Kwadebe Ụzọ Iche Magazin n’Ihu Mmadụ nke Gị
1 Anyị nwere mmasị na magazin Ụlọ Nche na Teta! n’ihi isiokwu ha na-abịa n’oge ha ma na-enye ihe ọmụma, bụ́ ndị na-emetụtazu ihe nile, site n’okwu ndị metụtara ụwa ruo ‘n’ihe nile dị omimi nke Chineke.’ (1 Kọr. 2:10) Anyị nile na-echeta ọtụtụ ihe ọhụrụ ndị na-ewulikwa elu anyị gụworo n’akwụkwọ ndị a, nke Jehova na-eji eme ihe n’ikpughe eziokwu ahụ n’ụzọ na-aga n’ihu. (Ilu 4:18) Anyị kwesịrị inwe ịnụ ọkụ n’obi iji kesaa ha n’ụzọ sara mbara ruo n’ókè o kwere mee.
2 Tụlee Ókèala Gị: Ụdị ndị dị aṅaa bi n’ókèala gị? Ọ bụrụ na ọ na-adị ha ngwa ngwa mgbe nile, ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịkwadebe okwu dị mfe ma gaa n’isi ihe. Ọ bụrụ na i nwere ókèala ebe ọ na-adịghị adị ha ngwa ngwa mgbe nile, ị pụrụ inwe ike ikwukwu okwu. Ọ bụrụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị nwe ụlọ na-arụ ọrụ n’ehihie, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma karị n’ịga n’ebe obibi ha mgbe oge gamiworo n’ehihie ma ọ bụ ná mmalite oge uhuruchi. Ị pụrụ izute ụfọdụ n’ehihie site n’ịgba àmà okporo ámá ma ọ bụ n’ịrụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa. Ndị nkwusa ụfọdụ na-enweta ihe ịga nke ọma site n’ịgakwuru ndị mmadụ n’ụzọ a na-ebughị ụzọ dokwaa n’ọdụ ụgbọala na n’ebe a na-ere mmanụ ụgbọala.
3 Mara Magazin Ndị ahụ nke Ọma: Gụọ mbipụta nke ọ bụla ozugbo i nwetara ya. Họrọ isiokwu ndị i chere ga-amasị ndị mmadụ n’ókèala gị. Isiokwu ndị dị aṅaa na-eche ha echiche? Chọpụta otu isi ihe ị pụrụ ihota site n’isiokwu ị na-eme atụmatụ iche n’ihu mmadụ. Chee echiche banyere otu ajụjụ ị pụrụ iwelite nke pụrụ ịkpalite mmasị. Họrọ otu akụkụ akwụkwọ nsọ kwesịrị ekwesị ị ga-agụrụ onye nwe ụlọ ma ọ bụrụ na i nwee ohere ime otú ahụ. Chee echiche banyere otú ị pụrụ isi tọọ ntọala maka nletaghachi.
4 Kwadebe Okwu Mmeghe Gị: Jiri nlezianya họrọ okwu ndị ị na-eme atụmatụ iji kọwaa onwe gị na iji malite mkparịta ụka. Ụfọdụ enwewo ihe ịga nke ọma n’iji okwu mmeghe ndị a eme ihe: “Agụwo m otu isiokwu na-akpali mmasị na magazin a, achọkwara m isoro ndị ọzọ kerịta ya.” Ọtụtụ na-amalite site n’ịjụ ajụjụ nke na-elekwasị anya n’isi ihe maka nkwurịta okwu nke ha mere atụmatụ iji mee ihe. Dị ka ihe atụ:
5 Ọ bụrụ na ị na-akọwapụta isiokwu banyere njupụta nke mpụ, ị pụrụ ịjụ, sị:
◼ “Gịnị ka ọ ga-ewe anyị iji nwee ike ihi ụra n’abalị n’enweghị egwu nke ịbụ ndị e zuru ohi ma ọ bụ merụọ ahụ?” Kọwaa na i nwere ihe ọmụma ụfọdụ banyere ihe ngwọta nye nsogbu a. Ihe ngwọta ahụ ga-ewepụkwa ụdị nile ọzọ nke nsogbu ọha na eze n’isi nso. Zoo aka n’ihe dị na magazin ahụ nke na-enye olileanya dị otú ahụ ma gbaa onye ahụ ume ịtụ ụtụ magazin ahụ maka otu afọ n’ụtụ a na-enyefe ya. Mgbe ị laghachiri, ị pụrụ ịdọrọ uche onye nwe ụlọ gaa n’isi 1 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma.
