Nyere Onye Gị na Ya So n’Ozi Ọma Ezigbo Aka
1. Olee uru ọ bara ịdị abụọ abụọ aga ozi ọma?
1 E nwere oge Jizọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya dị mmadụ iri asaa ka ha gaa zie ozi ọma. O ‘zipụrụ ha abụọ abụọ.’ (Luk 10:1) O doro anya na abụọ abụọ ahụ ha dị mere ka ha nwee ike inyere ibe ha aka na ịgba ibe ha ume ka ha na-ekwusa ozi ọma. Mgbe anyị na onye nkwusa ọzọ na-aga ozi ọma, olee otú anyị nwere ike isi nyere ya aka?
2. Mgbe onye anyị na ya so n’ozi ọma na-ezi mmadụ ozi ọma, gịnị mere anyị ji kwesị ige ntị, oleekwa otú anyị ga-esi eme ya?
2 Na-ege Ntị: Na-ege ntị nke ọma mgbe onye gị na ya so n’ozi ọma na-ezi mmadụ ozi ọma. (Jems 1:19) Ọ bụrụ na o nwere ebe ọ na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ, sapeta ebe ahụ na Baịbụl nke gị. Na-ele onye na-ekwu okwu anya, ma ọ̀ bụ onye gị na ya so ma ọ̀ bụ onye nwe ụlọ. Ọ bụrụ na ị na-ege ntị nke ọma mgbe onye na-ekwu okwu na-ekwu, o nwere ike ime ka onye nwe ụlọ gewekwa ntị nke ọma.
3. Olee mgbe onye anyị na ya so n’ozi ọma ga-enwe mmasị ka anyị tinye ọnụ?
3 Mara Mgbe I Kwesịrị Itinye Ọnụ: Mgbe onye anyị na ya so n’ozi ọma na-ezi mmadụ ozi ọma, anyị ga-egosi na anyị na-akwanyere ya ùgwù ma ọ bụrụ na anyị ahapụ ya ka o kwuo ihe ọ chọrọ ikwu. (Rom 12:10) Anyị ekwesịghị ịnapụ ya okwu n’ọnụ. Ọ bụrụ na o chefuo ihe ọ chọrọ ikwu ma ọ bụkwanụ onye nwe ụlọ ajụọ ya ajụjụ siiri ya ike ịza, ya gwa anyị tinye ọnụ, anyị kwesịrị inyere ya aka mee ka onye nwe ụlọ ghọta ihe ọ na-ekwu kama ikwuwe ihe ọzọ dị iche. (Ilu 16:23; Ekli. 3:1, 7) Ihe anyị ga-ekwu n’oge ahụ kwesịrị ịbụ ihe ga-akwado ihe onye anyị na ya so n’ozi ọma kwurula.—1 Kọr. 14:8.
4. Gịnị ga-eme ka ozi anyị gaa nke ọma, anyị enweekwa ọṅụ?
4 Mgbe mmadụ iri asaa ahụ kwusachara ozi ọma, ha ‘ji ọṅụ lọta.’ (Luk 10:17) Ozi anyị ga-aga nke ọma, anyị enweekwa ọṅụ, ma ọ bụrụ na anyị na-ege ntị nke ọma, marakwa mgbe anyị kwesịrị itinye ọnụ ma onye anyị na ya so n’ozi ọma na-ekwu okwu.