Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
1, 2. Olee otú Ụlọ Nche na Teta! siworo metụta ndụ ndị mmadụ?
1 “Ọ dị ụtọ, na-abịa n’ezi oge, na-enyekwa agbamume.” “Ọ bụ akwụkwọ kasị enye agbamume m gụtụrụla.” Okwu ndị a na-akọwa nnọọ otú ndị na-agụ Ụlọ Nche na Teta! gburugburu ụwa si were ha. N’ezie, magazin anyị abụrụwo nnọọ ngwá ọrụ bara oké uru n’ịhụ na “ụdị mmadụ nile” na-anụ ozi ọma ahụ.—1 Tim. 2:4.
2 Otu nwoke ji ego achụ nta ego natara otu magazin Teta! nke nwere isiokwu masịrị ya. Ka e mesịrị, ọ gụrụ Ụlọ Nche nke ya na magazin Teta! ahụ so, bụ́ nke nwere isiokwu kpaliri ya inyocha Atọ n’Ime Otu o kwere na ya kemgbe ụwa. Nke a kpaliri mmasị ya. Ọnwa isii ka e mesịrị, e mere ya baptizim. Otu nwoke ọzọ na-anata magazin anyị mgbe nile ma ọ dịghị agụ ha. N’aka nke ọzọ, nwunye ya na-agbara Ndịàmà ọsọ, ma ọ na-agụ magazin ndị ahụ di ya na-anata. Nkwa e kwere na Bible banyere paradaịs elu ala nke ndị ezi omume ga-ejupụta na ya metụrụ ya n’obi. Ka oge na-aga, nwanyị ahụ, nwa ya nwoke, na nwanne ya nwanyị ghọrọ ndị ohu Jehova.
3. Gịnị bụ uru dị n’inyefekọta magazin anyị ọnụ?
3 Na-enyefekọta Ha Ọnụ: Dị ka ihe atụ ndị ahụ e kwuru n’elu na-egosi, anyị apụghị ịma ndị ga-agụ magazin anyị ma ọ bụ ihe pụrụ ịkpali mmasị ha. (Ekli. 11:6) N’ihi ya, ọ bara uru inyefekọta Ụlọ Nche na Teta!, n’agbanyeghị na ọ bụ nanị otu ka anyị ga-ekwu okwu na ya mgbe anyị na-enyefe ha. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mma inyefekọta magazin dịgasị iche n’otu mgbe.
4. Olee otú anyị pụrụ isi mee ndokwa maka ikesa magazin?
4 Ọ dị mma ka anyị na-ewepụta otu ụbọchị n’izu iji sonye n’ọrụ ikesa magazin. Na 2005 Calendar of Jehovah’s Witnesses, e wepụtara Saturday ọ bụla dị ka “Ụbọchị Magazin.” Ma, ebe ọ bụ na ọnọdụ mmadụ nile na nke ókèala nile abụghị otu, ụfọdụ pụrụ iwepụta ụbọchị ọzọ maka ikesa magazin anyị. Nke a ò so n’ihe ndị ị na-eme n’izu?
5. Olee ohere ndị anyị kwesịrị iji nyefee magazin, gịnịkwa pụrụ inyere anyị aka ime otú ahụ?
5 Setịpụrụ Onwe Gị Ihe Mgbaru Ọsọ: Isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke magazin ole anyị ga-achọ inyefe n’ọnwa pụrụ inyere anyị aka ịdịkwu uchu n’inyefe magazin anyị. Ì nwere onye ị na-ewegara magazin kwa ọnwa? Ị̀ na-enye ndị ị na-ezute n’ozi magazin? Ị̀ na-enyefe magazin mgbe ị na-agba àmà n’okporo ámá, n’ógbè azụmahịa, nakwa n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị? Ị̀ na-eji magazin n’akpa mgbe ị na-eme njem, mgbe ị na-aga ahịa, na mgbe ị na-aga izute onye gị na ya yiri agba? Jiri ohere ọ bụla kwesịrị ekwesị i nwere nyere ndị ọzọ aka irite uru n’Ụlọ Nche na Teta!
6. Olee otú anyị pụrụ isi jiri magazin ochie mee ihe nke ọma?
6 Anyị pụkwara isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke inyefe magazin ochie ndị anyị nwere. Ọ bụrụgodị na e nyefeghị ha n’ime otu ọnwa ma ọ bụ abụọ e bipụtara ha, ihe ndị e dere n’ime ha ka bakwara uru. Were ha nye ndị nwere mmasị ịgụ ha. Nye ọtụtụ nde mmadụ, magazin Ụlọ Nche na Teta! bụ “okwu e kwuru na mgbe kwesịrị ya.” (Ilu 25:11) Ka anyị jiri ha nyekwuoro ọtụtụ nde mmadụ aka ịbịa mara Jehova ma jeere ya ozi.