6 Mgbe ị na-enyefe isiokwu metụtara ndụ ezinụlọ, ị pụrụ ikwu nke a:
◼ “Ihe ka ọtụtụ ná ndị mụrụ ụmụ na-ahụ ya dị ka oké ihe ịma aka ịzụlite ezinụlọ n’ụbọchị ndị a. E dewo ọtụtụ akwụkwọ n’isiokwu ahụ, ma ọbụna ndị ọkachamara ekwekọrịtaghị. Ọ̀ dị onye ọ bụla pụrụ inye nduzi a pụrụ ịdabere na ya?” Kerịta kpọmkwem otu okwu sitere na magazin ahụ nke na-egosipụta ndụmọdụ amamihe a na-achọta na Bible. Nyefee ụtụ magazin ahụ. Ọ bụrụ na a nataghị ụtụ ahụ, nyefee magazin ụfọdụ n’ụtụ a na-enyefe ya. Mgbe ị bịara nletaghachi, tụlee echiche ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ banyere ịzụlite ụmụ nke a tụlere n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, peji nke 145-148.
7 Mgbe ị na-eche isiokwu metụtara nsogbu ọha na eze n’ihu mmadụ, ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ọ na-adị ọtụtụ ndị ka hà nọ n’okpuru nrụgide n’ihi oge siri ike nke anyị bi n’ime ya. Ì chere na Chineke bu n’obi ka anyị biri otú a?” Zoo aka n’otu isiokwu nke na-egosi otú e si anagide nsogbu nke taa ma ọ bụ nke na-ekwu ihe mere a ga-eji tụọ anya maka ọdịnihu nke nchegbu na-agaghị adị. Mgbe ahụ nyefee ụtụ magazin ahụ. Ọ bụrụ na a nataghị ụtụ ahụ, nyefee magazin n’ụtụ a na-enyefe ya. N’ọbịbịa gị ọzọ, tụlee ihe osise na okwu nkọwa dị na peji nke 4-5 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma, mgbe ahụkwa duru ya gaa kpọmkwem n’ọmụmụ Bible ebe obibi.
8 Mee Mgbanwe Iji Kwekọọ n’Onye Nwe Ụlọ: Ị ga-ezute ndị nwere mmasị na ọnọdụ nzụlite dị iche iche. Kwadebe okwu bụ isi nke ị pụrụ idozigharị maka onye nwe ụlọ nke ọ bụla. Buru n’uche otú ị pụrụ isi gbanwee ihe ị na-agwa nwoke, nwanyị, onye meworo agadi, ma ọ bụ onye ntorobịa. E nweghị ụkpụrụ nduzi ndị a na-apụghị ịgbanwe agbanwe banyere ihe ị ga-ekwurịrị. Jiri ihe ọ bụla dịịrị gị mfe, nke na-arụpụtakwa ihe mee ihe. Otú ọ dị, na-ekpo ọkụ, kwuo okwu site n’obi gị, bụrụkwa onye na-ege ntị nke ọma. Ndị ‘nwere obi ziri ezi’ ga-ahụ obi eziokwu gị, ha ga-azaghachikwa n’ụzọ dị mma.—Ọrụ 13:48, NW.
9 Nyerenụ Ibe Unu Aka: Site n’isoro ibe anyị na-ekerịta echiche, anyị na-amụta ụzọ ndị ọhụrụ isi kwupụta uche anyị. Ịmụgharịkọta ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ anyị na-enye anyị ahụmahụ na obi ike. (Ilu 27:17) Ọ bụrụ na ị mụgharịa ihe ị gaje ikwu, ị ga-enwekwu ahụ iru ala n’ọnụ ụzọ. Ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ nyere ụmụ ha aka ịkwadebe, gee ntị ka ha na-amụgharị ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ha, tụọkwa aro maka mmeziwanye. Ndị ọhụrụ pụrụ irite uru site n’isoro ndị nkwusa ka nwee ahụmahụ na-arụ ọrụ.
10 O kwesịghị isi ike ịkwadebe ụzọ iche magazin n’ihu mmadụ nke gị. Nanị ihe ọ chọrọ bụ iburu otu isi ihe ị ga-ekwu n’uche nakwa ikwu ya n’ụzọ na-akpali mmasị. Site n’ibute ụzọ na ibu ụzọ chee echiche, ị pụrụ ichepụta okwu dị mma nke ga-enweta nzaghachi dị mma.
11 Ikesa magazin bụ otu n’ime ụzọ ndị bụ isi anyị si agbasa ozi Alaeze ahụ n’ụwa nile. Ọ bụrụ na i nwere ike itinye Ụlọ Nche na Teta! n’aka ndị nwere obi eziokwu, magazin ndị ahụ pụrụ ikwuru onwe ha okwu. Na-echeta uru ha mgbe nile na otú ozi ha pụrụ isi zọpụta ndụ. Ụdị nke a nke ‘ime ihe dị mma na ime ka gị na ndị ọzọ nwekọọ ihe gị’ bụ ihe na-atọ Jehova ụtọ nke ukwuu.—Hib. 13:16.