Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ
1 Dị ka Ndịàmà Jehova, e ji nkwusa ịnụ ọkụ n’obi anyị maka Alaeze Chineke mara anyị nke ọma. Magazin Ụlọ Nche na Teta! anyị na-ekesa na-ekere òkè dị ike n’inyere ọtụtụ nde mmadụ aka ịmụta banyere nzube Chineke. Ozi ha bu bụ n’ezie ozi ọma, n’ihi na ọ na-ekwupụta Alaeze eluigwe Chineke dị ka olileanya nanị ya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ.
2 Magazin ndị a na-akọ banyere ihe ndị bụ mkpa ụmụ mmadụ n’ezie—nke mmetụta uche, nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya, na nke ime mmụọ. Ka omume na ụkpụrụ ezinụlọ na-adakpọ gburugburu anyị, Ụlọ Nche na Teta! na-enyere ndị mmadụ aka iwelite ọdịdị nke ndụ ha site n’igosi ha ụzọ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Ọ ga-abụrụ anyị ihe obi ụtọ inyefe ụtụ maka magazin ndị a n’ọnwa April na May.
3 Ha Na-adọrọ Adọrọ n’Ezie: Ụlọ Nche na Teta! dị n’asụsụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke ndị mmadụ dum n’ụwa. N’ihi nke a, a maara magazin anyị nke ọma. Ndị a bụ ihe ụfọdụ mere ha ji adọrọ ndị mmadụ:
◼ Dị ka akwụkwọ na-adịghị ezo ọnụ na ndị na-ekwu eziokwu, ha na-egosi n’ụzọ doro anya ọdịiche dị n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ.
◼ Ha na-enye olileanya nke paradaịs ezi omume gaje ịbịa, nke dabeere ná nkwa Chineke iweta ụwa n’okpuru ịchịisi Alaeze ya.
◼ Ha na-ebu ọtụtụ ụdị isiokwu ndị kwesịrị oge, na-adọrọ mmasị ndị nwere ụdị nzụlite na ọdịbendị nile.
◼ Isiokwu ha na-adị nkenke, na-akụzi ihe, na-ezi ezi, gharakwa inwe ịkpọasị na ikwenyere ihe na-ezighị ezi.
◼ Ihe osise ndị na-adọrọ anya na-akpali mmasị ozugbo, ụzọ ihe odide doro anya na-emekwa ka magazin ndị ahụ dị mfe ọgụgụ.
4 Kesaa Ha n’Ụzọ Sara Mbara: Nkesa magazin n’ụzọ dị irè dabeere karịsịa n’ịdị nkọ anyị n’ịkwadebe ụzọ anyị si eche ihe n’ihu mmadụ, ịhazi oge anyị, na ịhazi ọrụ nkwusa anyị. A tụrụ aro ndị dị irè ná mbipụta September 1995 na October 1996 nke Ozi Alaeze Anyị, bụ́ ndị ga-adị mma ịtụleghachi na itinye n’ọrụ.
5 Mata Magazin Ndị ahụ Nke Ọma: Ka ị na-agụ mbipụta nke ọ bụla, chee banyere onye ọ ga-amasị inweta otu. Chọọ isi ihe ụfọdụ kpọmkwem ma ọ bụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ị pụrụ ihota n’ụzọ i si eche ihe n’ihu mmadụ. Chee banyere otu ajụjụ ị pụrụ ịjụ iji malite mkparịta ụka ma kpalie mmasị n’isiokwu ahụ.
6 Mee Ka Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ Kwesị Onye Ahụ: Kwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị mfe, a pụrụ ịgbanwe agbanwe bụ́ nke ị pụrụ ịgbanwe maka nwoke, nwanyị, agadi, ma ọ bụ ntorobịa, ma ọ̀ bụ onye ị maara ma ọ bụ onye ị na-amaghị.
7 Na-eburu Ụlọ Nche na Teta! n’Uche: Ebe ọ bụ na magazin ndị ahụ na-aba nke ọma n’akpa dị iche iche, ma ọ bụ akpa uwe, anyị pụrụ ịchịrị ụfọdụ mgbe anyị na-eme njem ma ọ bụ na-eje ahịa. Nyefee ha mgbe ị na-agwa ndị ikwu, ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe gị, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ma ọ bụ ndị nkụzi okwu. Setịpụ otu ụbọchị kwa izu maka ịgba àmà magazin.
8 Gosi Obi Ekele Maka Magazin Ndị Ahụ: Ọ dịghị mgbe ha na-adịghịzi aba uru. Ngafe nke oge adịghị ebelata ịdị mkpa nke ozi ha bu. N’ezie, ọ bụrụ na anyị etinye mgbalị pụrụ iche itinye magazin nile anyị na-enweta, ọ bụghị iwu na mbipụta ndị ochie ga-akwakọju na shelf anyị.
9 Ịgba Àmà Okporo Ámá Dị Irè: Nke a bụ otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi nyefee ìgwè mmadụ buru ibu magazin. Ụfọdụ ndị nkwusa na-arụ ọrụ n’okporo ámá na-ekwo ekwo n’oge ndị a kara aka n’ụbọchị ahịa.
10 Ókèala Achụmnta Ego Na-amị Mkpụrụ: Mgbe a na-agba àmà site n’ụlọ ahịa ruo ụlọ ahịa, anyị na-enwe mmadụ ole na ole na-anọghị n’ụlọ. Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị achụmnta ego na-adị ọgọ, ọtụtụ na-enwekwa mmasị ịnara magazin. Gosi isiokwu ndị kwesịrị ekwesị maka ụdị achụmnta ego a na-eme.
11 Ụzọ Magazin Pụrụ Ịrụpụtakwu Ihe: Ebe ọ bụ na a na-ebi magazin ndị a ugboro abụọ n’ọnwa, o kwesịrị nnọọ ekwesị ịgaghachi na nke ndị gụrụ ha ma chee mbipụta ndị na-esonụ n’ihu ha. Anyị kwesịrị imechi nletaghachi anya, ọ bụghị nanị ịga tinye magazin kamakwa iji wulite mmasị onye ahụ na Bible. Ụzọ magazin bụ isi iyi magburu onwe ha maka ọmụmụ Bible ndị a pụrụ inwe.
12 Jiri April na May Mee Ihe Nke Ọma: Ụlọ Nche na Teta! emewo ka ọtụtụ nde ndị ji obi ekele na-agụ ha nwee ntụkwasị obi na ha. Ha dị nnọọ irè n’ikwupụta Alaeze ahụ nke na anyị kwesịrị ịkpọ ya mkpa ịchịrị ha na inyefe ụtụ n’ohere ọ bụla. Ka April na May bụrụ ọnwa ndị pụrụ iche maka inyefe ụtụ maka magazin ndị a!