Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/96 p. 3-5
  • Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Malitere Ndị Ị Na-ewegara Magazin Ọmụmụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2014
  • Nyefee Magazin n’Oge Ọ Bụla
    Ozi Alaeze Anyi—1995
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 3/96 p. 3-5

Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma

1 Mgbe i rutere n’ebe a na-ere akwụkwọ akụkọ, gịnị ka ị na-ahụ? Magazin. N’ebe onye na-ere akwụkwọ akụkọ nọ, gịnị na-adọrọ mmasị gị? Magazin. Ndị mmadụ, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, amalitewo ịgụ magazin. Ụwa nwere mmasị na magazin.

2 Ànyị pụrụ ime ka ndị nwere obi eziokwu nwee mmasị n’Ụlọ Nche na Teta!? Ee, ma ọ bụrụ na ANYỊ na-eburu Ụlọ Nche na Teta! n’uche. Gịnị pụrụ inyere anyị aka? Tụlee aro ndị a:

◼ Gụọ Magazin Ndị Ahụ: Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị kọrọ na, ná nkezi, nanị 1 n’ime ndị nkwusa 3 na-agụzu mbipụta ọ bụla nke Ụlọ Nche na Teta! Ị̀ na-agụzu ha? Ka ị na-agụ isiokwu nke ọ bụla, jụọ onwe gị, sị, ‘Ònye ga-enwe mmasị n’ihe ọmụma a—nne, ọchụ nta ego, onye ntorobịa?’ Ná magazin nke aka gị, kanye akara n’otu isiokwu ma ọ bụ abụọ ndị ị pụrụ iji mee ihe mgbe ị na-eche magazin ahụ n’ihu mmadụ. Mgbe ahụ chee echiche banyere ụzọ ị pụrụ isi jiri otu ahịrịokwu ma ọ bụ abụọ kpalie mmasị n’isiokwu ahụ.

◼ Nwee Ọda Magazin A Kara Aka: Tụọ ọda kwesịrị ekwesị maka ọnụ ọgụgụ a kara aka ná mbipụta nke ọ bụla site n’aka nwanna na-ahụ maka magazin. N’ụzọ a, gị na ezinụlọ gị ga-enwe ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke magazin mgbe nile. Ọda a kwesịrị ịgụnye magazin ndị nke Bekee tinyekwara magazin ndị dị n’asụsụ ndị ọzọ nke ndị nọ n’ókèala unu.

◼ Dokwaa Ụbọchị Magazin A Na-agbasochi Anya: Ọtụtụ ọgbakọ esetịpụwo otu ụbọchị n’ụzọ bụ isi maka ịgba àmà magazin. Ị̀ pụrụ ịkwado Ụbọchị Magazin nke ọgbakọ? Ma ọ́ bụghị ya, gbalịa iji oge ije ozi site n’oge ruo n’oge maka ịgba àmà magazin okporo ámá na nkesa nke magazin n’onwe gị, ma site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma n’ụzọ magazin.

◼ Na-eburu “Ụlọ Nche” na “Teta!” n’Uche: Chịrị ọtụtụ mkpụrụ magazin mgbe ị na-eme njem ma ọ bụ na-eje ahịa. Nyefee ha mgbe ị na-agwa ndị ọrụ ibe gị, ndị agbata obi, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ ndị nkụzi okwu. Otu di na nwunye na-ejikarị ụgbọ elu eme njem na-eji otu isi ihe dị n’otu n’ime magazin ndị kasị ọhụrụ na-esoro onye njem nọ n’akụkụ ha amalite mkparịta ụka. Ha enwewo ọtụtụ ahụmahụ dị ụtọ. Ụfọdụ ndị na-eto eto na-ejiri isiokwu ndị ha chere na ọ ga-amasị ndị nkụzi ha ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ha bịa n’ụlọ akwụkwọ. Chịrị ọtụtụ mgbe ị na-eme njem achụmnta ego, nyefeekwa ha ndị ahịa gị mgbe i mesịworo achụmnta ego gị. Ọtụtụ n’ime anyị na-azụrụ mmanụ ụgbọ ala mgbe mgbe; gịnị ma i nye onye ahụ na-ere mmanụ ụgbọ ala magazin ndị ahụ? Debe ha n’ebe aka ga-eru ha ngwa ngwa mgbe ndị ikwu gị bịara nleta, mgbe ị bara n’ụgbọ njem ọha na eze, ma ọ bụ mgbe ị na-echere mmadụ. Ị̀ pụrụ iche echiche banyere oge ndị ọzọ kwesịrị ekwesị?

