Họrọ Isiokwu Dị Iche Iche Iji Nweta Mmasị Pụrụ Iche nke Ndị Mmadụ
1 Dị ka ndị na-agba akụ́ ndị na-eji nlezianya atụ akụ́ ha, ọtụtụ ndị nkwusa ọgbakọ na ndị ọsụ ụzọ na-enweta ezi ihe ịga nke ọma n’iji isiokwu ndị a họpụtara ahọpụta site n’Ụlọ Nche na Teta! eme ihe iji dọrọ mmasị pụrụ iche nke ndị bi n’ókèala ha. Ha na-ekpebi onye kasị yie ka ọ ga-achọ ịgụ isiokwu ụfọdụ ndị sitere na magazin ndị ahụ. Olee otú ha si eme nke a?
2 Nke mbụ ha na-agụzu mbipụta nke ọ bụla ihu na azụ. Mgbe ahụ ha ajụọ onwe ha sị, Olee ụdị mmadụ isiokwu nke ọ bụla ga-amasị? A na-emezi mgbali ileta ndị o yikarịrị ka ha ga-enwe mmasị ịgụ isiokwu ahụ. Mgbe ha tụrụ anya na otu isiokwu kwesịrị ka ọtụtụ ndị nara ya n’ókèala ha, ha na-atụ ọda ka e nyekwuo ha.
3 A Na-akwanyere Magazin Anyị Ùgwù Nke Ukwuu: Otu n’ime ndị na-atụ ụtụ magazin bụ́ onye na-arụrụ otu magazin mba nile nke Nigeria a kasị agụ agụ ọrụ kwuru banyere Teta!, sị: Mma mmanụ maka magazin kasị adọrọ mmasị ọha mmadụ n’ụwa nile.” Otu onye na-agụkarị magazin anyị kwuru, sị: “Lee akụ̀ dị ebube nke amamihe dị oké ọnụ ahịa ọ bụ! O siri ike inwe otu isiokwu na-amasị m nke m na-adịghị ahụ ebe a tụlere ya na peji nke otu n’ime [magazin] ndị a.”
4 Magazin ndị a na-ekwu banyere isiokwu dị iche iche gụnyere Bible, ihe na-eme n’ụwa, nchegbu ezinụlọ, nsogbu ọha na eze, akụkọ ihe mere eme, sayensị, ndụ anụmanụ na ihe ọkụkụ, ka e depụta nanị ole na ole. N’ezie mmadụ na-enwekarị ọchịchọ ịgụ otu ihe mgbe o metụtara mkpa, ọnọdụ, ma ọ bụ ọrụ ya. Ebe ọ bụ na anyị na-agwa ọtụtụ ndị okwu, onye ọ bụla na-enwe ihe pụrụ iche ndị ọ na-ahọrọ na nsogbu ndị nke ya, ịhọrọ isiokwu ndị ga-amasị kpọmkwem ndị mmadụ anyị na-ezute dị nnọọ irè.
5 Rịba ama ihe mere mgbe Ndịàmà abụọ nyefere otu onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’otu akwụkwọ akụkọ mbipụta Teta! nke September 8, 1996. O dere, sị: “Tupu m nweta ohere ịsị na enweghị m mmasị, otu n’ime ha gbakwụnyere, sị: ‘E nwere otu isiokwu banyere ndị American India. Anyị maara na ị nọwo na-ede ọtụtụ ihe banyere isiokwu ahụ.’” Ọ naara magazin ahụ, gụọkwa isiokwu ahụ banyere ndị India n’oge nri ụtụtụ, mesịa kwere na “ọ magburu onwe ya,” “bụrụkwa eziokwu n’ụzọ nile.”
6 Gịnị Na-amasị Ndị Mmadụ n’Ókèala Unu? Gịnị ka ị hụworo na magazin n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya nke pụrụ ịmasị ndị na-elekọta ụlọ ahịa na mmadụ ndị nwere aka ọrụ n’ókèala gị ma ọ bụ ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị, na ụmụ akwụkwọ ibe gị? Gịnị ga-amasịkarị ndị ọkàiwu, ndị nkụzi, ndị ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ, ndị na-ejere ọha na eze ozi, na ndị ọrụ ahụ ike? Iburu ndị ị na-ezisara ozi ọma n’uche ka ị na-atụle mbipụta nke ọ bụla ga-enye gị ụzọ ndị magburu onwe ha isi gbasaa okwu nke eziokwu ahụ.
7 Mgbe i zutere onye na-egosi mmasị pụrụ iche n’otu isiokwu Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! bụ́ onye na-anatakwa magazin ahụ, ị pụrụ ịsị: “Mgbe e nwere isiokwu dị ná mbipụta na-abịa n’ihu bụ́ nke m chere na ọ ga-amasịkwa gị, obi ga-adị m ụtọ iwetara gị otu.” Ị pụrụ inwe ike ịgụnye onye ahụ n’ụzọ magazin gị, na-eji magazin ndị kasị ọhụrụ na-akpọtụrụghachi ya ọtụtụ mgbe. Nke ahụ yiri ihe e meworo n’ịkpọ onye ọ bụla òkù iletaghachi ndị pụrụ inwe mmasị pụrụ iche n’isiokwu ụfọdụ ndị pụtara na magazin anyị.
8 Nwee Nzube Ime Mmụọ: Afọ ole na ole gara aga, otu nwoke onye nwere mmasị n’ọrụ natara otu magazin Teta! n’otu isiokwu nke masịrị ya. Otu ọ dị, nwoke a ji okpukpe akpọrọ ihe gụkwara mbipụta Ụlọ Nche nke ya na ya na-agakọ, bụ́ nke nwere isiokwu kpaliri ya inyocha nkwenkwe o nwere kemgbe a mụrụ ya n’Atọ n’Ime Otu. Mgbe ọnwa isii gasịrị e mere ya baptism! Ya mere, alala azụ n’itinye ndị na-agụ magazin anyị ná nkwurịta okwu ime mmụọ. Ị pụrụ igosi broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, kwuokwa ka i were nanị minit ole na ole tụlee otu ihe ọmụmụ n’otu nleta ọ bụla mgbe ọ bụla i ji magazin ndị ọhụrụ bịaghachi.
9 Jiri nlezianya chee echiche banyere onye n’ime ndị nletaghachi gị na ndị gị na ha na-azụkọ ahịa kasị yie ka ọ̀ ga-achọ inweta mbipụta ndị ọhụrụ nke Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ahụ gbalịsie ike ijekwuru ha. Jiri magazin ndị a bara uru kpọtụrụ ọtụtụ ndị dị ka i nwere ike. Echefukwala mgbe ọ bụla na ka ị na-eme mgbalị inyere ndị mmadụ aka ịgụ magazin anyị, ị ‘na-ezipụ nri gi n’elu mmiri.’ Ka oge na-aga, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịchọta ndị ga-abụ ndị na-eso ụzọ ibe gị n’ọdịnihu.—Ekli. 11:1, 6.