachisịrị, webata broshuọ Na-achọ. Sapeta ihe ọmụmụ nke 8, ma kọwaa na o nwere ụkpụrụ dị iche iche sitere na Bible maka ndị òtù ezinụlọ nile. Kwuo ka i gosi ya otú e si eji broshuọ ahụ na Bible eme ihe iji nweta uru kasịnụ.
“N’ihi ihe ịma aka nile anyị na-eche ihu ná ndụ a na-adị ugbu a, ì chere na ekpere pụrụ inyere anyị aka n’ezie? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọtụtụ ndị na-ekwu na ekpere na-enye ha ume dị n’ime. [Gụọ Ndị Filipaị 4:6, 7.] Ọbụna otú ahụ, mmadụ pụrụ iche na a dịghị aza ekpere ya. [Sapeta ihe ọmụmụ nke 7 nke broshuọ Na-achọ.] Broshuọ a na-akọwa otú ekpere pụrụ isi baara anyị uru n’ụzọ kasị ukwuu.”
“Anyị anọwo na-agwa ndị agbata obi anyị okwu banyere ihe mere e ji nwee ọtụtụ okpukpe dị iche iche n’ụwa. Ma, e nwere nanị otu Bible. N’echiche nke gị, gịnị mere e ji nwee ọgba aghara a n’ihe banyere okpukpe? [Nye ohere maka nzaghachi. Sapeta broshuọ Na-achọ n’ihe ọmụmụ nke 13, ma gụpụta ajụjụ ndị bidoro ya.] Ị ga-enweta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ ndị ahụ site n’ịgụ ihe ọmụmụ a.”
Mgbe i nyefesịrị mmadụ magazin Ụlọ Nche na Teta!, jụọ ya ma ị̀ pụrụ ịgụrụ ya otu paragraf dị mkpirikpi. Ọ bụrụ na o kwe ka i mee otú ahụ, sapee broshuọ Na-achọ n’ihe ọmụmụ nke 5. Gụpụta ajụjụ ndị e depụtara ná mmalite nke ihe ọmụmụ ahụ, ma gwa ya ka o gee ntị maka azịza nye ajụjụ mbụ ahụ ka ị na-agụ paragraf mbụ. Mgbe ị gụsịrị paragraf ahụ, jụọ ajụjụ ya ma nụ ihe ọ ga-aza. Nyefee ya broshuọ ahụ, ọ bụrụkwa na ọ nara ya, mee ndokwa ịlaghachi iji mara ihe ọ ga-aza n’ajụjụ abụọ na-esonụ e depụtara n’ebe ahụ.
Aro Dị Iche Iche Maka Ụzọ Isi Na-eche Akwụkwọ Ihe Ọmụma n’Ihu Mmadụ
Ka i ji Bible n’aka, malite site n’ikwu, sị: “Anyị so ndị nile nọ n’okporo ámá unu taa na-atụle otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Ọ na-ekwu sị . . . ” Gụọ Jọn 17:3, jụzie, sị: “Ị̀ chọpụtara ihe e kwere nkwa ya ma ọ bụrụ na anyị enwee ụdị ihe ọmụma kwesịrị ekwesị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ebee ka mmadụ pụrụ isi nweta ụdị ihe ọmụma ahụ?” Mgbe ọ zasịrị, gosi ya akwụkwọ Ihe Ọmụma ma kwuo, sị: “Akwụkwọ a na-ezo aka n’ihe ọmụma nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Ọ na-eme otú ahụ site n’ịza ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị banyere Bible.” Gosi ya ndepụta nke ihe ndị dị n’ime ya, jụọkwa onye ahụ ma ò chetụwo echiche banyere nke ọ bụla n’ime isiokwu ndị ahụ.
“Ọ̀ dịtụwo mgbe i chere ma ikpe na-ezighị ezi na ahụhụ ndị gbara anyị gburugburu ma ọ bụ ọbụna ndị anyị onwe anyị na-enwe ahụmahụ ha hà na-emetụ Chineke n’obi n’ezie? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-emesi anyị obi ike na Chineke hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga-enyere anyị aka ịgabiga oge nsogbu.” Gụọ akụkụ ụfọdụ nke Abụ Ọma 72:12-17. Sapeta isi nke 8 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, kọwapụtakwa na ọ na-enye azịza na-enye nkasi obi banyere ajụjụ ọtụtụ nde mmadụ jụworo, N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? Ọ bụrụ na o kwe mee, tụlee ihe ụfọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị a tụlere na paragraf nke 3 ruo nke 5, ma ọ bụ mee otú ahụ mgbe ị gara nletaghachi.
