Ka Anyị Na-ewulirịta Ibe Anyị Elu Mgbe Anyị Nọ n’Ozi
1 Obi na-adị anyị niile ụtọ mgbe a gwara anyị “okwu [agbamume] e kwuru n’oge kwesịrị ekwesị.” (Ilu 25:11) Mgbe anyị na ndị ọzọ nọ n’ozi, olee otú anyị nwere ike isi hụ na mkparịta ụka anyị na-agba ume?
2 Mkparịta Ụka Na-ewuli Elu: Ọ ga-abụ nnọọ ihe na-ewuli elu ma ọ bụrụ na anyị ana-etinye ihe ndị metụtara ofufe Chineke ná mkparịta ụka anyị mgbe anyị nọ n’ozi! (Ọma 37:30) Anyị nwere ike ikwu otú anyị nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma, ma ọ bụ kọọ ahụmahụ ndị na-agba ume anyị nwere n’ozi ubi n’oge na-adịbeghị anya. (Ọrụ 15:3) Ò nwere ihe tọrọ anyị ụtọ n’ọgụgụ Baịbụl anyị, na magazin ndị ọhụrụ anyị gụrụ, ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe anyị gara? Anyị nwere ike ikwurịta ihe ndị e kwuru n’okwu ihu ọha anyị gere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’oge na-adịbeghị anya.
3 Obi nwere ike ịjọ anyị njọ mgbe onye nwe ụlọ jụrụ anyị ajụjụ anyị na-azalighị. Ọ ga-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị na onye anyị na ya na-arụ ejiri nkeji ole na ole, ka anyị sichara n’ụlọ ahụ pụta, tụlee ihe anyị nwere ike ịza mgbe ọzọ a jụrụ anyị ụdị ajụjụ ahụ, ikekwe unu atụlee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible. Ya bụrụkwa na otú onye anyị na ya na-arụ si zie ozi ọma masịrị anyị, anyị nwere ike ịgba ya ume site n’iji obi anyị niile jaa ya mma.
4 Na-ebute Ụzọ: Ò nwere ndị anyị na ha na-arụbeghị n’ozi na nso nso a n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anyị? Ịgwa ha ka anyị na ha rụọ nwere ike inye anyị ohere ‘ịgbarịta ibe anyị ume.’ (Rom 1:12) Obi na-adị ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị ọsụ ụzọ inyeaka ụtọ inwe ndị ha na ha ga-arụ n’ozi, karịsịa n’isi ụtụtụ na n’oge uhuruchi, bụ́ mgbe naanị ndị nkwusa ole na ole na-apụta ozi. Anyị nwere ike ịkwado ndị ọsụ ụzọ site n’iso ha aga ozi n’oge ndị ahụ. È nwere onye nkwusa ahụ́ na-esichaghị ike, bụ́ onye ọrịa belatarala ozi ya? Ịhazi ka anyị na onye dị otú ahụ soro gaa ozi, ikekwe mgbe anyị na-aga iduzi ọmụmụ Baịbụl, nwere ike ịba uru.—Ilu 27:17.
5 Ịja mmadụ mma na ikele ya, ọbụna maka obere ihe o mere, na-agba nnọọ onye ahụ ume. Anyị kwesịrị iburu nke ahụ n’obi mgbe anyị na ndị ọzọ na-arụ n’ozi, ebe ọ bụ na anyị chọrọ ịdị ‘na-ewulirịta ibe anyị elu.’—1 Tesa. 5:11.