Ụlọ Nche na Teta!—Akwụkwọ Eziokwu Ndị Na-abịa n’Oge Ha
“Ị gbapụtawo m, Jehova, Chineke nke eziokwu.”—ABỤ ỌMA 31:5.
1, 2. (a) Olee mmetụta otu nwanna nwanyị nwere banyere otu ihe ọ gụtara n’Ụlọ Nche? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-ajụ banyere magazin anyị abụọ?
“EKELEE mụ unu nke ukwuu,” ka otu nwanna nwanyị n’ime Kraịst dere, “maka ihe ọmụma magburu onwe ya dị n’isiokwu Ụlọ Nche bụ́ ‘Ị Pụrụ Inweta Nkasi Obi n’Oge Nchegbu.’a Ọtụtụ n’ime isi ihe ndị unu wepụtara bụ kpọmkwem mmetụta ndị m cheworo ihu; ọ bụ nnọọ dị ka a ga-asị na e detaara m isiokwu a kpọmkwem. Oge mbụ m gụrụ ya, anya mmiri juru m n’anya. Ọ bụ ihe magburu onwe ya ịmata na onye ọzọ maara mmetụta m! Enwere m ekele dị ukwuu maka ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Olee ebe ọzọ anyị pụrụ inweta nkwa dị iche iche nke ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’ọdịnihu dị nso na, ugbu a, ihe nkasi obi maka mkpụrụ obi anyị! Ndewonụ. Unu emeela nnọọ ebe ọ dị ukwuu.”
2 Ọ̀ dịwo mgbe i nwere mmetụta dị otú ahụ? Ọ̀ dịtụwo mgbe o yiri gị ka otu ihe dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ magazin ya na ya na-agakọ, bụ́ Teta!, ọ̀ bụ nke e dere kpọmkwem maka gị? Gịnị banyere magazin abụọ anyị na-adọrọ obi ndị mmadụ? Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị ọzọ aka irite uru site n’ozi na-azọpụta ndụ ha bu?—1 Timoti 4:16.
Magazin Ndị Na-akpọsa Eziokwu
3. N’ihi ezi ihe dị aṅaa ka magazin Ụlọ Nche na Teta! jiworo metụ obi ọtụtụ ndị na-agụ ha?
3 Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Okwu ya, bụ́ Bible, bụ akwụkwọ nke eziokwu. (Jọn 17:17) Ndị obi ha ziri ezi na-anakwere eziokwu. (Tụlee Jọn 4:23, 24.) Otu ihe mere Ụlọ Nche na Teta! jiworo metụta obi ọtụtụ nde ndị na-agụ ha bụ na ha bụ akwụkwọ nke ihe ndị ziri ezi na eziokwu. N’ezie, ọ bụ n’ihi ihe iseokwu nke ịnọgidesi ike n’eziokwu nke Bible ka e ji malite ibipụta Ụlọ Nche.
4, 5. (a) Gịnị bụ ọnọdụ ndị dubara na C. T. Russell ibipụta Ụlọ Nche? (b) Olee otú “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” si eji magazin Ụlọ Nche eme ihe?
4 Na 1876, Charles T. Russell sooro Nelson H. Barbour, nke Rochester, New York jikọọ aka. Russell wetara ego iji maliteghachi mbipụta nke akwụkwọ okpukpe Barbour a na-ebipụta mgbe mgbe bụ́ Herald of the Morning, na-enwe Barbour dị ka editọ bụ́ isi na Russell dị ka osote editọ. Otú ọ dị, ihe dị ka otu afọ na ọkara n’ihu, ná mbipụta August 1878 nke Herald, Barbour dere otu isiokwu nke gọnahụrụ uru mgbapụta nke ọnwụ Kraịst. Russell, onye ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 30 afọ bụrụ nwata karịa Barbour, zaghachiri site n’otu isiokwu ná mbipụta sochirinụ bụ́ nke buliri ihe mgbapụta ahụ elu, nke o lere anya dị ka “otu n’ime nkụzi ndị kasị mkpa nke Okwu Chineke.” (Matiu 20:28) Mgbe ọtụtụ mgbalị iji soro Barbour tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ gasịrị, Russell mesịrị kpebie ịdọbi ihe nile jikọrọ ya na Herald ahụ. Na-amalite ná mbipụta nke June 1879 nke akwụkwọ ahụ, aha Russell apụtakwaghị ọzọ dị ka osote editọ. Otu ọnwa n’ihu, Russell dị 27 afọ malitere ibipụta Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence (nke a maara ugbu a dị ka Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova), nke site ná mmalite, buliworo eziokwu Akwụkwọ Nsọ, dị ka ihe mgbapụta ahụ, elu.