“Ihe ka ukwuu n’ime anyị enwewo onye anyị hụrụ n’anya nwụnahụrụ anyị. Ì chetụwo echiche ma ànyị ga-ahụ ha ọzọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Jizọs nyere ihe àmà na a pụrụ ịnapụta ndị anyị hụrụ n’anya n’aka ọnwụ. [Gụọ Jọn 11:11, 25, 44.] Ọ bụ ezie na nke a weere ọnọdụ ọtụtụ narị afọ gara aga, ọ na-egosi ihe Chineke kweworo nkwa imere anyị.” Sapeta ihe osise dị na peeji nke 85 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gụpụta okwu nkọwa ya. Mgbe ahụ gosi ihe osise dị na peeji nke 86 ma kwuo okwu na ya. Tọọ ntọala maka nleta ọzọ site n’ịjụ, sị: “Ị̀ ga-achọ ịma ihe kpatara mmadụ ji na-aka nká, na-anwụkwa anwụ?” Gaghachi iji tụlee isi nke 6.
“Ọ̀ dịwo mgbe i chere banyere ihe kpatara ụmụ mmadụ ji achọ ịdị ndụ ka ogologo?” Mgbe ọ zasịrị, sapeta isi nke 6 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gụọ paragraf nke 3. Tụgharịa uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. N’izo aka n’ajụjụ abụọ dị ná ngwụsị nke paragraf ahụ, jụọ onye ahụ ma ọ̀ ga-achọ ịhụ azịza ha n’onwe ya. Ọ bụrụ na ọ sị na ya chọrọ, tụlee paragraf ole na ole na-esonụ.
“Anyị na-ajụ ndị mmadụ ma ha kwenyere n’ihe a . . . ” Gụọ Jenesis 1:1, jụzie, sị: “Ì kwenyere n’ihe ahụ e kwuru?” Ọ bụrụ na onye ahụ kwere, mgbe ahụ kwuo, sị: “Mụ onwe m kwa kwere. Otú ọ dị, ì chere na ọ bụrụ na ọ bụ Chineke kere ihe nile, na ọ bụkwa ya kpatara ajọ omume?” Mgbe ị nabatasịrị nzaghachi onye ahụ, gụọ Eklisiastis 7:29. Sapeta isi nke 8 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gụọ paragraf nke 2. Ọ bụrụ na o kwenyeghị na Jenesis 1:1, gbaa ya ume inyocha ihe àmà na-egosi na e nwere Onye Okike.—Lee broshuọ bụ́ Chineke Ọ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, peeji nke 4-9.
“Ì kwetara na n’ihi na ụkpụrụ omume nke oge a na-agbanwe n’ike n’ike, ọ dị anyị mkpa inwe ihe nduzi a pụrụ ịdabere na ya ná ndụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ bụ ezie na ọ bụ akwụkwọ kasị mee ochie, Bible na-enye ndụmọdụ dị irè maka ịdị ndụ n’oge a nakwa maka inwe obi ụtọ ná ndụ ezinụlọ.” Mgbe ahụ sapeta isi nke 2 n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma gụọ paragraf nke 10 nakwa ahịrịokwu mbụ na paragraf nke 11, gụnyere 2 Timoti 3:16, 17.
“Ị̀ ga-achọ ịmata ihe ọdịnihu anyị na nke ụwa a ga-abụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible chịkọtara ihe ọdịnihu ga-abụ n’otu okwu—Paradaịs! Ọ bụ ebe ahụ ka Chineke debere mmadụ abụọ mbụ mgbe o kesịrị ha. Lee ụzọ e si kọwaa otú ọ na-aghaghị ịdịworịị.” Sapee akwụkwọ Ihe Ọmụma na peeji nke 8, ma gụọ paragraf nke 9, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ndụ n’Ime Paradaịs.” Mgbe ahụ tụlee isi ihe ndị dị na paragraf nke 10 ma gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ e zoro aka na ya, Aịsaịa 55:10, 11. Tụọ aro ka ị gaa n’ihu n’ịtụle ihe ndụ ga-adị ka ya n’ime Paradaịs ahụ e weghachiri eweghachi, na-atụle paragraf nke 11-16.
Mgbe ị na-agara ndị i nyere magazin Ụlọ Nche na Teta! nletaghachi ị pụrụ ikwu, sị:
“Enwere m obi ụtọ inye gị magazin Ụlọ Nche n’oge gara aga m bịara. Ikekwe ị chọpụtara na aha magazin ahụ n’ozuzu ya bụ Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova. Taa, ọ ga-amasị m ịkọwa ihe Alaeze a bụ na ihe ọ pụrụ ịpụtara gị na ezinụlọ gị.” Sapetazie ihe ọmụmụ nke 6 na broshuọ Na-achọ, gụọkwa ma tụlee ya ruo n’ókè onye ahụ nwere ohere.
“Abịara m na nke gị na nso nso a ma nye gị magazin Ụlọ Nche na Teta! Magazin ndị a na-eme ka mmadụ na-akwanyere Bible na nduzi ọ na-enye banyere omume, ùgwù. Alaghachitere m ịbịa gosi gị ihe ga-enyere gị aka ịghọta Okwu Chineke n’ihi na echere m na ọ dị mkpa ka onye ọ bụla ghọta ya.” Gosi broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma, kwuokwa ka i duziere ya ọmụmụ Bible.
Mgbe ị na-enyefe nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị mere ochie karị bụ́ ndị nwere peeji dị 192, ị pụrụ ịnwale ụzọ iche ihe n’ihu a:
“E kwuwo ọtụtụ okwu banyere mkpa agụmakwụkwọ dị mma dị. N’echiche gị, ụdị agụmakwụkwọ dị aṅaa ka mmadụ kwesịrị inweta bụ́ nke ga-eme ka o nwee obi ụtọ kasị ukwuu na ihe ịga nke ọma ná ndụ? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Ilu 9:10, 11.] Akwụkwọ a [kwuo aha akwụkwọ ị na-enyefe] dabeere na Bible. Ọ na-ezo aka na nanị otu ebe a pụrụ isi nweta ihe ọmụma nke pụrụ iduba ná ndụ ebighị ebi.” Gosi otu ihe atụ kpọmkwem n’akwụkwọ ahụ, gbaakwa onye ahụ ume ịgụ ya.
Akwụkwọ Ndị Ọzọ
Nyochaa mbipụta Ozi Alaeze Anyị ndị gara aga iji hụ ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha maka inyefe akwụkwọ na broshuọ ndị ọzọ.
Ịkpọ Okwu Aha
Iji malite ọmụmụ Bible, nwalee otu n’ime ụzọ a nke ịkpọ okwu aha:
“Ị̀ maara na ị pụrụ inweta azịza nye otu ajụjụ dị mkpa sitere na Bible nanị n’ime minit ole na ole? Dị ka ihe atụ, . . . ” Mgbe ahụ, jụọ ajụjụ nke dị ná mmalite nke otu n’ime ihe ọmụmụ ndị dị na broshuọ Na-achọ, nke i chekwara ga-amasị onye ahụ.
“Akwụsịtụrụ m iji gosi gị usoro anyị ji enwe ọmụmụ Bible n’efu. Ọ na-ewe ihe dị ka minit ise iji gosi otú e si enwe ya. Ị̀ ga-ewepụtali minit ise?” Ọ bụrụ na ọ sị ee, jiri ihe ọmụmụ nke 1 na broshuọ Na-achọ gosi otú e si enwe ọmụmụ ihe, na-agụ nanị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụ abụọ ị họọrọ. Mgbe e mesịrị, jụọ sị: “Olee mgbe ị ga-enwe ihe dị ka minit 15 ka anyị wee tụlee ihe ọmụmụ na-esonụ?”
“Ọtụtụ ndị nwere Bible, ma ha amaghị na ọ na-aza ajụjụ ndị dị mkpa anyị nile na-ajụ banyere ọdịnihu anyị. Site n’iji ihe a e ji amụ ihe [broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma] eme ihe ruo ihe dị ka otu awa kwa izu, ị pụrụ inweta ihe ọmụma bụ́ isi banyere Bible n’ime ọnwa ole na ole nanị. M ga-enwe obi ụtọ igosi gị otú usoro ihe omume ahụ si aga.”
“Abịara m iji chee n’ihu gị usoro e ji enwe ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ọ bụrụ na ị ga-ekwe, m ga-enwe mmasị iji nanị minit ole na ole gosi gị otú ndị mmadụ nọ n’ihe dị ka ala 200 si atụle Bible n’ebe obibi ha dị ka ezinụlọ. Anyị pụrụ ịtụle nke ọ bụla n’ime isiokwu ndị a. [Gosi ya ndepụta nke ihe ndị dị n’ime akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Olee nke masịrị gị karịsịa?” Chere ka onye ahụ họrọ. Sapeta isiakwụkwọ ọ họọrọ, malitekwa ọmụmụ ihe ahụ na paragraf nke mbụ.
“M na-akụzi Bible n’efu ma nweekwa oge maka ndị ọzọ chọrọ ịmụ ihe. Anyị na-eji ihe a na-enye aka n’ịmụ Bible eme ihe. [Gosi akwụkwọ Ihe Ọmụma.] Usoro ọmụmụ ihe ahụ na-ewe nanị ọnwa ole na ole ma na-aza ajụjụ ndị dị ka: N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka nhụjuanya dịrị? N’ihi gịnị ka anyị ji na-aka nká, na-anwụkwa anwụ? Gịnị na-eme ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? na olee otú anyị pụrụ isi bịaruo Chineke nso? M̀ nwere ike igosi gị otú anyị si enwe ọmụmụ ihe ahụ?”
Ọ bụrụ na ị chọpụtawo ụzọ iche ihe n’ihu nke dị irè, nke na-akpali mmasị, nọgide jiri ya na-eme ihe! Nanị mee ka o kwekọọ n’akwụkwọ a na-enyefe n’ọnwa ahụ.