◼ Kwadebe Ụzọ Iche Magazin n’Ihu Mmadụ nke Dị Mfe: Mee atụmatụ ikwu nanị ihe dị nta, ma kwuo ya nke ọma. Na-anụ ọkụ n’obi. Ruo n’obi. Gaa kpọmkwem n’isi ihe. Họrọ otu echiche sitere n’otu isiokwu, kwupụta ya n’okwu ole na ole, nyefeekwa magazin ndị ahụ. Ụzọ kasị mma isi chee ya n’ihu mmadụ bụ iwelite otu ajụjụ n’otu isiokwu na-akpali mmasị ma rụtụzie aka n’otu isiokwu nke na-enye azịza sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Tụlee ihe atụ ole na ole nke ụzọ a pụrụ isi mee nke a:

3 Ọ bụrụ na ị na-akọwapụta otu isiokwu banyere ọ̀tụ̀tụ̀ ịrị elu nke mpụ, ị pụrụ ịjụ, sị:

◼ “Gịnị dị mkpa iji mee ka o kwe anyị omume inwe ike ihi ụra n’abalị n’enweghị egwu nke mpụ?” Onye nwe ụlọ pụrụ inwe obi abụọ banyere ihe ịka mma. Ị pụrụ ịzaghachi na ọtụtụ ndị mmadụ na-eche otú ahụ ma gbakwụnye na i nwere ihe ọmụma ụfọdụ i kwenyere na ha ga-amasị ya. Mgbe ahụ zoo aka n’isi ihe kwesịrị ekwesị n’isiokwu ahụ.

4 Mgbe ị na-akọwapụta otu isiokwu ná ndụ ezinụlọ, ị pụrụ ịsị:

◼ “Ọtụtụ ndị na-achọpụta na ọ bụ ihe ịma aka n’ezie inweta ihe e ji ebi ndụ na ịzụlite ezinụlọ n’ụbọchị ndị a. E dewo ọtụtụ akwụkwọ n’isiokwu ahụ, ma ọbụna ndị ọkachamara ekwekọrịtaghị n’ihe ndị bụ ngwọta nye nsogbu anyị. Ọ̀ dị ebe ọ bụla anyị pụrụ ije iji nweta nduzi a pụrụ ịdabere na ya?” Mgbe ahụ gosi otu okwu kpọmkwem na magazin ahụ bụ́ nke na-egosi amamihe a na-achọta n’ime Bible.

5 Ị pụrụ iji ụzọ a mee ihe mgbe ị na-akọwapụta otu isiokwu banyere otu nsogbu ọha mmadụ:

◼ “Ọtụtụ ndị mmadụ nọ ná nrụgide taa. Ọ dịghị mgbe Chineke bu n’obi ka anyị si otú a na-adị ndụ.” Mgbe ahụ gosi otú ihe dị n’isiokwu ahụ bụ́ nke dabeere na Bible pụrụ isi nyere anyị aka ịnagide nsogbu ndụ ugbu a ma nye olileanya maka ngwọta na-adịgide adịgide n’ọdịnihu.

6 Ịgba Àmà Okporo Ámá Dị Irè: Ọ bụ ná mbipụta nke Informant (Ozi Alaeze Anyị) nke January 1940 ka a gbara ndị nkwusa ume na nke mbụ ya idokwa ụbọchị pụrụ iche kwa izu maka iji magazin na-agba àmà okporo ámá. Ị̀ na-agba àmà okporo ámá site n’oge ruo n’oge? Ọ bụrụ na ị na-eme ya, ụzọ i ji eme ihe ọ̀ dị irè n’ezie? A hụwo ụfọdụ ndị nkwusa ka ha na-eguzo n’akụkụ okporo ámá ọtụtụ ndị mmadụ na-agafe, na-akparịta ụka n’ahụghị ọtụtụ ndị mmadụ na-agafenụ. Kama ịchịrị magazin guzo n’akụkụ ibe ha, ọ dị irè karị ịnọpụ iche ma na-ezute ndị mmadụ. Ndị a na-amaghị ndị ha bụ pụrụ ịkwụsịtụ nke nta ma gee ntị ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị otu onye zutere ha, ma ọ bụ nanị ole na ole ga-ebute ụzọ n’izute ìgwè mmadụ mikpuru onwe ha ná mkparịta ụka. Ebe ọ bụ na anyị na-adọta mmasị dị ukwuu n’okporo ámá, e nwere mkpa pụrụ iche nke iji ejiji nke ọma na iyi ákwà n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ka o kwesịrị ndị ozi Chineke.—1 Tim. 2:9, 10.