5 N’ime 114 afọ gara aga, Ụlọ Nche, dị ka ọkà iwu maara ọrụ, eguzobewo onwe ya dị ka onye na-ekpechitere eziokwu na ozizi Bible ọnụ ya. Ka ọ na-eme nke ahụ, o nwetawo ntụkwasị obi nke ọtụtụ nde ndị ji obi ekele na-agụ ya. Ọ ka na-akwadosikwa ihe mgbapụta ahụ ike. (Lee, dị ka ihe atụ, mbipụta nke February 15, 1991.) Ọ nọgidekwara na-abụ ihe ọrụ bụ isi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na Òtù Na-achị Isi ya ji akpọsa Alaeze Jehova e guzobeworo ma na-ekesa nri ime mmụọ “n’oge ya.”—Matiu 24:14, 45.
6, 7. Gịnị bụ ebumnobi e depụtara edepụta nke The Golden Age, gịnị na-egosikwa na ndị na-eche echiche nabatara ozi ya?
6 Gịnị banyere magazin bụ́ Teta!? Site ná mmalite ya, Teta! kwa akpọsawo eziokwu. N’ịbụ nke a kpọrọ The Golden Age ná mbụ, a haziri magazin a maka ikesara ya ọha mmadụ. Banyere ebumnobi ya, mbipụta nke mbụ, nke akara ụbọchị ya bụ October 1, 1919, kwuru, sị: “Nzube ya bụ ịkọwa n’ìhè nke amamihe Chineke ihe oké ihe na-eme n’ụbọchị anyị pụtara n’ezie na ịnwapụtara uche ndị na-eche echiche site n’ihe àmà a na-apụghị ịgbagha agbagha na nke na-eme ka e kwere n’ihe na oge maka ngọzi ka ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ dị nso ugbu a.” Ndị na-eche echiche nabatara ozi nke The Golden Age. Ruo ọtụtụ afọ, ọbụna na nkesa ya karịrị nke Ụlọ Nche.b
7 Otú ọ dị, ihe na-adọrọ mmasị nke Ụlọ Nche na Teta! nwere gabigara eziokwu ahụ bụ na ha na-ebipụta eziokwu nke ozizi ma na-akọwa ihe ọnọdụ ụwa pụtara n’amụma. Karịsịa n’ime iri afọ ma ọ bụ iri afọ abụọ gara aga, magazin abụọ anyị enwetawo obi ndị mmadụ n’ihi ihe ọzọ kwa.
Isiokwu Ndị Bịara n’Oge Ha Bụ́ Ndị Metụtara Ndụ Ndị Mmadụ
8. Mgbanwe ihe dị aṅaa n’ide akwụkwọ ka Jud mere, na-agba ndị gụru ya ume iguzogide mmetụta ndị dị aṅaa n’ime ọgbakọ?
8 Ihe dị ka 30 afọ mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs Kraịst gasịrị, Jud so dee Bible chere ọnọdụ na-ama aka ihu. Ndị ikom rụrụ arụ, dị ka anụ ọhịa, egbebatawo n’etiti ndị Kraịst. Jud bubu n’uche idegara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ banyere otu isiokwu nke ozizi—nzọpụta nke ndị Kraịst e tere mmanụ nwekọrọ ọnụ. Kama nke ahụ, n’ịbụ onye mmụọ nsọ duziri, ọ hụrụ na ọ dị mkpa ịgba ndị gụrụ akwụkwọ ya ume iguzogide mmetụta ndị na-emerụ emerụ n’ime ọgbakọ. (Jud 3, 4, 19-23) Jud hazigharịrị ihe n’ikwekọ n’ọnọdụ dịnụ ma nye ndụmọdụ kwesịrị oge ahụ bụ́ nke gboro mkpa ụmụnna ya n’ime Kraịst.
9. Gịnị ka ịkwadebe isiokwu ndị bịara n’oge ha maka magazin anyị abụọ gụnyere?
9 N’otu aka ahụ, ịkwadebe isiokwu ndị kwesịrị oge ha maka magazin abụọ anyị bụ ibu ọrụ na-ama aka. Oge na-agbanwe agbanwe, otú ahụ kwa ka ndị mmadụ na-agbanwe—mkpa ha na ihe ndị na-amasị ha abụghị otu ihe ha bụ ọbụna n’otu iri afọ ma ọ bụ abụọ gara aga. Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị chọpụtara n’isi nso: “Mgbe m ghọrọ Onyeàmà laa azụ n’afọ ndị 1950, ụzọ anyị si eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible bụkarịrị nke metụtara ozizi—na-akụziri ha ihe bụ eziokwu banyere Atọ n’Ime Otu, ọkụ mmụọ, mkpụrụ obi, na ihe ndị ọzọ. Ma ugbu a, o yiri ka e nwere ọtụtụ nsogbu na ihe isi ike ná ndụ ndị mmadụ nke na ọ dị mkpa ka anyị kụziere ha ụzọ isi bie ndụ.” N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ?
10. N’ihi gịnị ka ọ na-ekwesịghị iji ju anyị anya na e nwewo nretọ nọgidere na-aga n’ihu n’ihe omume ụmụ mmadụ eri 1914?
10 Banyere “mgbe ikpeazụ,” Bible buru amụma, sị: “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.” (2 Timoti 3:1, 13) Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na a nọwo na-enwe nretọ n’ihe omume ụmụ mmadụ eri mgbe ọgwụgwụ ahụ malitere na 1914. Setan, onye oge fọdụụrụ ya dị mkpụmkpụ karịa mgbe ọ bụla ọzọ, na-awụkwasị ọha ụmụ mmadụ iwe ya n’ụzọ ọ na-emetụbeghị na mbụ. (Mkpughe 12:9, 12) Dị ka ihe si na ya pụta, omume na ụkpụrụ ezinụlọ adịtụkwaghị ka ha dị nanị n’ime 30 ma ọ bụ 40 afọ gara aga. Ndị mmadụ n’ozuzu ha enwekwaghị mmasị n’okpukpe dị ka ha nwere n’iri afọ ndị gara aga. Mpụ jupụtara ebe nile nke na ndị mmadụ na-eme ihe ndị a na-anụtụghị ná ntị nanị n’ime 20 ma ọ bụ 30 afọ gara aga iji chebe onwe ha.—Matiu 24:12.
11. (a) Isiokwu ndị dị aṅaa dị n’uche ndị mmadụ, oleekwa ụzọ òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche siworo zaghachi ná mkpa ndị ahụ? (b) Nye ihe atụ nke otu isiokwu Ụlọ Nche na Teta! metụtaworo ndụ gị.
11 Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na ihe ndị metụtara mmetụta uche, ọha na eze, na ezinụlọ dị n’uche ọtụtụ mmadụ. Òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nweekwa uche ejiwo obi ike zaghachi n’ime Ụlọ Nche na Teta! site n’ibipụta isiokwu ndị kwesịrị oge ha bụ́ ndị hụworo maka mkpa ndị bụ ezie nke ụmụ mmadụ na ndị metụworo ndụ ha n’eziokwu. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
12. (a) N’ihi gịnị ka e ji kwadebe isiokwu dị iche iche banyere ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna maka Ụlọ Nche na 1980? (b) Olee otú otu nwanna nwanyị si kwupụta obi ekele ya maka isiokwu ndị ahụ banyere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna?
12 Ihe ndị metụtara ezinụlọ. Mgbe akụkọ ndị sitere gburugburu ụwa gosiri ịrị elu dị ngwa n’ọnụ ọgụgụ nke ezinụlọ ebe e nwere nanị nne ma ọ bụ nna, a kwadebere usoro isiokwu ndị gbara ọhụrụ n’okpuru isiokwu bụ́ “Ịnagide Ihe Isi Ike Nile nke Ezinụlọ Ndị E Nwere Nanị Nne ma ọ bụ Nanị Nna” maka mbipụta Ụlọ Nche nke March 15, 1981. Isiokwu ndị ahụ nwere nzube abụọ e jikọrọ ọnụ: (1) inyere ndị nne ma ọ bụ nna ọ bụ nanị ha na-azụ nwa aka ịnagide nsogbu pụrụ iche ha na-eche ihu na (2) inyere ndị ọzọ aka inwe ihe ọmụma ka mma ka ha wee nwee ike ‘iji obi soro ha hụkọọ ahụhụ’ na ‘ileta’ ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna. (1 Pita 3:8; Jemes 1:27) Ọtụtụ ndị gụrụ ya detara akwụkwọ iji gosipụta ekele maka isiokwu ndị ahụ. “O mere n’ezie ka anya mmiri gbaa m mgbe m hụrụ peji ihu ya,” ka otu nne ọ bụ nanị ya na-azụ nwa dere, “mgbe m sapekwara magazin ahụ ma gụọ ihe ọmụma ahụ, obi m jupụtara n’ekele nye Jehova maka iwepụta ihe ọmụma dị otú a n’oge a chọrọ ya.”
13. Olee ntụle miri emi nke ịda mbà n’obi nke e bipụtara na Teta! na 1981, gịnịkwa ka otu onye gụrụ ya nwere ikwu banyere ya?
13 Ihe ndị metụtara mmetụta uche. A tụlewo isiokwu nke ịda mbà n’obi n’ime Ụlọ Nche na Teta! eri afọ ndị 1960. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Ma e lekwasịrị isiokwu ahụ anya ọzọ na n’ụzọ dị irè n’usoro isiokwu mmeghe bụ́ “Ị Pụrụ Ịlụso Ịda Mbà n’Obi Ọgụ!” na Teta! (Bekee) nke September 8, 1981. Ngwa ngwa akwụkwọ ozi ekele nubataara Watch Tower Society site n’akụkụ nile nke ụwa. “Olee otú m pụrụ isi detuo n’akwụkwọ mmetụta dị n’obi m?” ka otu nwanna nwanyị dere. “Adị m 24 afọ, n’ime afọ iri gakwara aga, enwewo m ọtụtụ oge nke ịda mbà n’obi. Ma ugbu a ana m enwe mmetụta nke ịnọ Jehova nso karị ma nwee obi ekele na ọ zaghachiri ná mkpa nke ndị dara mba n’obi site n’isiokwu ịhụnanya ndị a, m chọkwara ịgwa unu nke ahụ.”
14, 15. (a) Olee otú e siworo hụ maka isiokwu nke mmetọ ụmụaka n’akwụkwọ anyị? (b) Olee isiokwu magazin nke masịrị onye Australia na-eme egwuregwu ịgba ịnyịnya?
14 Ihe ndị metụtara ọha na eze. Bible buru amụma na na “mgbe ikpeazụ” mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (2 Timoti 3:1-3) Ya mere, o kwesịghị iju anyị anya na a na-emetọ ụmụaka n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu taa. A tụlere isiokwu a n’ụzọ eziokwu n’isiokwu bụ́ “Enyemaka Maka Ndị Ndị Ikwu Ha Dinara” nke dị n’Ụlọ Nche nke July 1, 1985. Afọ asatọ mgbe nke ahụ gasịrị, usoro isiokwu e ji malite Teta! (Bekee) nke October 8, 1991, bụ́ “Ịgwọta Ọnyà Dị Iche Iche nke Mmetọ Nwata” bụ nke e ji nlezianya kwadebe iji nye ndị e dinara nghọta na olileanya nakwa iji mee ka ndị ọzọ ghọta ka ha wee nwee ike inye aka n’ụzọ bara uru. Usoro isiokwu ndị a wetara okwu ekele kasị ukwuu site n’ọnụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị n’akụkọ ihe mere eme nke akwụkwọ anyị nile. Otu onye gụrụ ya dere, sị: “Mmetụta kasịnụ na mụ inwetaghachi onwe m abụwo echiche ndị ahụ na-akasi obi na ntụaka Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’isiokwu ndị a. Ịmara na Jehova enweghị echiche dị ala banyere m bụ ihe na-akpata ahụ iru ala dị ukwuu. Ịmara na ọ bụghị nanị m bụkwa ihe nkasi obi.”
