Ị̀ Na-ejezu Ozi Gị?
1 N’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi, a gwara anyị na ndị na-eso ụzọ Jisọs jezuru ozi ha site n’ịgbara ndị ọzọ “àmà nke ọma.” (Ọrụ 2:40; 8:25; 28:23, NW) Nke ahụ bụ n’ezie ebumnobi Pọl onyeozi. (Ọrụ 20:24) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe mgbaru ọsọ gị dị ka onye ozi nke ozi ọma ahụ? Olee otú ị pụrụ isi mezuo nke a?
2 Kwadebe Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ nke Gị: Iji jide n’aka na ị gbara ezi àmà n’ozi, ime nkwadebe dị mkpa. Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe a na-enyefe magazin, ebe isiokwu ha na-agbanwe mgbe nile. Iji kwadebe anyị nke ọma karị, mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị na-ewebata ihe ọhụrụ—kọlụm dị n’aka ekpe, bụ́ ebe e depụtara ihe atụ nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dị iche iche maka magazin Ụlọ Nche na Teta! ndị kasị ọhụrụ. A ga-ewepụta isiokwu bịara n’oge ya nke ga-adọta mmasị ọtụtụ ndị maka mbipụta nke ọ bụla. Olee otú ị pụrụ isi kọwakwuo ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a dị nkenke?
3 Họrọ otu aro i chere ga-akasị dị iré n’ókèala gị. Jiri nlezianya gụọ isiokwu ahụ e gosipụtara ma rịba ama isi ihe ụfọdụ kpọmkwem ndị yiri ka ha ga-akpali mmasị. Chọta otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ e zoro aka na ya na magazin ahụ bụ́ nke kwekọrọ ná mkparịta ụka ahụ, nke ị nwekwara ike ịgụrụ onye nwe ụlọ. Kwuo okwu mmechi dị nkenke iji gbaa onye na-ege gị ntị ume ịgụ magazin ahụ ma gwa onye nwe ụlọ n’ụzọ dị nkenke, ma ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, na ọ pụrụ inye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. Ugbu a, mụgharịa ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke gị.
4 Mee Atụmatụ Iji Bible Mee Ihe: Site n’ime ezi atụmatụ, ọtụtụ mgbe ị pụrụ iwebata otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ i si eche ihe n’ihu mmadụ. Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa nwere ahụmahụ ndị nọ n’ọtụtụ ebe na-enwe ihe ịga nke ọma site n’ijide Bible n’aka mgbe ha na-aga n’ọnụ ụzọ mmadụ, kelee onye nwe ụlọ, ma sị:
◼ “Anyị na-ajụ ndị mmadụ ma ha kwenyere n’ihe a . . . ” Gụọ Jenesis 1:1, jụzie, sị: “Ì kwenyere n’ihe ahụ e kwuru?” Ọ bụrụ na onye ahụ kwere, mgbe ahụ kwuo, sị: “Mụ onwe m kwa kwere. Otú ọ dị, ì chere na ọ bụrụ na ọ bụ Chineke kere ihe nile, na ọ bụkwa ya kpatara ajọ omume?” Mgbe i nabatasịrị nzaghachi onye ahụ, gụọ Eklisiastis 7:29. Mepee akwụkwọ Ihe Ọmụma na peeji nke 71, ma gụọ paragraf nke 2. Gbaa onye ahụ ume ịgụ akwụkwọ ahụ.
5 Sochie Mmasị Nile: Ị pụghị ijezu ozi gị ma ọ bụrụ na ị dịghị esochi mmasị ị chọtara. Mgbe gị na mmadụ nwere mkparịta ụka dị mma, n’agbanyeghị ma i tinyere magazin ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ, detuo aha na adres onye ahụ. Gbalịsie ike iwulite mmasị onye ahụ site n’ịgaghachi n’egbughị oge. Gbalịsie ike kwuo ka i duziere ya ọmụmụ Bible.
6 Ndị na-eso ụzọ na narị afọ mbụ maara na Jisọs nyere ha iwu “ịgba àmà nke ọma.” (Ọrụ 10:42, NW) Iwu ahụ dịkwaara anyị, n’ihi na ọ bụ nanị ụzọ anyị ga-esi mee ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Ka anyị mee ihe nile anyị pụrụ ime iji jezuo ozi anyị nke ọma.—2 Tim. 4:5.