“Wepụta Ihe Iche”
N’ọgbakọ Ndị Kraịst nke oge mbụ, e nwere mkpa maka ihe onwunwe bụ́ ndị chọrọ nlebara anya. A gbara onye ọ bụla ume ka ọ dabere n’otú ihe si na-agara ya nke ọma ma “wepụta ihe iche” dị ka onyinye iji gboo mkpa ndị ahụ. (1 Kọr. 16:1-3) N’ihi mmesapụ aka ha, ha nile ṅụrịrị ọṅụ ikwu “ọtụtụ okwu ekele nye Chineke.”—2 Kọr. 9:11, 12.
Taa, ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ndị Jehova na-arụ nọgidere na-agbasawanye, na-achọwanye nkwado ego. O kwesịrị ekwesị ka anyị onwe anyị kwa ‘na-ewepụta ihe iche’ mgbe nile iji nye aka gboo mkpa ahụ. (2 Kọr. 8:3, 4) A pụrụ inye onyinye ihe onwunwe n’ụzọ dịgasị iche iche. (Lee Ụlọ Nche nke November 1, 2001, peeji nke 28-29.) N’ụzọ ziri ezi, anyị na-ele nke a anya dị ka ihe ùgwù nke na-enye ezi obi ụtọ.—Ọrụ 20:35.