15 Otu onye na-eme egwuregwu ịgba ịnyịnya na Melbourne, Australia, nọ ebe dị anya kpọọ ọfịs Watch Tower Society dị na Sydney na fon, na-ekwupụta iwe ya banyere ọnọdụ ebe a na-eji ịnyịnya agba ọsọ. Ọ sịrị na ya ka gụsịrị Teta! nke July 8, 1993, n’isiokwu bụ́ “Ndina n’Ike—Ahụmahụ Jọgburu Onwe Onye Ya nke Onye Bụ Nwanyị,” nakwa na ya echetụdịghị na magazin bara uru otú ahụ dị adị. Ọ jụrụ ajụjụ ruo ihe dị ka 30 minit, nweekwa obi ụtọ ịnụ azịza ndị e nyere.
16. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ị pụrụ isi gosipụta obi ekele gị maka magazin anyị abụọ?
16 Gịnị banyere gị? Otu isiokwu e bipụtara n’Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ò metụtawo ndụ gị kpọmkwem? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na i nwere mmetụta miri emi nke obi ekele maka magazin abụọ anyị. Olee otú ị pụrụ isi gosipụta obi ekele gị? N’ezie site n’ịgụ mbipụta nke ọ bụla n’onwe gị. Ị pụkwara ikere òkè n’ikesa magazin ndị a dị oké ọnụ ahịa n’ụzọ kasị saa mbara dị ka o kwere mee. Olee otú a pụrụ isi mee nke a?
Soro Ndị Ọzọ Kerịta Ha!
17. Gịnị ka ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime iji mụbaa nkesa nke magazin?
17 Nke mbụ, e nwere ihe ọgbakọ ọ bụla pụrụ ime. Mbipụta October 1952 nke Informant (Ozi Alaeze Anyị ugbu a) sịrị: “Ụzọ kasị dị irè isi kesaa magazin bụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ na site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa. N’ihi ya Society na-atụ aro ka ụzọ ndị a nke isi kesaa magazin bụrụ akụkụ na-adị mgbe nile n’ọrụ Ụbọchị Magazin.” Okwu ndụmọdụ ahụ ka dịkwa irè taa. Ọgbakọ pụrụ ịhazi Ụbọchị Magazin, otu ụbọchị e setịpụrụ iche kpọmkwem maka ịgba àmà magazin. Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ọgbakọ nile, Saturday ndị a kpọrọ aha aghaghị ịbụ oge dị mma. Ee, ka ọgbakọ ọ bụla setịpụ ụbọchị ma ọ bụ uhuruchi ndị pụrụ iche maka ịgba àmà magazin—site n’ụlọ ruo n’ụlọ, site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, n’ọrụ okporo ámá, na na nke ndị a na-enye magazin nile. Tinyere nke ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime, gị onye nkwusa Alaeze, iji nye aka iwelite nkesa magazin?
18, 19. (a) Olee otú ịdị na-eburu Ụlọ Nche na Teta! n’uche pụrụ isi nyere gị aka itinye magazin? (b) Gịnị bụ uru nke okwu dị mkpirikpi, nke gara kpọmkwem n’ihe a chọrọ mgbe a na-enyefe magazin? (ch) Gịnị na-egosi uru nke ime ka magazin banye n’ebe obibi ndị mmadụ?
18 Ịdị na-ebu “Ụlọ Nche” na “Teta!” n’uche bụ nzọụkwụ nke mbụ. Gụọ magazin ndị ahụ n’oge. Ka ị na-agụ isiokwu nke ọ bụla, jụọ onwe gị sị, ‘Ònye ka isiokwu a ga-amasị?’ Chee echiche banyere okwu ole na ole ị pụrụ ikwu iji kpalie mmasị n’isiokwu ahụ. E wezụga ịkwado Ụbọchị Magazin ndị e ji eme ihe mgbe nile, gịnị ma i na-eji magazin ụfọdụ ka i wee nwee ike iji ohere ọ bụla dapụtaranụ soro ndị ọzọ kerịta ha—mgbe ị na-eme njem ma ọ bụ gaa ahịa na mgbe ị na-agwa ndị ọrụ ibe gị, ndị agbata obi, ụmụ akwụkwọ ibe gị, ndị nkụzi, okwu?
