Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 22 p. 153-p. 156 para. 5
  • E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kọwaa Ihe Ị Gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ Otú Ga-edo Anya
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • E Webatara Akwụkwọ Nsọ n’Ụzọ Dị Irè
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Na-eru n’Obi Ndị Ị Na-akụziri Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Webata Akwụkwọ Nsọ Otú Dị Mma
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 22 p. 153-p. 156 para. 5

IHE ỌMỤMỤ NKE 22

E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Jide n’aka na ụzọ ọ bụla e si jiri otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ mee ihe kwekọrọ n’ihe gbara ya gburugburu nakwa na Bible dum. Ụzọ ahụ e si jiri ya mee ihe kwesịkwara ikwekọ n’ihe “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” bipụtaworo.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ịkụziri ndị ọzọ Okwu Chineke abụghị ntakịrị ihe. Uche ya bụ ka mmadụ nile bịaruo “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:3, 4) Nke ahụ na-ebo anyị ibu ọrụ nke ịkụzi Okwu Chinke n’ụzọ ziri ezi.

MGBE anyị na-ezi ndị ọzọ ihe, a chọrọ ihe karịrị nanị ịgụpụta amaokwu dị iche iche site na Bible. Pọl onyeozi degaara onye òtù ya bụ́ Timoti, sị: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Tim. 2:15.

Ime nke a pụtara na otú anyị si akọwa Akwụkwọ Nsọ aghaghị ikwekọ n’ihe Bible n’onwe ya na-akụzi. Nke a na-achọ ka anyị buru n’uche ihe ndị gbara ya gburugburu, kama nanị ịhọrọ okwu ndị masịrị anyị na ịgbakwụnye echiche ndị nke anyị. Site n’ọnụ Jeremaịa onye amụma, Jehova dọrọ aka ná ntị banyere ndị amụma ahụ na-asị na ha na-ekwu ihe si n’ọnụ Jehova pụta ma n’ezie na-ekwu “ọhụụ nke obi ha.” (Jer. 23:16) Pọl onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị banyere iji nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ merụọ Okwu Chineke mgbe o dere, sị: “Anyị ajụwo ihe nzuzo ndị a ga-emere ihere, n’adịghị eje ije n’aghụghọ, n’adịghịkwa agwagbu okwu Chineke.” N’oge ahụ ndị ahịa mmanya na-adịghị eme ihe n’eziokwu na-agwagbu mmanya ha ka o bukwuo ibu ma nyekwuo ha uru. Anyị adịghị agwagbu Okwu Chineke site n’ịgwakọta ya na nkà ihe ọmụma ụmụ mmadụ. “Anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke dị ka ọtụtụ ndị bụ,” ka Pọl kwuru, “kama site n’izi ezi nke obi, ee, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị e si n’ebe Chineke nọ zipụ, n’ihu anya Chineke, ná mmekọrịta anyị na Kraịst.”—2 Kọr. 2:17; 4:2.

Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ ihota ihe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwuru iji mee ka otu ụkpụrụ pụta ìhè. Bible jupụtara n’ụkpụrụ ndị na-enye ezi nduzi n’ime ihe banyere ọnọdụ dị iche iche. (2 Tim. 3:16, 17) Ma i kwesịrị ijide n’aka na ụzọ i si jiri ya na-eme ihe ziri ezi nakwa na i jighị otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na-eme ka o yie ka ọ na-ekwu ihe ị chọrọ ka o kwuo. (Ọma 91:11, 12; Mat. 4:5, 6) Ụzọ e si jiri ya mee ihe aghaghị ikwekọ ná nzube Jehova, kwekọọ n’Okwu Chineke dum.

‘Ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’ na-agụnyekwa ịghọta echiche dị n’ihe Bible na-ekwu. Ọ bụghị “okpiri” a ga-eji na-emenye ndị ọzọ ụjọ. Ndị ozizi okpukpe, bụ́ ndị megidere Jizọs Kraịst hotara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, ma ha nọ na-eleghara ihe ndị ka mkpa anya—ihe ndị metụtara ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi—bụ́ ihe ndị Chineke chọrọ. (Mat. 22:23, 24; 23:23, 24) Mgbe ọ na-akụzi Okwu Chineke, Jizọs gosipụtara àgwà Nna ya. Jizọs jikọtara ịnụ ọkụ n’obi ya maka eziokwu ahụ na ịhụnanya dị omimi o nwere n’ebe ndị o ziri ihe nọ. Anyị kwesịrị ịgbalị iṅomi ihe nlereanya ya.—Mat. 11:28.

Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị na-eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị? Ịgụchi Bible anya ga-enye aka. Ọ dịkwa mkpa ka anyị nwee ekele maka onyinye Jehova nyere anyị “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche,” bụ́ ìgwè Ndị Kraịst e tere mmanụ ndị o si n’aka ha na-enye ezinụlọ nke okwukwe nri ime mmụọ. (Mat. 24:45) Ọmụmụ ihe onwe onye tinyere ịgachi na ikerechi òkè anya ná nzukọ ọgbakọ ga-enyere anyị aka irite uru ná ntụziaka a na-enye site n’aka òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.

Ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ bụ́ Reasoning From the Scriptures n’asụsụ unu, ọ bụrụkwa na ị mụta iji ya eme ihe nke ọma, ọ ga-adịrị gị mfe inweta nduzi dị gị mkpa iji jiri ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-ejikarị eme ihe n’ozi mee ihe n’ụzọ ziri ezi. Ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ iji otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-amachaghị nke ọma mee ihe, ịma otú ikike gị hà ga-akpali gị ime nnyocha dị mkpa ka i wee nwee ike ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi mgbe ị na-ekwu okwu.—Ilu 11:2.

Mee Ka Nkọwa Ya Doo Anya. Mgbe ị na-ezi ndị ọzọ ihe, jide n’aka na ha hụrụ n’ụzọ doro anya ihe jikọrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị i ji eme ihe na isiokwu unu na-atụle. Ọ bụrụ na ị jụrụ ajụjụ dugara n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ, ndị na-ege gị ntị kwesịrị ịhụ otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ si zaa ajụjụ ahụ. Ọ bụrụ na i ji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-akwado ihe i kwuru, jide n’aka na onye ahụ a na-amụrụ ihe hụrụ n’ụzọ doro anya otú amaokwu ahụ si kwadoo isi ihe ahụ.

Nanị ịgụpụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ—ọbụna iji imesi okwu ike gụọ ya—adịghị ezukebe. Cheta na ọtụtụ ndị amaghị Bible ma eleghịkwa anya ha agaghị ahụ isi ihe ị na-ewepụta nanị site n’ịgụ ya otu ugboro. Dọrọ uche gaa n’akụkụ metụtara ihe unu na-ekwu kpọmkwem n’amaokwu ahụ.

Nke a na-achọkarị ka i mee ka okwu ndị bụ́ isi, ndị metụtara isi ihe a na-atụle kpọmkwem, pụta ìhè. Ụzọ kasị mfe isi mee ya bụ ikwughachi okwu ndị ahụ na-ewepụta echiche dị n’okwu. Ọ bụrụ na ị na-agwa otu onye okwu, ị pụrụ ịjụ ya ajụjụ ndị ga-enyere ya aka ịmata okwu ndị bụ́ isi. Mgbe ha na-agwa ìgwè mmadụ okwu, ndị ọkà okwu ụfọdụ na-ahọrọ imezu ebumnobi ha site n’iji okwu ndị ha na okwu ndị ha ji mee ihe pụtara otu ihe mee ihe ma ọ bụ ikwughachi echiche okwu ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na i kpebie ime nke a, lezie anya ka ndị na-ege ntị ghara ichefu otú ihe a na-ekwu si kwekọọ n’okwu e ji mee ihe n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ.

Ebe i meworo ka okwu ndị bụ́ isi pụta ìhè, ị tọwo ezigbo ntọala. Gazie n’ihu. Ì webatara akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ site n’ịkọwa n’ụzọ doro anya ihe mere i ji jiri ya na-eme ihe? Ọ bụrụ otú ahụ, kọwapụta ihe jikọrọ okwu ndị i mere ka ha pụta ìhè na ihe i mere ka ndị na-ege gị ntị tụọ anya ya. Kwuo n’ụzọ doro anya ihe ahụ jikọrọ ha. Ọ bụrụgodị na i webataghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’ụzọ dị otú ahụ doro anya, i kwesịrị inyekwu nkọwa ụfọdụ.

Ndị Farisii jụrụ Jizọs ajụjụ ha chere na o siri ike, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghịm n’ihi ụdị ihe ọ bụla?” Jizọs dabeere na Jenesis 2:24 zaa ya. Rịba ama na o lekwasịrị anya nanị n’otu akụkụ ya, mgbe ahụ o nyere nkọwa a chọrọ. Ebe ọ kọwapụtaworo na nwoke na nwunye ya ga-aghọ “otu anụ ahụ́,” Jizọs kwubiri, sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtaworo, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Mat. 19:3-6.

Nkọwa ha aṅaa ka i kwesịrị inye iji mee ka otú a pụrụ isi jiri otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ mee ihe doo anya? Ndị so ná ndị na-ege gị ntị na otú isi ihe ahụ a na-atụle dịruru ná mkpa kwesịrị ịbụ ihe ga-ekpebi ya. Ka nzube gị bụrụ ime ka ọ dị mfe na ikwu ihe a chọrọ kpọmkwem.

