Nyere Onye Gị na Ya So n’Ozi Ọma Aka
1. Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl onyeozi mgbe anyị na ndị ọzọ so n’ozi ọma?
1 Ọ bụ mgbe Pọl onyeozi na ụmụnna ya nọ ka ọ na-enwe ike ịgba ha ume, hanwa agbaakwa ya. (Rom 1:12) Mgbe ọ bụla gị na nwanna gị so gaa ozi ọma, ị̀ na-agba ya ume ma na-enyere ya aka? Kama ịgbachi nkịtị, i nwere ike ịgwa ya ihe na-enyere gị aka izi ozi ọma nke ọma.
2. Gịnị ka anyị nwere ike ime ka obi sie ndị anyị na ha so n’ozi ọma ike? Gịnịkwa mere o ji dị mkpa?
2 Mee Ka Obi Sie Ha Ike: Ụjọ na-atụ ụfọdụ ndị nkwusa ma ha chọọ izi mmadụ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ekpudo ihu n’ala ma ha na-ezi mmadụ ozi ọma ma ọ bụkwanụ olu ana-ama ha jijiji. Anyị nwere ike ime ka ụjọ ghara ịna-atụ ha ma anyị na-aja ha mma. Olee ihe ọzọ anyị nwere ike ime ka obi sie ndị anyị na ha so n’ozi ọma ike? Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-adị na-agwa ndị ya na ha so gaa ozi ọma na ọ na-abụ ụjọ jide ya, ya ekpe ekpere. Nwanna ọzọ kwuru ihe na-eme ka obi sie ya ike. Ọ sịrị: “Ihe mbụ m na-eme ma m bịa na nke mmadụ bụ ịmụmụ ọnụ ọchị. Ihe siwekwa ike, m na-ekpe ekpere ka Chineke mee ka m nwee ike izi onye ahụ ozi ọma.” O nwee ihe ọ bụla nyerela gị aka ka ụjọ ghara ịna-atụ gị izi ndị mmadụ ozi ọma, gwa ya onye gị na ya so n’ozi ọma ka obi sie ya ike.
3. Gịnị ka anyị nwere ike ịgwa onye anyị na ya so gaa ozi ọma nke ga-enyere ya aka ịna-ezi ozi ọma nke ọma?
3 Kụziere Ha Otú I Si Ezi Ozi Ọma: È nwere ihe ọ na-abụ iburu ụzọ gwa onye ị gara izi ozi ọma ya emee ka o gee ntị nke ọma? Ka è nweela ka i si hazigharịa aro a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị, ya emee ka ndị mmadụ na-ege gị ntị n’ozi ọma? Gwa ya onye gị na ya so n’ozi ọma. (Ilu 27:17) Mgbe unu na-aga nletaghachi, i nwere ike ịgwa onye gị na ya so ihe gị na onye unu na-aga na nke ya ga-ekwurịta na ihe ị ga-agwa onye ahụ. Unu mụchaara mmadụ ihe pụta, i nwere ike ịgwa onye gị na ya so ihe mere unu ji gụọ amaokwu Baịbụl ndị unu gụrụ nakwa ihe mere i ji gwa onye ahụ ihe ndị ị gwara ya.
4. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-enyere ndị anyị na ha so gaa ozi ọma aka?
4 Ọ bụghị naanị ndị Ndị Kraịst oge ochie gara izi ozi ọma ka ha gbara ume, ha gbakwara ụmụnna ha ume ma mee ka okwukwe ha sikwuo ike. (Ọrụ 11:23; 15:32) Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi kụziiri Timoti ihe ma gwa ya ka ọ kụziere ndị ọzọ ihe ndị ọ mụtara. (2 Tim. 2:2) Ọ bụrụ na anyị ejiri oge anyị na ụmụnna anyị nọ n’ozi ọma na-akụziri ha otú ha ga-esi na-ezi ozi ọma, anyị na-eme ihe dị Chineke mma. Ha ga na-ezikwa ozi ọma nke ọma, obi ana-adịkwa ha ụtọ.—Hib. 13:15, 16.