Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/08 p. 1
  • Anyị Nwere Ike Inye Jehova Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Nwere Ike Inye Jehova Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Anyị Ga-esi Ghara Ịna-emefusi Ikike Eletrik na Mmanụ Ụgbọala
    Teta!—2017
  • Ị̀ Ga-eji Ihe Ndị I Nwere Na-ejekwuru Chineke Ozi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mmanụ Ala—Ọ̀ Dị Mgbe Ọ Ga-agwụ?
    Teta!—2003
  • Gịnị Mere Anyị Ga-eji Enye Onye Nwe Ihe Niile Onyinye?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 3/08 p. 1

Anyị Nwere Ike Inye Jehova Ihe

1 Ị̀ maara na ụmụ mmadụ nwere ike inye Chineke ihe? Ebel ji ụmụ anụmanụ ya ndị dị oké ọnụ ahịa chụọrọ Jehova àjà, Noa na Job chụkwara àjà ndị yiri nke ahụ. (Jen. 4:4; 8:20; Job 1:5) N’eziokwu, àjà ndị dị otú ahụ enwetụghị otú ha si mee ka Onye Okike bakwuo ọgaranya n’ihi na ọ bụ ya nwe ihe niile. Ma àjà ndị ahụ gosiri otú ndị ikom ahụ kwesịrị ntụkwasị obi hụruru Chineke n’anya. Taa, anyị nwere ike iji oge anyị, ike anyị, na ihe onwunwe anyị chụọrọ Jehova “àjà otuto.”—Hib. 13:15.

2 Oge: Ọ bụ nnọọ ihe magburu onwe ya anyị ‘ịzụta oge’ site n’ihe ndị na-adịchaghị mkpa iji jekwuoro Chineke ozi! (Efe. 5:15, 16) Ikekwe, anyị nwere ike ịhazigharị oge anyị iji nwee ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ abụọ n’afọ. Anyị nwekwara ike ịdị na-anọtekwu aka n’ozi. Ịnọkwu nkeji iri atọ kwa izu n’ozi karịa ka anyị na-anọbu ga-atụkwasịrị anyị, ya dịkarịa ala, awa abụọ n’ihe anyị na-arụta n’ọnwa!

3 Ike: Iji nweta ike anyị ga-eji jee ozi, ọ dị anyị mkpa izere ntụrụndụ na ọrụ ndị ga-eme ka ike gwụchaa anyị nke na anyị agaghị enyeli Jehova ihe kasị mma anyị nwere. Ọ dịkwa anyị mkpa ịghara ịdị na-echegbu onwe anyị banyere ihe ndị nwere ike ‘ịnyịgbu’ obi anyị ma mee ka anyị gharazie inwe ike anyị ga-eji jeere Chineke ozi. (Ilu 12:25) Ọ bụrụgodị na anyị nwere ihe anyị kwesịrị ichere echiche, ọ ga-aka nnọọ mma ma anyị ‘tụkwasị Jehova ibu arọ anyị’!—Ọma 55:22; Fil. 4:6, 7.

4 Ihe Onwunwe: Anyị nwekwara ike inye ihe onwunwe anyị iji kwado ọrụ nkwusa. Pọl gbara Ndị Kraịst ibe ya ume ka ha ‘na-ewepụta ihe’ mgbe niile iji nwee ihe ha ga-enye ndị nọ ná mkpa. (1 Kọr. 16:1, 2) Anyị nwekwara ike ịdị na-ewepụta ego anyị ga-eji na-enye onyinye iji gboo mkpa ndị e nwere n’ọgbakọ anyị, nakwa iji kwado ọrụ nkwusa a na-arụ n’ụwa niile. Jehova na-eji onyinye anyị ji obi anyị nye akpọrọ ihe, a sịgodị na ọ dị obere.—Luk 21:1-4.

5 Jehova enyela anyị ọtụtụ ihe. (Jems 1:17) Anyị na-egosi na anyị ji ihe ndị o nyere anyị kpọrọ ihe site n’iji mmesapụ aka na-enye oge anyị, ike anyị, na ihe onwunwe anyị ndị ọzọ iji jeere ya ozi. Anyị ime otú ahụ na-eme ka obi tọọ Jehova ụtọ, “n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.”—2 Kọr. 9:7.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya