Nzukọ Ije Ozi Maka November
Izu Na-amalite November 4
Abụ 29 (11)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi July maka mba a na ọgbakọ unu.
15 min: “Ị̀ Na-ekwuzi Okwu Chineke?” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị dabeere ‘n’Ihe mere a ga-eji atụle Bible,’ site n’akwụkwọ Reasoning, peji nke 58-60.
20 min: “Nke A Bụ Ndụ Ebighị Ebi.” (Paragraf nke 1-5) Mgbe okwu mmeghe dị mkpirikpi site na paragraf 1 gasịrị, mee ka ndị nkwusa abụọ dị irè mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 2-5. Mesie ike ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ Bible.
Abụ 128 (58) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 11
Abụ 40 (60)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ndokwa ije ozi ubi maka ngwụsị izu.
20 min: N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Nye Jehova Ihe? Nkwurịta okwu n’etiti ndị okenye abụọ, na-akọwapụta isi ihe ndị dị n’isiokwu dị na peji nke 28-31 nke Ụlọ Nche nke November 1, 1996. Ma ọ bụ a pụrụ inye ihe ọmụma ahụ n’okwu nke onye okenye ga-ekwu.
15 min: “Nke A Bụ Ndụ Ebighị Ebi.” (Paragraf nke 6-8) Tụlee abamuru nke iji ụzọ ịga n’ihe kpọmkwem malite ọmụmụ ihe. Mee ka onye nkwusa nwere ahụmahụ mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 6-7. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịkọ banyere ọnọdụ dị iche iche ebe a malitere ọmụmụ ihe n’ọbịbịa nke mbụ. Mgbe a jụrụ ya kpọmkwem ma ọ̀ ga-enwe mmasị n’ọmụmụ ihe, otu nwoke zaghachiri, sị: “Ee. Batawanụ. M ga-enwe mmasị inwe ọmụmụ ihe.” A malitere ịmụrụ ya ihe ahụ, ezinụlọ ya nile sonyere n’izu nke sochirinụ, n’oge na-adịghịkwa anya ha nile malitere na-eje nzukọ ma na-ekere òkè n’ọrụ ịgba àmà. Gbaa mmadụ nile ume iji ihe ntinye nke Ozi Alaeze Anyị nke June 1996 ha bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ.
Abụ 129 (66) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 18
Abụ 140 (77)
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Anyị Nwere Ọrụ.” Ajụjụ na azịza. Kwuo okwu ná mkpirikpi na paragraf nke 13-16 n’Ụlọ Nche nke January 1, 1988, peji nke 28-29.
20 min: Iduzi Ọmụmụ Bible Ndị Na-aga n’Ihu. Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Anyị anọwo na-eji akwụkwọ Ihe Ọmụma na-eme ihe n’ọrụ ọmụmụ Bible ruo ihe dị ka otu afọ. O yikarịrị ka ụfọdụ ndị mmụta amụchaworị ya, ebe ndị ọzọ gamiwokwara n’akwụkwọ ahụ. A gbara anyị ume ilekwasị anya n’iduzi ọmụmụ ihe ndị e dokwara iji nyere ndị ọhụrụ aka ịmụta eziokwu ahụ ngwa ngwa, tinye ya n’ọrụ ná ndụ ha, wee ghọọ akụkụ nke ọgbakọ. Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996 na-atụ arọ ndị dị mma iji nyere anyị aka ịdị irè dị ka ndị nkụzi. Tụleghachi ná mkpirikpi ihe ụfọdụ anyị pụrụ ime iji zie ndị mmụta ihe, dị ka a tụlezuru ya na paragraf nke 3-13 nke ihe ntinye ahụ. Ọzọ, lekwasị anya n’ihe ọ dị mkpa ime iji jiri nkà nyere ha aka iwere nguzo ziri ezi, dị ka e depụtara na paragraf nke 14-22. Gụpụta paragraf nke 15, 17, 20-21. Tụleghachi akụkọ ụfọdụ dị mma ndị na-egosi otú ndị nkwusa ọgbakọ siworo nweta ihe ndị dị mma site na ya. Gbaa ndị ọzọ ume ikere òkè n’ọrụ ọmụmụ Bible.
Abụ 85 (44) na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite November 25
Abụ 46 (20)
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
10 min: Igbe Ajụjụ. Soro ndị na-ege ntị kwurịta.
18 min: “Jiri Nkwuwa Okwu Kpọsaa Ozi Ọma.” Ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu. Gụọ paragraf nile dị ka oge nyere ohere ya.
12 min: Tụleghachi Akwụkwọ A Ga-enyefe na December. Nyefee akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ ma ọ bụ Akwukwọm nke Akukọ Bible. N’inyefe akwụkwọ Nwoke Kasị Ukwuu, zoo aka n’isi nke 35 n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Òle Ndị Nwere Obi Ụtọ n’Ezie?” Rụtụ aka n’eziokwu ahụ bụ na onye ọ bụla taa chọrọ inwe obi ụtọ. Ma gịnị mere na ọtụtụ ndị enweghị obi ụtọ? Gịnị gahiere? N’iji echiche ndị sitere n’isiakwụkwọ a eme ihe, gosi na ezi obi ụtọ na-adabere na (1) mmadụ ịmara mkpa ime mmụọ ya, (2) ịdị umeala n’obi na ịbụ onye a pụrụ izi ihe, na (3) ịnụ Okwu Chineke na ịghọ ndị na-eme okwu ahụ. Kọwapụta ọdịnihu dị nchebe maka ndị maara mkpa ime mmụọ ha n’ezie. Zoo aka n’isi nke 133 ma gụọ Luk 23:43, na-egosi na n’oge na-adịghị anya ndị ezi omume ga-adị ndụ agwụghị agwụ na paradaịs e weghachiri eweghachi. Mee ihe ngosi dị mkpirikpi, na-eji echiche ndị e depụtara n’ebe a eme ihe. N’ebe ọ bụla e gosiri mmasị, e kwesịrị ime ndokwa doro anya maka nletaghachi.
Abụ 180 (100) na ekpere mmechi.