Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Na-enyere Onye Gị na Ya So Gaa Ozi Ọma Aka
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Jizọs ma na ịdị abụọ aga ozi ọma bara uru. Ọ bụ ya mere na mgbe o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya dị mmadụ iri asaa ozi ọma, o zipụrụ ha abụọ abụọ. (Luk 10:1) Anyị gaa ozi ọma, anyị nwere ike inyere onye anyị na ya so aka ma ọ bụrụ na ọ maghị ihe ọ ga-aza onye jụrụ ya ajụjụ ma ọ bụ e nwee ihe ọzọ siiri ya ike. (Ekli. 4:9, 10) Anyị nwekwara ike ịkọrọ onye ahụ ihe ndị nyerela anyị aka ma ọ bụkwanụ tụọrọ ya aro ndị ga-enyere ya aka ịna-ezi ozi ọma nke ọma. (Ilu 27:17) Anyị nwekwara ike jaa ya mma ma ọ bụ gbaa ya ume ma o zichaa mmadụ ozi ọma.—Fil. 4:8.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Unu mechie ozi ọma, gwa onye gị na ya rụrụ ihe o mere ma ọ bụ ihe ọ gwara gị nke nyeere gị aka.