7 Ụzọ Magazin: Ndị nwere ụzọ magazin na-etinye ọtụtụ magazin ọbụna n’agbanyeghị na a na-arụzu ókèala ndị ahụ ọrụ mgbe nile. Ụzọ magazin bụ ụzọ magburu onwe ya nke a pụrụ isi nweta ọmụmụ Bible ebe obibi.

8 Mgbe ị na-eme nletaghachi mgbe mgbe iji wega magazin ndị ahụ, ị ga-achọpụta na ikpo ọkụ na omume enyi nke dị n’agbata gị na onye ahụ nwe ụlọ ga-eto eto. Ka unu na-amatawanye onwe unu, otú a ka ọ ga-aka mfe ịkparịta ụka banyere isiokwu dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ. Nke a pụrụ iduje n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi na-arụpụta ihe. Ná nletaghachi ebe e nwere mmasị pụtara ìhè maka magazin ndị ahụ, nyefee ụtụ. Chetakwa, mgbe ọ bụla i zutere onye nwe ụlọ ị pụrụ inye akụkọ otu nletaghachi.

9 Otu nwanna nwanyị wegaara otu nwanyị magazin mgbe mgbe bụ́ onye na-anara ha mgbe nile ma sị: “Ekweghị m ihe ị na-agwa m.” Ná nleta ọzọ, nwanna nwanyị ahụ hụrụ di ya n’ụlọ. Mgbe e nwesịrị mkparịta ụka enyi na enyi, e mere ndokwa ịmalite ọmụmụ Bible. Nwanna nwanyị ahụ mere ụmụ ndị ikom atọ nke nwanyị ahụ enyi bụ́ ndị bịara sonye n’ọmụmụ ihe ahụ. N’ikpeazụ, nne ahụ na ụmụ ya ndị ikom raara ndụ ha nye Jehova ma bụrụ ndị e mere baptism. Ka ọ dị ugbu a, 35 ndị òtù nke ezinụlọ ahụ anakwerewo eziokwu. Ihe ndị a nile bụ n’ihi na nwanna nwanyị ahụ sochiri ụzọ magazin ya!

10 E nwere ọtụtụ ụzọ e si amalite ụzọ magazin. Ị pụrụ ịmalite ụzọ magazin nanị site n’inwe ihe ndekọ nke magazin ndị i tinyere na ime ndokwa iji mbipụta ndị kasị ọhụrụ laghachi kwa izu abụọ. Otu ụzọ bụ iji ihe ọmụma dị n’okpuru isiokwu bụ́ “N’ime Mbipụta Anyị Ọzọ” mee ihe. Mgbe ị laghachiri, gwa onye nwe ụlọ na i nwere isiokwu ahụ ị kpọtụrụ aha n’oge gara aga. Ma ọ bụ, mgbe ị na-eme nletaghachi, ị pụrụ ikwu, sị: “Mgbe m gụrụ isiokwu a, echere m na ọ pụrụ ịmasị gị . . .” Mgbe ahụ kwuo okwu ole na ole dị mkpirikpi n’isiokwu ahụ ma nyefee ya. Mgbe i mesịworo nleta ahụ, detuo isi ihe ise ndị dị mkpa n’ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ gị: (1) aha onye nwe ụlọ, (2) adres onye nwe ụlọ, (3) ụbọchị nleta, (4) mbipụta e tinyere, na (5) isiokwu e chere n’ihu. Ndị nkwusa ụfọdụ enwewo nnọọ ihe ịga nke ọma n’ịzụlite ụzọ magazin, na-edepụta ihe ruru 40 nleta ma ọ bụ karị ná ndepụta ha!

11 Ókèala Achụmnta Ego: Ndị nkwusa na-arụ ọrụ n’ókèala achụmnta ego na-etinye ọtụtụ magazin. Ị̀ nwalewo ọrụ ụlọ ahịa ruo ụlọ ahịa? Akụkọ na-egosi na n’ọgbakọ ụfọdụ, ikere òkè n’akụkụ a nke ije ozi dị nnọọ ala. Na mbụ, ụfọdụ na-atụ egwu ije na nke ndị na-achụ nta ego, ma mgbe ha nwalere ya ugbo ole na ole, ha na-achọpụta na ọ na-akpali mmasị ma na-akwụghachikwa ụgwọ. Gịnị ma ị rịọ onye nkwusa nwere ahụmahụ ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ ka o nyere gị aka ịmalite?

