Otú Anyị Ga-esi Malite Iduziri Ndị Anyị Nyefere Magazin Ọmụmụ Bible
1. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ anyị mgbe anyị na-enyefe magazin?
1 N’ụbọchị Saturday, anyị na-enyefekarị magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ozi. Ma, nke a bụ nanị nzọụkwụ mbụ anyị na-azọpụ iji ruo ihe mgbaru ọsọ anyị nke bụ́ ịkụziri ndị nwere obi eziokwu eziokwu ahụ. Lee aro ụfọdụ a tụrụ n’ebe a banyere otú a ga-esi nyefee akwụkwọ Bible Na-akụzi ná nletaghachi, bidokwa ọmụmụ Bible. E nwere ike ịgbanwetụ aro ndị a ka ha kwekọọ n’ókèala unu. Kwuo ha n’okwu nke aka gị. Ị pụrụ isi ụzọ ọzọ nyefee akwụkwọ a ma ọ bụrụ na ọ na-arụpụta ihe.
2. Olee otú anyị nwere ike isi jiri peeji ndị mbụ nke akwụkwọ Bible Na-akụzi malite ọmụmụ Bible?
2 Jiri Peeji Ndị Mbụ nke Akwụkwọ ahụ Kwuo Okwu: Mgbe ị gaghachiri, ị nwere ike ikwu, sị: “Magazin ndị ahụ m nyere gị na-atụ aka na Bible. Lee ihe mere ịgụ Bible ji dị oké mkpa.” Gụọ Aịsaịa 48:17, 18; Jọn 17:3; ma ọ bụkwanụ ebe ọzọ dabara adaba n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe i gosichara onye nwe ụlọ akwụkwọ Bible Na-akụzi ma nye ya otu ka o jide, i nwere ike ikwu, sị:
◼ “Bible na-eme ka anyị nwee ezi olileanya maka ọdịnihu.” Gosi onye nwe ụlọ peeji nke anọ na nke ise, jụọkwa ya, sị, “N’ime nkwa ndị a, olee nke ị ga-achọ ịhụ mgbe ọ ga-emezu?” Gị na ya gaa n’isiokwu ọ họọrọ nke tụlere nkwa dị n’Akwụkwọ Nsọ. Tụlee otu paragraf ma ọ bụ abụọ ná nkenke, ma ọ bụrụ na o kwere.
◼ Ma ọ bụ, i nwekwara ike ịsị, “Bible zara ajụjụ ndị kasị mkpa a na-ajụ ná ndụ.” Gosi ya peeji nke isii, ma jụọ ya ma ò nweela nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị dị ná mgbada peeji ahụ ọ jụtụrụla onwe ya. Sapeta isiokwu nke zara ajụjụ ahụ ma tụlee otu paragraf ma ọ bụ abụọ ná nkenke.
◼ Ma ọ bụ, i nwere ike igosi ya ụfọdụ n’ime isiokwu ndị dị n’akwụkwọ ahụ ma jụọ ya nke masịrị ya. Sapeta isiokwu ahụ ma gosi ya ná nkenke otú anyị si eduziri ndị mmadụ Bible.
3. Olee otú anyị nwere ike isi malite ọmụmụ Bible mgbe anyị nyefesịrị mmadụ magazin kwuru banyere (a) ọnọdụ ụwa nke na-akawanye njọ? (b) ezinụlọ? (ch) otú Bible si bụrụ akwụkwọ a pụrụ ịdabere na ya?
3 Jụọ Ajụjụ ná Nleta Mbụ: Ihe ọzọ anyị pụrụ ime bụ ime nkwadebe maka nletaghachi ná nleta mbụ anyị. Mgbe onye nwe ụlọ naara magazin, jụọ ya otu ajụjụ, kwekwa ya nkwa na ị ga-aza ya mgbe ị bịara ọzọ. Gbalịa mee ndokwa doro anya maka ịgaghachi. Hụkwa na ị gaghachiri dị ka i kwuru. (Mat. 5:37) Mgbe ị gaghachiri, chetara onye nwe ụlọ ajụjụ ahụ. Ná nkenke, gụọ ma tụlee ebe zara ajụjụ ahụ n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nye ya otu akwụkwọ ahụ ka o soro mgbe unu na-atụle ya. Lee ihe atụ ole na ole:
◼ Ọ bụrụ na magazin i nyefere kwuru banyere ọnọdụ ụwa nke na-akawanye njọ, i nwere ike ịsị, “Oge ọzọ, anyị ga-atụle otú Bible si zaa ajụjụ bụ́, Olee mgbanwe ndị Chineke ga-eme ka e nwee n’ụwa?” Jiri peeji nke anọ na nke ise kwuo okwu mgbe ị gaghachiri. Ma ọ bụ, i nwere ike ịjụ ajụjụ a, “Ọ̀ bụ uche Chineke ka a na-enwe ọdachi?” Mgbe ị gaghachiri, ị pụrụ igosi onye nwe ụlọ paragraf nke asaa na nke asatọ n’isi nke mbụ.
◼ Ọ bụrụ na magazin i nyefere kwuru banyere ezinụlọ, tupu gị alawa jụọ onye nwe ụlọ ajụjụ a, “Gịnị ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ nwere ike ime ka ezinụlọ nwekwuo obi ụtọ?” Mgbe ị gaghachiri, tụlee paragraf nke anọ n’isi nke iri na anọ.
◼ Ọ bụrụ na magazin i nyefere kwuru banyere otú Bible si bụrụ akwụkwọ a pụrụ ịtụkwasị obi, i nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ ajụjụ a maka oge ọzọ unu ga-ekwurịta okwu, “Ihe Bible kwuru banyere nkà mmụta sayensị ò ziri ezi?” Mgbe ị gaghachiri, tụlee paragraf nke asatọ n’isi nke abụọ.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ekweghị ịnara akwụkwọ Bible Na-akụzi?
4 Mgbe unu kwurịtasịrị, jụọ ya ajụjụ ọzọ ị ga-aza n’oge ọzọ. Ozugbo unu bidoro ịmụchi ihe anya, unu malite n’isi nke mbụ n’akwụkwọ ahụ mụwa ruo ná ngwụcha ya. Ọ̀ bụrụkwanụ na onye nwe ụlọ ekweghị ịnara akwụkwọ Bible Na-akụzi? Ị ka nwere ike ịdị na-ewegara ya magazin, gị na ya ana-enwekwa mkparịta ụka ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ka ị na-eme ka o nwekwuo mmasị, o nwere ike mesịa kwere ka e duziwere ya ọmụmụ Bible.
5. Gịnị mere anyị ga-eji gbalịa ka ihe anyị na-eme ghara ịbụ nanị inyefe ndị mmadụ magazin?
5 Magazin Ụlọ Nche na Teta! nwere ike ime ka mmadụ nwee mmasị ịmụ ihe Bible na-akụzi n’ezie. Ya mere, gbalịsie ike ịmalite iduziri ndị naara magazin ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na anyị mee otú ahụ, anyị na-erube isi ná ntụziaka Jizọs nyere anyị ka anyị ‘mee ndị na-eso ụzọ . . . na-ezi ha ihe.’—Mat. 28:19, 20.