Otú E Si Akwadebe Ihe A Ga-ekwu Mgbe A Chọrọ Inyefe Magazin
1. Gịnị mere o ji ka mma iji aka anyị kwadebe otú anyị ga-esi nyefee magazin kama ịdị na-eburu ndị ahụ e bipụtara n’Ozi Alaeze Anyị n’isi?
1 Ị pụrụ ịdị na-eche ma ànyị kwesịrị ịdị na-akwadebe ihe anyị ga-ekwu mgbe anyị chọrọ inyefe magazin, ebe ọ bụ na a na-edepụta ha n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa ọ bụla. Ọ bụ ezie na ndị ahụ dị n’Ozi Alaeze Anyị na-abara ọtụtụ ndị nkwusa uru, ọ ka dịkwa anyị mkpa ịkwadebe ihe anyị ga-ekwu. Ụzọ dabara adaba isi nyefee magazin n’otu ókèala nwere ike ọ gaghị adaba adaba n’ókèala ọzọ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị iche na iwu ji anyị ịgbaso nke ahụ e depụtara n’Ozi Alaeze Anyị. Ọ bụrụgodị na anyị họọrọ iji nke dị n’Ozi Alaeze Anyị mee ihe, ọ na-akacha mma ka anyị kwuo ya n’okwu nke aka anyị.
2. Olee ihe ga-ekpebi isiokwu ị ga-eji enyefe magazin?
2 Họrọ Otu Isiokwu: Mgbe ị gụsịrị magazin ahụ, họrọ otu isiokwu i nwere nnọọ mmasị na ya bụ́ nke ị chọpụtara na ndị nọ n’ókèala unu ga-enwekwa mmasị na ya. Ụdị ịnụ ọkụ n’obi i ji na-enyefe magazin ahụ dị ka onye ihe ọ na-ekwu doro anya nwere ike ịkpali onye nwe ụlọ ịchọ ịgụ ya. Ọ bụ ezie na isiokwu ị ga-eji enyefe ya nwere ike ịbụ nke ọtụtụ ndị nọ n’ókèala unu ga-aka enwe mmasị na ya, i kwesịkwara ịmara ihe isiokwu ndị ọzọ dị na magazin ahụ na-ekwu. Nke a ga-eme ka i nwee ike iji isiokwu ọzọ nyefee magazin ahụ ma i zute onye ga-aka enwe mmasị n’isiokwu ahụ.
3. Olee ụdị okwu mmeghe na-akasị adọta mmasị ndị mmadụ ma i jiri ya mee ihe?
3 Jụọ Ajụjụ: Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịkwadebe otú ị ga-esi amalite okwu gị. I kwesịrị nnọọ ichebara ihe ị ga-ekwu ná mmalite echiche. I nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ ajụjụ ọ ga-echebara echiche iji wee kpalie mmasị ya n’isiokwu ahụ ị họọrọ. Ọ na-akasị mma ịjụ ha ihe bụ́ echiche ha banyere ihe ahụ ị chọrọ ikwu maka ya. Ajụkwala onye nwe ụlọ ajụjụ nwere ike ime ka ahụ́ ghara iru ya ala ma ọ bụ nke ga-eme ka o zewe isi ya.
4. Olee uru ndị ọ bara ịgụrụ onye nwe ụlọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ma ọ bụrụ na ohere dapụtara ime otú ahụ?
4 Gụọ Otu Akụkụ Akwụkwọ Nsọ: N’ikpeazụ, họrọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga-agụrụ onye nwe ụlọ ma ọ bụrụ na ohere dapụtara ime otú ahụ, o nwere ike ịbụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị n’isiokwu ahụ i ji enyefe ya magazin ahụ. Ịgụrụ onye nwe ụlọ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ga-eme ka o kweta na ihe anyị na-ezi ya bụ ozi si na Bible. (1 Tesa. 2:13) Ọ bụrụgodị na ọ jụ inweta magazin ahụ, anyị ejirila akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ anyị gụụrụ ya gbaara ya àmà. Ụfọdụ akpaliela mmasị onye nwe ụlọ site n’ibu ụzọ gụọrọ ya otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ tupu ha ajụọ ya ajụjụ. Tupu gị agụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, ị pụrụ ikwu, sị, “M ga-achọ ịmata ihe i chere banyere amaokwu Bible a.” Dọrọzie uche ya gaa n’ebe a kọwara amaokwu ahụ n’ime magazin ahụ, ma kwuo okwu dị nkenke iji kpalikwuo mmasị ya tupu ị na-enyefe ya magazin ahụ.
5. Olee ụkpụrụ ndị bụ́ isi i kwesịrị iburu n’uche mgbe ị na-akwadebe ihe ị ga-ekwu mgbe ị chọrọ inyefe magazin?
5 E nweghị ụzọ a kapịrị ọnụ a ga-agbasorịrị ma a bịa n’ihe a ga-ekwu mgbe a chọrọ inyefe magazin. Ọ kasị mma ka i mee ka okwu gị kwe nghọta ma dị nkenke. Jiri ụzọ ọ bụla kaara gị mma, nke ga-arụpụtakwa ezigbo ihe nyefee ya. Lekwasị anya n’ezigbo uru magazin ndị ahụ bara, ma jiri ịnụ ọkụ n’obi kwuo okwu gị. Ọ bụrụ na ị na-akwadebe nke ọma, ọ ga na-adịkwuru gị mfe inyefe Ụlọ Nche na Teta! n’aka ndị nwere “ezi ọchịchọ obi maka ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48.