19 Kwuo okwu dị mfe bụ aro nke abụọ. Ụlọ Nche December 1957, kwuru, sị: “Okwu dị mkpirikpi nke na-ezo aka otu mgbe ahụ n’ihe a chọrọ ka mmadụ mara bụ nke kachasị mma na mgbe a na-eche magazin ahụ n’ihu mmadụ. Ihe bụ nzube bụ ka e wee tinye ọtụtụ magazin n’aka mmadụ. Ha ga-arụ ọrụ ‘ikwu okwu’ nke ha onwe ha.” Ndị nkwusa ụfọdụ ahụwo ya dị ka ihe dị irè iwepụta otu echiche site n’otu isiokwu, kwuo ya n’okwu ole na ole, wee nyefee magazin ndị ahụ. Ozugbo ọ banyere n’ime ụlọ, magazin ndị ahụ pụrụ “ikwu okwu” gwa ndị ọzọ tinyere onye ahụ naara ha n’aka gị. Na Ireland otu onye na-eto eto na-aga mahadum gụrụ mbipụta September 1, 1991, nke Ụlọ Nche, bụ́ nke nna ya natara site n’aka otu Onyeàmà. Isiokwu ndị ahụ banyere nkwurịta okwu na isiokwu ndị ọzọ kpaliri mmasị ya. Ozugbo ọ gụrụ magazin ahụ, ọ kpọrọ Ndịàmà na telifon, na-akpọ nọmba e depụtara n’akwụkwọ fon. A malitere ọmụmụ Bible ngwa ngwa, e mekwara nwa agbọghọ ahụ baptism ná Mgbakọ Distrikti “Izi Ihe Chineke” na July 1993. N’ezie, ka anyị mee ka magazin ndị ahụ banye n’ebe obibi dị iche iche, ebe ha pụrụ “ikwu okwu” gwa ndị mmadụ! Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị tụrụ aro ọzọ dị mfe: “Wepụta magazin ndị ahụ n’akpa akwụkwọ gị.” N’ezie, ọ bụrụ na ihe i kwuru adọrọghị mmasị onye nwe ụlọ, mgbe ahụ ma eleghị anya ihe osise na-adọrọ adọrọ nke dị na peji ihu ha ga-etinyere gị magazin ahụ.
20, 21. (a) Olee otú ị pụrụ isi na-eme mgbanwegharị mgbe ị na-ekere òkè n’ọrụ magazin? (b) Gịnị ka ị pụrụ ime iji tinyekwuo magazin kwa ọnwa?
20 Aro nke atọ bụ na-eme mgbanwe. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 9:19-23.) Kwadebe okwu ole na ole dị mkpirikpi. Buru otu isiokwu n’uche bụ́ nke ga-adọrọ mmasị ndị ikom, ọzọ ga-adọrọ mmasị ndị inyom. Maka ndị ntorobịa, ị pụrụ igosipụta otu isiokwu “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .” Na-emekwa mgbanwe, banyere mgbe ị ga-ekere òkè n’ọrụ magazin. Gụnyere Ụbọchị Magazin, ị pụrụ ịchọpụta na ịgba àmà uhuruchi na-enye ohere magburu onwe ya iji nyefee magazin site n’ụlọ ruo n’ụlọ.
21 Aro nke anọ bụ setịpụ ihe mgbaru ọsọ onwe onye. Ihe ntinye bụ́ “Magazin Na-ezo Aka n’Ụzọ Ndụ,” nke pụtara n’Ozi Alaeze Anyị nke July 1984, kwuru sị: “Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa pụrụ inwe mgbaru ọsọ, ihe dị ka magazin iri kwa ọnwa, dabere n’otú ọnọdụ ha dị; ndị ọsụ ụzọ pụrụ ịgbalị maka iri itoolu. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị nkwusa pụrụ itinye ọtụtụ magazin kwa ọnwa, n’ihi nke a kwa ha ga-edebe ihe mgbaru ọsọ onwe onye ka elu. Otú ọ dị, n’ihi nrịanrịa, ụdị ókèala, ma ọ bụ ihe mgbochi ndị ọzọ, ihe mgbaru ọsọ nke ndị ọzọ pụrụ ịdị ala karị. Ma ozi ha na-ejere Jehova bụkwa ihe a na-anara nke ọma. (Mat. 13:23; Luk 21:3, 4) Ihe dị mkpa bụ inwe ihe mgbaru ọsọ nke onwe onye.”
22. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị nwere ekele maka Jehova n’ihi akwụkwọ anyị abụọ nke eziokwu bụ́ ndị na-abịa n’oge?
22 Lee ka anyị si nwee ekele na Jehova, “Chineke nke eziokwu,” ejiriwo òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na Òtù Na-achị Isi ya nye anyị magazin ndị a na-abịa n’oge ha! (Abụ Ọma 31:5) Ruo ogologo oge Jehova nyere ohere ya, magazin ndị a ga-anọgide na-ahụ maka ezi mkpa ndị mmadụ. Ha ga-anọgide na-ebuli ụkpụrụ omume ndị dị elu nke Jehova. Ha agaghị akwụsị ịkwalite ozizi ziri ezi. Ha ga-anọgidesikwa ike na-adọrọ uche gaa ná mmezu nke amụma nke na-aka ụbọchị anyị akara dị ka mgbe Alaeze Chineke na-achị na mgbe a na-eme uche Chineke n’ụwa dị ka a na-emebeghị mgbe ọ bụla ọzọ n’aka ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-efe Jehova ezi ofufe. (Matiu 6:10; Mkpughe 11:15) Lee akụ̀ dị oké ọnụ ahịa anyị nwere n’Ụlọ Nche na Teta! Ka anyị jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ mee ihe iso ndị dị umeala n’obi kerịta magazin abụọ ndị a dị mkpa bụ́ ndị na-emetụta ndụ ndị mmadụ na ndị na-akpọsa eziokwu dị iche iche nke Alaeze.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a July 15, 1992, peji nke 19-22.
b Ruo ọtụtụ afọ e lere Ụlọ Nche anya dị ka magazin dịịrị ndị Kraịst e tere mmanụ karịsịa. Otú ọ dị, na-amalite na 1935, e mesiwanyere ihe ike n’ịgba “oké ìgwè mmadụ” ahụ, ndị olileanya ha bụ ndụ ebighị ebi n’elu ụwa, ume inweta na ịgụ Ụlọ Nche. (Mkpughe 7:9) N’afọ ole na ole nke ahụ gasịrị, na 1940, Ụlọ Nche bụ nke a na-enyefe ndị mmadụ mgbe mgbe n’okporo ámá. E mesịa, nkesa ya rịrị elu ngwa ngwa.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Gịnị na-egosi na Ụlọ Nche na Teta! bụ akwụkwọ ndị nke eziokwu?
◻ Olee otú Ụlọ Nche na Teta! siworo metụta ndụ ndị mmadụ?
◻ Gịnị ka ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime iji mụbaa nkesa magazin?
◻ Aro ndị dị aṅaa pụrụ inye aka iji tinyekwuo magazin?
[Igbe dị na peeji nke 22]
Isiokwu Ụfọdụ Metụtaworo Ndụ Ndị Mmadụ
N’afọ ndị gafeworonụ, ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị edetawo akwụkwọ iji kwupụta obi ekele ha maka isiokwu ụfọdụ kpọmkwem e bipụtara n’Ụlọ Nche na Teta! Ihe e depụtara n’okpuru bụ nanị ole na ole nke ọtụtụ isiokwu ndị metụtara ndị na-agụ akwụkwọ anyị. Isiokwu ndị a ma ọ bụ ndị ọzọ hà agbanwewo ndụ gị?
Ụlọ Nche
“Nara Enyemaka Chineke Iji Merie Mmehie Nzuzo” (October 15, 1985)
“Igosi Nsọpụrụ Chineke n’Ebe Nne na Nna Meworo Agadi” (June 1, 1987)
“Agụmakwụkwọ nke Nwere Nzube” (November 1, 1992)
Teta!
“Ị Pụrụ Ịlụso Ịda Mbà n’Obi Ọgụ!” (September 8, 1981, Bekee)
“Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ . . .” (April 22, 1985, Bekee)
“Chebe Ụmụ Gị!” (October 8, 1993, Bekee)
[Foto dị na peeji nke 23]
Na Canada—iji magazin na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ
[Foto dị na peeji nke 24]
Na Myanmar—iche magazin ndị na-egosipụta ụzọ nke ndụ n’ihu ndị mmadụ