12 E nwere ọtụtụ uru dị n’ịrụ ọrụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa. A na-enwe mmadụ ole na ole ndị na-anọghị n’ụlọ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’oge azụmahịa! Ndị na-achụ nta ego na-akwanyekarịrị mmadụ ùgwù ọbụna ọ bụrụ na ha enweghị mmasị kpọmkwem na Bible. Malite n’oge; ma eleghị anya a ga-anabata gị nke ọma karị. Mgbe ị kọwasịrị onwe gị, ị pụrụ ikwu na ị dịghị ahụkebe ndị na-achụ nta ego n’ebe obibi, n’ihi ya na ị na-eleta ha nanị mkpirikpi oge n’ebe ọrụ ha iji nye ha mbipụta ndị kasị ọhụrụ nke Ụlọ Nche na Teta! Kọwaa na ọtụtụ ndị na-achụ nta ego nwere mmasị na magazin anyị n’ihi na ọ dị ha mkpa ịnọgide na-amata ihe na-eme n’ụwa ma ha nwere oge dị nta ịgụ ihe. Magazin ndị ahụ na-enye ihe ọmụma na-akpali iche echiche n’ụzọ dị ọhụrụ e si ele ihe anya, n’enweghị echiche hiere ụzọ nke okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ nke azụmahịa. A pụrụ ịzụlite ụzọ magazin n’ebe ndị nwere mmasị nọ bụ́ ndị a chọtara n’ókèala achụmnta ego.

13 Kwadebe Dị Ka Otu Ezinụlọ: A pụrụ iwepụta oge ụfọdụ n’oge ọmụmụ ihe ezinụlọ unu iji tụlee isiokwu ndị dị na magazin ndị kasị ọhụrụ ndị kwesịrị ekwesị iji mee ihe n’ókèala unu. Ndị òtù ezinụlọ—tinyere ụmụaka—pụrụ iji onwe ha mụgharịa okwu ha, na-emerikwa okwu mgbochi ndị a na-ewelitekarị, dị ka: “Eji m ọrụ n’aka,” “Anyị nwere okpukpe nke anyị,” ma ọ bụ “Enweghị m mmasị.” Ezi mmekọ ihe ọnụ pụrụ ime ka o kwe ezinụlọ ahụ dum omume ikerechi òkè anya ná nkesa magazin.

14 Ndị Nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Pụrụ Inye Aka: Mgbe ọ bụla o kwere mee, dokwaa nzukọ maka ije ozi n’Ụbọchị Magazin n’ebe ndị a na-enwe ọmụmụ akwụkwọ kama ọgbakọ dum izukọta n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị na-ahụ maka nzukọ maka ije ozi ubi kwesịrị ịkwadebe nke ọma, na-enwe aro dị iche iche maka ìgwè ahụ. Ndị a pụrụ ịgụnye otu ihe ngosi na otu isi ihe ma ọ bụ abụọ sitere ná mbipụta ndị ọhụrụ bụ́ ndị a pụrụ iji mee ihe ịkpali mmasị n’ógbè ahụ. Nzukọ maka ije ozi ubi—tinyere ịhazi ìgwè ahụ—kwesịrị ịdị nkenke, na-adịru ihe na-akarịghị site na minit 10 ruo 15. Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ijide n’aka na e nwere ókèala zuru ezu nke ga-eme ka ìgwè ahụ jide ọrụ n’aka n’oge nile ahụ a na-eje ozi ubi. Mgbe ahụ a pụrụ ikpe ekpere tupu ma ọ bụ mgbe e kenyesịrị ndị nkwusa isoro ibe ha rụọ ọrụ.

15 Gosi Ekele Maka Magazin Ndị Ahụ: Isiokwu bụ́ “Iji Ụlọ Nche na Teta! Eme Ihe nke Ọma” nke e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke July 1993 kwuru isi ihe a dị mkpa: “Ụlọ Nche na Teta! adịghị atụfu uru ha, ọbụna ma ọ bụrụ na e tinyeghị ha dum n’ime otu ọnwa ma ọ bụ abụọ mgbe ụbọchị mbipụta ha gasịrị. Ihe ọmụma dị na ha adịghị ebelata n’ịdị mkpa ka oge na-aga . . . Ikwere ka magazin ndị meworo ochie karị na-akwakọba ma ghara iji ha mee ihe mgbe ọ bụla na-egosi enweghị ekele maka ngwá ọrụ ndị a bara uru. . . . Kama ịdị na-ewezụga mbipụta ndị meworo ochie karị n’ụsọ ma chezọọ ha, ọ́ gaghị aka mma itinye mgbalị pụrụ iche iji tinye ha n’aka ndị nwere mmasị?”

16 Taa e nwere ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu ndị na-achọ eziokwu ahụ. Ihe ọmụma dị n’ime otu magazin pụrụ ịbụ nnọọ ihe dị ha mkpa iji bụrụ ndị e dujere n’eziokwu ahụ! Jehova enyewo anyị ozi na-akpali akpali ịkpọsa, magazin anyị na-ekerekwa òkè dị mkpa n’iwegara ndị ọzọ ozi ahụ. Ị̀ ga-eburukwu n’uche ikesa magazin n’ọdịnihu? Ị̀ ga-etinye ụfọdụ n’ime aro ndị a n’ọrụ ná ngwụsị izu nke a? Ị ga-enweta ngọzi n’ụba ma ọ bụrụ na i mee otú ahụ.

Aro Ndị Dị Irè:

◼ Buru ụzọ gụọ magazin ndị ahụ, marakwa isiokwu ha nke ọma.

◼ Họpụta otu isiokwu nke na-ekwu banyere ihe bụ mmasị ọha mmadụ n’ógbè gị.

◼ Kwadebe okwu ga-ekwesị ekwesị maka ụdị mmadụ dị iche iche, dị ka ndị ikom, ndị inyom, ma ọ bụ ndị ntorobịa. Gosi otú magazin ahụ si emetụta onye nwe ụlọ na otú ezinụlọ ahụ dum ga-esi mara ụtọ ya.

◼ Mee atụmatụ ije ozi ubi gị mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ n’ụlọ. Ọgbakọ ụfọdụ na-edokwa iji magazin mee nkwusa uhuruchi.

◼ Mee ka okwu gị dị nkenke, gaakwa n’isi ihe.

◼ Ejila oké ọsọ ọsọ ekwu okwu. Ọ bụrụ na onye na-ege gị ntị enweghị mmasị, ikwu okwu ọsọ ọsọ karị agaghị enye aka. Gbalịa iwetu obi ala, nyekwa onye nwe ụlọ ohere ịzaghachi.

◼ Jiri magazin ndị dị n’asụsụ ndị ọzọ maka ndị ha pụrụ ịdị mkpa.

Inyefe Magazin Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ:

◼ Nwee mmụmụ ọnụ ọchị enyi na olu okwu dị nro.

◼ Na-anụ ọkụ n’obi banyere magazin ndị ahụ.

◼ Kwuo okwu nwayọọ nwayọọ na n’ụzọ na-edo anya.

◼ Kwuo okwu nanị n’otu isiokwu; kpalie mmasị n’ụzọ dị nkenke, gosikwa onye nwe ụlọ abamuru ya.

◼ Kọwapụta nanị otu isiokwu.

◼ Chee nanị otu magazin n’ihu, na-enyefe nke ọzọ dị ka nke ya na ya na-agakọ.

◼ Nye onye nwe ụlọ magazin ndị ahụ n’aka.

◼ Mee ka onye nwe ụlọ mara na ị na-eme atụmatụ ịlọghachi.

◼ Mechie n’ụzọ enyi na enyi na n’ụzọ dị mma ma ọ bụrụ na a jụrụ ịnara magazin ndị ahụ.

◼ Detuo mmasị nile na akwụkwọ ndị e tinyere n’ihe ndekọ ụlọ n’ụlọ.

Ohere Ndị E Nwere Itinye Magazin:

◼ Ịgba àmà ụlọ n’ụlọ

◼ Ịgba àmà okporo ámá

◼ Ọrụ ụlọ ahịa ruo ụlọ ahịa

◼ Ụzọ magazin

◼ Ịgba àmà uhuruchi

◼ Mgbe a na-eme nletaghachi

◼ Ịkpọtụrụ ndị a na-amụburu Bible

◼ Mgbe a na-eme njem, na-azụ ahịa

◼ Mgbe a na-agwa ndị ikwu, ndị ọrụ ibe mmadụ, ndị agbata obi, ụmụ akwụkwọ ibe mmadụ, ndị nkụzi okwu

◼ N’ụgbọ njem ọha na eze, n’ọnụ ụlọ nchere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya