Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/02 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 1/02 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na January: Akwụkwọ ọ bụla nwere peeji dị 192 e bipụtara tupu 1987 nke ọgbakọ nwere. February: Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla mere ochie karị nke nwere peeji dị 192 nke ọgbakọ nwere. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Nyefee broshuọ Na-achọ, n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible.

◼ Ndị nkwusa nile e mere baptizim nọ ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke January 14 pụrụ inweta kaadị Advance Medical Directive/Release nakwa Identity Card maka ụmụ ha.

◼ Society nwere oké mkpa ndị ọrụ nwere nkà dị ka ndị mechanical engineer, ndị na-ede usoro ihe omume kọmputa (computer programmers), ndị injinịa na-ahụ maka ngwá ọrụ electronic, ndị na-atụpụta ụkpụrụ ụlọ, ndị civil engineer na ndị structural engineer, ndị quantity surveyor, na ndị ọkà n’iwu ụlo. Ndị a nile kwesịrị inwe digrii mahadum ma ọ bụ ihe ya na ya hà. Ndị ọkà ndị ọzọ a chọrọ ngwa ngwa bụ ndị na-anya ụgbọala, ndị na-arụzi ígwè ọrụ, na ndị maara ka e si eji ígwè obibi akwụkwọ arụ ọrụ. Onye ọ bụla nke chere na ya ruru eru, nke nwekwara mmasị ije ozi na Betel, kwesịrị ideta akwụkwọ iji gwa Society ma kwuo ka e nye ya akwụkwọ ndejupụta, ọ gwụla ma o nwetara akwụkwọ ndejupụta dị otú ahụ na nso nso a ná mgbakọ distrikti. Ndị na-etinye akwụkwọ kwesịrị ịbụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma ha enweghị ụmụ, ha kwesịkwara ịbụ ndị nweere onwe ha ịnakwere ọkpụkpọ òkù ịbịa Betel.

◼ Na-amalite na February, n’agafeghịkwa March 3, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Ịchọta Nchebe n’Ime Ụwa Dị Ize Ndụ.”

◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa ndị kwesịrị ekwesị maka ime Ememe Ncheta nke afọ a na Thursday, March 28, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya ndị ahụ ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Meenụ nchọpụta n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ ha ga-eji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere omume, anyị ga-atụ aro ka e nwee minit 40 ma ọ dịkarịa ala mgbe e mesịrị ihe omume tupu a malite ihe omume ọzọ ka mmadụ nile wee nwee ike irite uru zuru ezu n’ememe ahụ, na-enye ohere maka ikele ndị ọbịa na ịgba ndị ọhụrụ nwere mmasị ume. E kwesịrị ichebara ọnọdụ ngagharị na ndọwa nke ụgbọala echiche, gụnyere ibusa na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.

◼ E zigaworo ọgbakọ nile mpempe akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta maka 2002. Ọgbakọ ndị na-enwetaghị nke ha tupu January agwụsịa kwesịrị izite ọda maka ya, dee n’elu ya “attention: Shipping Office.”

◼ Biko rịbanụ ama na Ememe Ncheta nke 2003 ga-abụ na Wednesday, April 16, mgbe anyanwụ dasịrị. A na-ama ọkwa a tupu oge eruo ka ụmụnna nwee ike ime ndokwa ma ọ bụ nkwekọrịta ndị dị mkpa maka iji ụlọ nzukọ ndị e nwere mee ihe mgbe e nwere ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ya abụrụkwa na a ghaghị ịchọta ihe owuwu ọzọ. Ndị okenye kwesịrị iso ndị na-elekọta ebe ndị ahụ nwee nkwekọrịta, na-ejide n’aka na a gaghị enwe mkpọtụ site n’ihe omume ndị ọzọ a na-eme n’ihe owuwu ahụ ka e wee mee Ememe Ncheta ahụ n’udo na n’usoro. N’ihi ịdị mkpa nke ememe ahụ, n’ịkenye onye ga-ekwu okwu Ememe Ncheta, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọrọ otu n’ime ndị okenye ka ruo eruo kama nanị ịdị na-eme onye kwuo ibe ya ekwuo ma ọ bụ ịdị na-eji otu nwanna eme ihe kwa afọ. Ọ bụrụ na e nwere okenye ruru eru so n’ime ndị e tere mmanụ, nke pụrụ ikwu okwu ahụ, e kwesịrị ịhọrọ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya