Otú E Si Akụziri Ndị Ọhụrụ Izi Ozi Ọma
1. Olee otú ọ dị gị n’oge mbụ i ziri mmadụ ozi ọma?
1 Ì chetara oge mbụ i ziri mmadụ ozi ọma n’ozi ụlọ n’ụlọ? O nwere ike ụjọ jidere gị. Ọ bụrụ na ọ bụ gị na onye na-amụrụ gị ihe ma ọ bụ onye nkwusa ọzọ so n’ụbọchị ahụ, o doro anya na obi dị gị ụtọ otú o si nyere gị aka. Ugbu a ị ghọrọla onye nkwusa ma nke a na-akọ, i nweziri ike inyere ndị ọhụrụ aka ịmụta otú e si ezi ozi ọma.
2. Gịnị ka ndị nkwusa ọhụrụ kwesịrị ịmụta?
2 Ndị nkwusa ọhụrụ kwesịrị ịmụta otú e si ebido izi mmadụ ozi ọma, ebe ha ga-agụrụ mmadụ na Baịbụl, otú e si aga nletaghachi, nakwa otú e si amalitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Ha kwesịkwara ịmụta ụzọ dị iche iche e si ezi ozi ọma, dị ka izi ozi ọma n’okporo ámá nakwa n’ebe a na-achụ nta ego. I nwere ike inyere ha aka ịmụta ihe ndị a ma gị na ha soro n’ozi ọma. I nwekwara ike ịtụrụ ha aro ndị ga-enyere ha aka.
3. Olee otú anyị nwere ike isi nyere mmadụ aka ịmụta otú e si ezi ozi ọma?
3 Gosi Ha Otú E Si Eme Ya: Jizọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma. (Luk 8:1; 1 Pita 2:21) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na onye nkwusa ọhụrụ soro gaa ozi ọma, kwadebe ụzọ dị mfe ị ga-esi ezi ozi ọma nke ga-adịrị ya mfe ịmụta. I nwere ike ịhọrọ otu n’ime aro ndị a tụrụ n’akwụkwọ anyị. Gwazie ya ka o lewe otú ị ga-esi ezi ozi ọma n’ebe mbụ ma ọ bụ n’ebe abụọ mbụ unu ga-aga. Tupu unu eruo n’ụlọ ọzọ yanwa ga-ezi ozi ọma, i nwere ike ịjụ ya ihe ọ chọpụtara n’otú i si zie ozi ọma. Nke a ga-enyere ya aka ịma uru ya na ndị ọzọ iso na-aga ozi ọma bara, ọ ga-emekwa ka ọ dịrị ya mfe ịnabata aro ọ bụla ị ga-atụrụ ya ma o zichaa ozi ọma nke ya.
4. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye nkwusa ọhụrụ aka mgbe anyị gechara ntị n’otú o si zie ozi ọma?
4 Tụọrọ Ya Aro: Jizọs nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ntụziaka otú ha ga-esi ezi ozi ọma. (Mat. 10:5-14) I nwekwara ike isi otú ahụ nyere onye nkwusa ọhụrụ aka. Gee ntị nke ọma mgbe ọ na-ezi mmadụ ozi ọma. Unu si ebe ahụ pụta, jaa ya mma n’ebe ndị o mere nke ọma a sịgodị na o nwere ebe ndị ị chọpụtara na o metaghị. Tupu ị gwawa ya ebe ndị ọ na-emetaghị, i nwere ike ichere ka o zie onye ọzọ ozi ọma ka ị mara ma ọ̀ ga-emekwu nke ọma. O nwere ike ịbụ ụjọ mere na o metaghị nke mbụ. Burukwa n’obi na mmadụ dị n’iche n’iche, otú otu onye si aghọta ihe na-adị iche n’otú ibe ya si aghọta. Ihe ọzọkwa bụ na e nwere ọtụtụ ụzọ dị mma e nwere ike isi zie ozi ọma.—1 Kọr. 12:4-7.
5. Gịnị ka anyị nwere ike ịgwa onye nkwusa ọhụrụ ma anyị chọọ ịtụrụ ya aro?
5 Mgbe ụfọdụ, onye nkwusa ọhụrụ nwere ike ịgwa gị ka ị tụọrọ ya aro otú ka mma ọ ga-esi zie ozi ọma. Ma ọ bụrụ na ọ gwaghị gị, gbalịa kwulite ya. Olee otú i nwere isi jiri akọ kwulite ya? Ihe ụfọdụ ndị bụ́ aka ochie n’izi ozi ọma na-eme bụ ịjụ onye ahụ sị, “Ị̀ ga-achọ ka m tụọrọ gị aro?” ma ọ bụkwanụ, “Olee otú i si hụ ozi ọma m ziri onye ahụ?” Ihe ọzọ ha na-eme bụ ịsị onye ahụ, “Mgbe m ghọrọ onye nkwusa ọhụrụ, ọ na-esiri m ike ime ihe dị otú a ma ọ bụ ihe dị otú a. Ma ihe nyeere m aka mgbe ahụ bụ ihe dị otú a ma ọ bụ ihe dị otú a.” Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị mma igosi ya aro ndị a tụrụ n’akwụkwọ anyị. Ka ụjọ ghara ijide onye nkwusa ahụ, chọta naanị otu ebe ị maara na o metachaghị nke ọma ma tụọrọ ya aro otú ọ ga-esi emezi ya.
6. A bịa n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma, olee otú ‘ígwè si amụcha ígwè’?
6 Ígwè Na-amụcha Ígwè: Pọl gbara Timoti, onye bụ́ aka ochie n’izi ozi ọma, ume ka ọ na-etinyesi mgbalị ike n’izi ihe, nakwa ka ọ na-eme ka ọganihu ya pụta ìhè. (1 Tim. 4:13, 15) Ọ bụrụgodị na ọ dịla anya ị ghọrọ onye nkwusa, ị ka kwesịkwara ịna-agba mbọ ka otú i si ezi ozi ọma ka mma. Na-amụta ihe n’aka onye nkwusa ọ bụla gị na ya na-arụ, ma ndị nke ka bidoro ikwusa ozi ọma ebido, na-achọpụtakwa ebe ndị ị ga-eji obiọma nyere ndị ọzọ aka, karịchaa ndị ọhụrụ, ka ha nwee ike mụta izi ozi ọma nke ọma.—Ilu 27:17.