Ị̀ Na-ekwuzi Okwu Chineke?
1 Jisọs Kraịst bụ onye ozizi kasị ukwuu nke dịworo ndụ n’elu ala. O kwuru okwu n’ụzọ ruru n’obi ndị mmadụ, kpalie mmetụta uche ha, ma kwalie ha ịrụ ezi ọrụ. (Mat. 7:28, 29) O ji Okwu Chineke mee ihe mgbe nile dị ka ihe ndabere maka ozizi ya. (Luk 24:44, 45) O nyere Jehova Chineke otuto maka ihe nile ọ maara na ihe o nwere ike izi. (Jọn 7:16) Jisọs setịpụụrụ ụmụazụ ya ihe nlereanya magburu onwe ya site n’ikwuzi Okwu Chineke.—2 Tim. 2:15.
2 Pọl onyeozi jekwara ozi dị ka ihe nlereanya pụtara ìhè site n’iji Okwu Chineke mee ihe n’ụzọ dị irè. O mere ihe karịrị nanị ịgụrụ ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ; ọ kọwara ma tụgharịa uche n’ihe ọ gụrụ, na-enye ihe àmà sitere n’Okwu Chineke na Jisọs bụ Kraịst ahụ. (Ọrụ 17:2-4) N’otu aka ahụ, onye ọkà okwu ahụ bụ́ Apọlọs onye na-eso ụzọ ‘dị ike n’ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ,’ o kwuzikwara ha n’ikwu okwu dị ike nke eziokwu.—Ọrụ 18:24, 28.
3 Bụrụ Onye Ozizi nke Okwu Chineke: Ndị mkpọsa Alaeze nke oge a enwewo ihe ịga nke ọma magburu onwe ya n’izi ndị nwere obi eziokwu ihe site n’izo aka na ịtụgharị uche na Bible. N’otu ọnọdụ, otu nwanna nwoke ji Ezikiel 18:4 tinyere akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ha na ya nwere njikọ wee soro otu pastọ na ndị òtù parish ya atọ tụgharịa uche n’ihe ga-abụ ọdịnihu ndị ajọ omume na ndị ezi omume. N’ihi nke ahụ, ụfọdụ ndị òtù chọọchị ahụ malitere ịmụ ihe, otu n’ime ha mesịkwara nakwere eziokwu. N’ọnọdụ ọzọ, a gwara otu nwanna nwanyị ka ọ kọwaara di na-emegide emegide nke otu onye nwere mmasị ihe mere na Ndịàmà Jehova adịghị eme ememe Krismas na ụbọchị ọmụmụ. Ka ọ gụpụtara azịza ndị ahụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ site n’akwụkwọ Reasoning, nwoke ahụ kwupụtara nkwenye ya. Nkwenye ya tọrọ nwunye ya ụtọ nke ukwuu nke na ọ sịrị: “Anyị ga-abịawa nzukọ unu.” Di ya kwenyekwara!
4 Jiri Enyemaka E Nwere Mee Ihe: Ozi Alaeze Anyị na usoro ihe omume Nzukọ Ije Ozi na-enye ezi ntụziaka iji nyere anyị aka n’iji Okwu Chineke eme ihe. Ọtụtụ ndị nkwusa ekwupụtawo ekele maka ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ dịgasị iche iche a tụrụ aro ha ndị a na-ebipụta ma na-eme ihe ngosi ha maka abamuru anyị, bụ́ ndị bịaworo nnọọ n’oge ha ma dịkwa irè. Reasoning From the Scriptures nwere ụba nke aro banyere ụzọ iji kọwaa ihe karịrị isiokwu 70 ndị bụ isi, bụ́ ndị a tụlere n’Okwu Chineke. Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi na-enye nchịkọta dị mkpirikpi nke ozizi Bible ndị bụ isi, bụ́ nke dị ndị ọhụrụ mkpa ịghọta. Ihe ọmụmụ 24 na 25 n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke na-egosi anyị otú ndị ozizi nwere nkà si amalite, agụ, ma na-akọwa akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche nke ọma. Anyị kwesịrị iji enyemaka a nile anyị ga-enweta n’ụzọ dị mfe eme ihe nke ọma.
5 Mgbe anyị kwuziri Okwu Chineke, anyị ga-achọpụta na ọ “dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike . . . bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi” nke ndị anyị na-ekwusara ozi ọma. (Hib. 4:12) Ihe ịga nke ọma anyị ji ya na-enwe ga-akwali anyị iji nkwuwa okwu ka ukwuu na-ekwu eziokwu ahụ!—Ọrụ 4:31.