Ò Nweela Onye I Duziiri Ọmụmụ Baịbụl n’Oge Mbụ Ị Gara na nke Ya?
O nwere ụfọdụ ndị ọ na-abụ anyị kwute na anyị ga-abịa ka anyị na ha mụwa Baịbụl, ha asị na ha enweghị mmasị ma ọ bụkwanụ na ha na-amụ Baịbụl na chọọchị ha. Ihe mere ha ji ekwu otú ahụ bụ na naanị ihe ha maara banyere ọmụmụ Baịbụl bụ ụdị nke ahụ a na-eme na chọọchị ha, ha amaghị na ịmụ Baịbụl na-atọ ụtọ nakwa na ọ na-eme ka mmadụ mụta ọtụtụ ihe. N’ihi ya, n’oge mbụ ị gara na nke mmadụ, kama ịgwa onye ahụ na ị ga-abịa ịmụrụ ya Baịbụl, ọ́ gaghị aka mma ma i jiri nkeji ole na ole gosi ya ozugbo otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl? Iji maa atụ: Agwala ha na ị ma nri esi nakwa na ị ga-ewetara ha nri i siri n’ụbọchị ọzọ ị ga-abịa; nye ha nri ahụ ozugbo! Legodị otú i nwere ike isi jiri nkeji ole na ole mee ya, dị ka a tụrụ aro ya na peeji nke 6 n’Ozi Alaeze Anyị nke Mach 2006:
“Ì chere na e nwere ụbọchị ihe a e dere ebe a ga-emezu? [Gụọ Aịzaya 33:24, ma chere ka ọ zaa.] Ka m gosi gị ihe e kwuru n’akwụkwọ a banyere ebe a anyị gụrụ.” Nye onye ahụ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma sị ya sapeta peeji nke 36, paragraf nke 22. Gụọ ajụjụ dị n’ala ala peeji ahụ maka paragraf ahụ, ma gwa onye ahụ ka ọ chọta azịza ya mgbe ị na-agụ paragraf ahụ. Ị gụchaa, jụọ ya ajụjụ ahụ ọzọ, ma gewe ihe ọ ga-aza. Gị na ya gụọ amaokwu Baịbụl ọzọ dị na paragraf ahụ. Jụọ otu ajụjụ ị ga-aza mgbe ọzọ ị ga-abịa, hụkwa na gị na ya kapịrị ụbọchị na oge ọ ga-achọ ka ị bịa ọnụ. Ị̀ makwa na ị malitela ọmụmụ Baịbụl?