Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/98 p. 1
  • Ị̀ Na-agụ Magazin Ndị Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-agụ Magazin Ndị Ahụ?
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Ụlọ Nche na Teta!—Akwụkwọ Eziokwu Ndị Na-abịa n’Oge Ha
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Magazin Na-ekwupụta Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Họrọ Isiokwu Dị Iche Iche Iji Nweta Mmasị Pụrụ Iche nke Ndị Mmadụ
    Ozi Alaeze Anyi—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 10/98 p. 1

Ị̀ Na-agụ Magazin Ndị Ahụ?

1 Otu di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ n’Africa nwere nke a ikwu banyere magazin anyị: “Ụlọ Nche na-enyere anyị aka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ n’ókèala anyị. Anyị na-enweta agbamume na ume site ná mbipụta nke ọ bụla.” Ì nwere ekele miri emi dị otú ahụ banyere magazin anyị? Ọ̀ na-adịkwa gị ọkụ n’obi otú ahụ ịgụ ha?

2 Ọ na-ewe oge dị ukwuu iji kwadebe isiokwu magazin bụ́ ndị a pụrụ iji nanị minit ole na ole gụchapụ. N’ịmata nke a, ị̀ ga-agụ nnọọ isiokwu ndị ahụ elu elu, kirie foto ha, ma ọ bụ mgbe ụfọdụ gụọ isiokwu ndị dọọrọ mmasị gị? Anyị bụ ndị maara ihe ma anyị mee ihe karịrị nke ahụ. Anyị kwesịrị iwepụta oge iji gụọ ma mụọ isiokwu nile dị ná mbipụta magazin anyị nke ọ bụla. Ụlọ Nche bụ magazin anyị bụ́ isi maka nri ime mmụọ na-abịa n’oge ya. Teta! na-ebu isiokwu ndị na-adọrọ mmasị na ndị na-enye ihe ọmụma n’isiokwu dị iche iche. Ọ bụghị nanị na ihe ndị anyị na-amụta site n’ịgụ magazin ndị a na-ewusi anyị ike n’ụzọ ime mmụọ kamakwa ha na-akwadebe anyị maka ikere òkè dị irè karị n’ozi. Site n’ịbụ ndị na-agụchi ya anya n’onwe anyị, anyị ga-enwe ịnụ n’ọkụ n’obi banyere inyefe ndị ọzọ magazin ndị ahụ.

3 Ụzọ Isi Meziwanye Àgwà Ịgụ Ihe: Ị̀ pụrụ ịdị na-agụchikwu magazin anya karị? Lee aro abụọ ndị na-enyere ọtụtụ ndị aka. (1) Nwee usoro ịgụ ihe mgbe nile. Nanị site n’iwepụta minit 10 ma ọ bụ 15 kwa ụbọchị iji gụọ ihe, ọ ga-eju gị anya ịhụ ihe ị pụrụ ịgụcha n’otu izu. (2) Nwee ụzọ isi na-amata ihe ndị ị gụworo. Ikekwe ị pụrụ ịkanye ihe ná mmalite nke isiokwu ọ bụla ị gụrụ. Ma i meghị nke a, ị pụrụ ịmafere isiokwu ụfọdụ ma ọ bụ ọbụna otu magazin dum. Ọ dị mkpa inwe usoro ịgụ ihe nke dị irè nye gị na ịgbaso ya.—Tụlee Ndị Filipaị 3:16.

4 “Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ejiriwo amamihe mee ihe banyere oge ndị na-agbanwe agbanwe site n’ibipụta isiokwu ndị na-ekwu banyere mkpa ndị mmadụ nwere n’ezie. (Mat. 24:45) N’eziokwu, magazin ndị ahụ enwewo mmetụta ná ndụ anyị. Ọ̀tụ̀tụ̀ ịga n’ihu ime mmụọ anyị, ruo n’ókè dị ukwuu, bụ nke ọdịdị nke àgwà anyị nke ịgụ akwụkwọ ọchịchị Chineke na-achịkwa. Ngọzi ime mmụọ bara ụba na-echere ndị na-ewepụta oge ịgụ magazin ahụ nile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya