Anyị Nwere Ọrụ
1 Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.’ (Mat. 28:19) N’ala 232 na ìgwè àgwàetiti gburugburu ụwa, ihe karịrị nde ise nke ndị na-enye Jehova Chineke otuto bụ akaebe dị ndụ nye mmezu nke iwu Jisọs. Ma gịnị banyere anyị onwe anyị? Ànyị na-ewere ọrụ ime nkwusa dị ka ihe dị oké mkpa?
2 Ibu Ọrụ nke Omume: Ọrụ bụ “iwu e nyere ịrụ ọrụ a kpọrọ aha.” Kraịst nyere anyị iwu ime nkwusa. (Ọrụ 10:42) Pọl onyeozi ghọtara na nke a tụkwasịrị ya mkpa, ma ọ bụ ibu ọrụ nke omume, ịkpọsa ozi ọma ahụ. (1 Kọr. 9:16) Iji maa atụ: Were ya na ị bụ onye ọrụ nke ụgbọ mmiri na-emikpu ná mmiri. Onye isi ụgbọ mmiri enye gị iwu ka ị dọọ ndị nọ n’ụgbọ ahụ aka ná ntị ma duzie ha gaa n’ụgbọ epeepe ndị e ji azọpụta ndụ. Ị̀ ga-eleghara iwu ahụ anya ma tụkwasị uche nanị n’ịzọpụta nanị onwe gị? Ọ dịghị ma ọlị. Ndị ọzọ na-adabere na gị. Ndụ ha nọ n’ihe ize ndụ. I nwere ibu ọrụ nke omume ịrụ ọrụ gị iji nyere ha aka.
3 E nyewo anyị ọrụ sitere n’aka Chineke ịkpọsa ịdọ aka ná ntị. Jehova ga-eweta ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a dum n’isi nso. Ndụ ọtụtụ nde mmadụ bụ ihe a na-ejighị n’aka. Ọ̀ ga-ezi ezi nye anyị ileghara ihe ize ndụ ọ bụụrụ ndị ọzọ anya ma na-enwe nchegbu nanị banyere ịzọpụta onwe anyị? Ọ dịghị ma ọlị. Anyị nwere ibu ọrụ nke omume inye aka iji zọpụta ndụ nke ndị ọzọ.—1 Tim. 4:16.
4 Ihe Nlereanya Kwesịrị Ntụkwasị Obi A Ga-agbaso: Ezikiel onye amụma nwere mmetụta nke ibu ọrụ izi ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi ozi ịdọ aka ná ntị. Jehova dọrọ ya aka ná ntị n’ụzọ doro anya banyere ihe ndị ga-esi na ya pụta ma ọ bụrụ na ọ rụghị ọrụ e kenyere ya: “Mgbe M na-asị onye na-emebi iwu, Ị ghaghị ịnwụ; ma ị dọghị ya aka ná ntị . . . ; onye ahụ nke na-emebi iwu ga-anwụ n’ajọ omume ya; ma n’aka gị ka M ga-ajụta ọbara ya.” (Ezik. 3:18) Ezikiel ji ịnọgidesi ike n’ihe rụzuo ọrụ ya ọbụna n’agbanyeghị mmegide siri ike. Ya mere, o nwere ike ịṅụrị ọṅụ mgbe e mezuru ikpe Jehova.
5 Ọtụtụ narị afọ n’ihu, Pọl onyeozi dere banyere ibu ọrụ o nwere ime nkwusa. O kwupụtara, sị: “Adị m ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị. N’ihi na egwu emeghị m ka m ghara ịkọrọ unu izu nile nke Chineke.” Pọl mere nkwusa n’ihu ọha na site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ihi na ọ ghọtara na emeghị otú ahụ pụrụ ime ka ikpe ọbara maa ya n’ihu Chineke.—Ọrụ 20:20, 26, 27.
6 Ànyị nwere ịnụ ọkụ n’obi nke Ezikiel? Ànyị na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a kwaliri ime nkwusa dị ka Pọl nwere? Ọrụ anyị na nke ha bụ otu ihe ahụ. Anyị aghaghị ịnọgide na-emezu ibu ọrụ anyị ịdọ ndị ọzọ aka ná ntị, n’agbanyeghị enweghị mmasị, ma ọ bụ mmegide ha. Ọtụtụ puku ndị ọzọ ka pụrụ ịnakwere ozi Alaeze ahụ wee kwupụta, sị: “Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.” (Zek. 8:23) Ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ụmụ mmadụ ibe anyị nọ kwalie anyị ka ike ghara ịgwụ anyị. Anyị nwere ọrụ ime nkwusa!