Tụgharịa Uche Site n’Akwụkwọ Nsọ. Banyere ozi Pọl onyeozi jere na Tesalonaịka, Ọrụ 17:2, 3 na-agwa anyị na ọ ‘tụgharịrị uche site n’Akwụkwọ Nsọ.’ Nke a bụ nkà onye ọ bụla na-ejere Jehova ozi kwesịrị ịgbalị ịzụlite. Dị ka ihe atụ, Pọl kọrọ ihe ndị mere eme banyere ndụ na ije ozi Jizọs, gosi na e buru ihe ndị a n’amụma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, wee mechizie n’ụzọ dị ike site n’ikwu, sị: “Onye a bụ Kraịst ahụ, Jizọs nke a onye m na-ekwusara unu.”

Mgbe ọ na-edegara Ndị Hibru akwụkwọ, ugboro ugboro, Pọl hotara ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Iji mesie otu isi ihe ike ma ọ bụ iji mee ka o doo anya, ọ na-emekarị ka otu okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu pụta ìhè mgbe ahụ gosizie ihe ọ pụtara. (Hib. 12:26, 27) N’ihe ndekọ dị ná Ndị Hibru isi 3, Pọl hotara ihe e kwuru n’Abụ Ọma 95:7-11. Rịba ama na ọ kọwakwuziri akụkụ atọ na ya: (1) aka e zoro n’ebe obi dị (Hib. 3:8-12), (2) ihe okwu bụ́ “Taa” pụtara (Hib. 3:7, 13-15; 4:6-11), na (3) ihe okwu bụ́: “Ha agaghị abanye n’izu ike m,” pụtara (Hib. 3:11, 18, 19; 4:1-11). Gbalịa iṅomi ihe nlereanya ahụ ka ị na-eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla eme ihe.

Rịba ama otú Jizọs si tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ dị irè n’ihe ndekọ ahụ dị na Luk 10:25-37. Otu nwoke nke maara Iwu jụrụ ya, sị: “Onye Ozizi, site n’ime gịnị ka m ga-eji keta ndụ ebighị ebi?” Ná nzaghachi Jizọs bu ụzọ jụọ nwoke ahụ ihe bụ uche ya n’okwu ahụ, mgbe ahụzi, Jizọs mesiri ike mkpa ọ dị ime ihe Okwu Chineke na-ekwu. Mgbe o doro anya na nwoke ahụ aghọtaghị isi ihe ọ na-ekwu, Jizọs tụlere n’ụzọ sara mbara nanị otu nkebi ahịrịokwu sitere n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ—“onye agbata obi.” Kama nanị ịkọwa ihe ọ pụtara, o ji ihe atụ nyere nwoke ahụ aka iru ná nkwubi okwu kwesịrị ekwesị n’onwe ya.

O doro anya na mgbe ọ na-aza ajụjụ, Jizọs ehotaghị nanị ihe e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị nyere azịza ndị doro anya, ndị gara n’ihe a chọrọ kpọmkwem. Ọ kọwara ihe ha kwuru ma jiri ha mee ihe n’ịza ajụjụ a jụrụ.

Mgbe ndị Sadusii na-agbagha olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ, Jizọs lekwasịrị anya n’otu akụkụ kpọmkwem n’Ọpụpụ 3:6. Ma ọ kwụsịghị mgbe o hotasịrị ihe e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ. Ọ tụgharịrị uche na ya iji gosi n’ụzọ doro anya na mbilite n’ọnwụ so ná nzube Chineke.—Mak 12:24-27.

Ịmụta nkà nke ịtụgharị uche n’ụzọ ziri ezi na n’ụzọ dị irè site n’Akwụkwọ Nsọ ga-abụ isi ihe dị mkpa na gị ịghọ onye ozizi dị irè.

ỤZỌ ISI ZỤLITE NKÀ AHỤ

  • Na-agụchi Bible anya. Jiri nlezianya na-amụ Ụlọ Nche, na-akwadebekwa nke ọma maka nzukọ ọgbakọ.

  • Jide n’aka na ị maara ihe okwu ndị dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla ị na-eme atụmatụ iji mee ihe pụtara. Jiri nlezianya anya gụọ amaokwu ahụ ka i wee ghọta ihe ọ na-ekwu n’ụzọ ziri ezi.

  • Mee ka ọ bụrụ omume gị ime nnyocha ná mbipụta anyị nke Ndị Kraịst.

IHE OMUME: Tụgharịa uche n’ihe 2 Pita 3:7 pụtara. Ọ̀ na-egosi na a ga-eji ọkụ mebie ụwa? (Mgbe ị na-akọwa ihe “ụwa” pụtara, tụlee ihe “eluigwe” pụtara. Olee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-egosi na a pụrụ iji “ụwa” mee ihe n’ụzọ ihe atụ? Olee ndị ma ọ bụ gịnị n’ezie ka a ga-ebibi, dị ka e kwuru 2Pi 3 n’amaokwu nke 7? Olee otú nke ahụ si kwekọọ n’ihe mere n’oge Noa, bụ́ nke e zoro aka na ya 2Pi 3 n’amaokwu nke 5 na nke 6?)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya