Nyefee Magazin Ndị Na-agbara Eziokwu Àmà
1. Olee ọrụ Ụlọ Nche na Teta! na-arụ?
1 Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova na magazin a na-ebipụtakọta ya na ya, bụ́ Teta!, ka bụ akwụkwọ ndị bụ́ isi e ji arụ ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ọ na-atọ anyị ụtọ inye ndị mmadụ magazin abụọ a na-abịa n’oge ha ka anyị na-ekere òkè n’akụkụ dị iche iche nke ozi Alaeze ahụ.
2. Olee mgbanwe ndị anyị hụrụla n’Ụlọ Nche na Teta!, oleekwa ihe mere e ji mee mgbanwe ndị a?
2 Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị ahụla ka a gbanwere ókè ihe ndị na-adị na magazin ndị a na-aha, ụdị ihe ndị na-adị na ha, nakwa otú anyị si enyefe ha ndị mmadụ. Ihe mere e ji mee mgbanwe ndị a bụ ka magazin ndị a na-adọrọkwu mmasị ma bakwuo uru, ka ozi Alaeze ahụ wee ruo n’obi nke ‘ụdị mmadụ nile ka e nwee ike ịzọpụta ha, ha abịaruokwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’—1 Tim. 2:4.
3. Olee otú a ga-esi na-enyefe ndị mmadụ magazin n’ozi?
3 Kemgbe January 2006, anyị amụtala iji ụzọ dị iche iche enyefe Teta! ndị na-abịa ugboro anọ n’afọ. Ugbu a, anyị ga-eme ihe yiri nke ahụ site n’inyefe nanị otu Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova n’ozi ihu ọha anyị, n’agbanyeghị na anyị na-enwe Ụlọ Nche abụọ kwa ọnwa. Ihe atụ nke otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla ga na-apụta n’azụ Ozi Alaeze Anyị. Aro ndị a ga na-ekwukarị banyere isiokwu ndị dị ná mmalite magazin, ma mgbe ụfọdụ, ha ga-ekwukwa banyere isiokwu ndị ọzọ dị n’ime ya, bụ́ ndị ga-amasị ọtụtụ ndị. Aro ndị ahụ e biri ebi ga-akasị arụpụta ihe ma ọ bụrụ na anyị ghọtara isiokwu ahụ e kwuru banyere ya nke ọma ma jiri okwu nke aka anyị gwa ya ndị mmadụ n’ụzọ ga-akasị daba n’ókèala anyị.
4. Olee ihe mere o nwere ike iji baa uru isi otú ọzọ nyefee magazin n’ejighị aro ndị ahụ dị n’Ozi Alaeze Anyị?
4 N’agbanyeghị na Ozi Alaeze Anyị ga na-ebu aro abụọ maka otú a ga-esi enyefe magazin nke ọ bụla, i nwere ike isi otú ọzọ nyefee ya. Otu ihe nwere ike ime ka i mee otú ahụ bụ na otu n’ime isiokwu ndị ọzọ dị na ya ga-aka amasị ọtụtụ ndị n’ókèala unu. Ma ọ bụkwanụ i nwere ike iche na ị ga-aka enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na i kwuo banyere isiokwu masịrị gị karịa.
5. Tupu ị kwadebe ihe ị ga-ekwu iji nyefee magazin, olee ihe i kwesịrị ime?
5 Otú Ị Ga-esi Kwadebe Ihe Ị Ga-ekwu: Nke mbụ, i kwesịrị ịma isiokwu ahụ ị na-achọ ikwu banyere ya nke ọma. O nwere ike ọ gaghị abụ mgbe nile ka ị ga-agụrucha isiokwu nile dị na magazin ala tupu i nyefewe ya n’ozi ubi. N’agbanyeghị nke ahụ, i kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na obi gị nile kwuo okwu banyere isiokwu ndị ị chọrọ iji enyefe magazin ahụ. Nanị ihe ga-eme ka i nwee ike ime otú ahụ bụ ịmata isiokwu ahụ ị na-achọ ịkọwa nke ọma.
6. Olee otú anyị nwere ike isi kwadebe ihe anyị ga-ekwu banyere magazin anyị?
6 Nke abụọ, kwadoo okwu mmeghe gị otú ị ga-enwe ike ịgbanwe ya ma ọ dị mkpa. I nwere ike iji ajụjụ na-etoghị ogologo nke ga-eme ka mmadụ nwee mmasị ịgụ isiokwu ahụ malite okwu gị. Na-eji Okwu Chineke eru n’obi ndị mmadụ mgbe nile. (Hib. 4:12) Họta amaokwu Bible metụtara isiokwu ahụ ị chọrọ iji enyefe magazin ahụ, ọ ga-akasịkwa mma ka ọ bụrụ amaokwu dị n’isiokwu ahụ ị na-achọ ịkọwa. Chee echiche otú ị ga-esi jikọta amaokwu ahụ na isiokwu ahụ.
7. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka ihe ndị anyị na-ekwu banyere magazin anyị na-adọrọkwu mmasị?
7 Jiri Ohere Ọ Bụla Ị Hụrụ Mee Ihe: Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe ị kwadebere ikwu rụpụta ihe, ị ghaghị iji ya mee ihe. Na-eso ọgbakọ unu aga ozi magazin na Saturday. Nye ndị naarala gị akwụkwọ anyị ndị ọzọ magazin. Nye ndị ị na-amụrụ Bible magazin mgbe ọ bụla ị gara na nke ha, na-enyekwa ndị ọzọ ị hụrụ ebe ị gara nletaghachi magazin. I nwere ike inye ndị i zutere mgbe ị gara ahịa, mgbe ị na-eme njem, ma ọ bụ mgbe ị na-eche dọkịta magazin. Mee ka otú i si enyefe magazin na-adọrọkwu mmasị ka i ji ya na-eme ihe n’ọnwa ahụ dum.
8. Olee ihe ndị mere Ụlọ Nche na Teta! ji pụọ iche?
8 Magazin Ụlọ Nche na Teta! pụrụ iche. Ha na-ebuli Jehova elu dị ka Eze eluigwe na ụwa. (Ọrụ 4:24) Ha na-eji ozi ọma nke Alaeze Chineke akasi ndị mmadụ obi ma na-agba ndị mmadụ ume inwe okwukwe na Jizọs Kraịst. (Mat. 24:14; Ọrụ 10:43) E wezụga nke ahụ, ha na-elegide anya n’ihe ndị na-eme n’ụwa ka ha na-emezu amụma Bible. (Mat. 25:13) Nyere ndị nọ n’ókèala unu aka irite uru na magazin ndị a site n’iji ohere ọ bụla kwesịrị ekwesị ị hụrụ enyefe ha ndị mmadụ!
9. Olee otú anyị nwere ike isi tọọ ntọala maka nletaghachi?
9 Mgbe i nyefere mmadụ magazin, ma ọ bụ ya abụrụ na gị na mmadụ nwere nnọọ ezigbo mkparịta ụka dabeere na Bible, jụọ ajụjụ ma ọ bụkwanụ gị ekwuo okwu ga-akpali onye ahụ iche echiche, bụ́ nke ga-emeghe ụzọ maka nletaghachi na mkparịta ụka ọzọ dabeere na Bible. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-akụ mkpụrụ nke eziokwu, anyị ji n’aka na Jehova ga-emeghe obi nke ndị ji ezi obi chọọ ịmata Ya na ife Ya.—1 Kọr. 3:6.