Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/10 p. 1
  • Na-eru n’Obi Ndị Ị Na-akụziri Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eru n’Obi Ndị Ị Na-akụziri Ihe
  • Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ị̀ Na-eji Okwu Chineke Eme Ihe Mgbe Nile?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Jiri “Mma Agha Nke Mmụọ Nsọ” Na-arụ Ọrụ Nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Kwenye
    Ozi Alaeze Anyi—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2010
km 4/10 p. 1

Na-eru n’Obi Ndị Ị Na-akụziri Ihe

1. Gịnị ka iji Okwu Chineke akụzi ihe nke ọma mgbe anyị nọ n’ozi pụtara?

1 Ndị maara ka e si ezi ozi ọma nke ọma, dị ka Pọl onyeozi, maara na ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’ apụtaghị naanị ịgụpụtara mmadụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (2 Tim. 2:15) Mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke, olee otú anyị nwere ike isi kwuo okwu ‘ga-eru ha n’obi’?—Ọrụ 28:23.

2. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka onye anyị na-ezi ihe jirikwuo Okwu Chineke kpọrọ ihe?

2 Gosi Ha Ihe Okwu Chineke Kwuru: Nke mbụ, gosi ha ihe Baịbụl kwuru otú ga-eme ka ha na-akwanyere Baịbụl ùgwù ma ghọta na ihe ndị e dere na ya bụ amamihe si n’aka Chineke. Otú anyị si kwenyesie ike n’Okwu Chineke nwere ike ime ka onye anyị na-agwa okwu na-ege ntị nke ọma mgbe anyị na-agụrụ ya otu ebe na Baịbụl. (Hib. 4:12) Anyị nwere ike ịsị: “Achọpụtala m na ọ bara uru ịmata otú Chineke si ele ihe a mụ na gị na-ekwu anya. Legodị ihe Baịbụl kwuru.” Mgbe ọ bụla o kwere mee, si na Baịbụl gụpụtara onye ị na-ezi ihe ihe Okwu Chineke kwuru.

3. Ị gụchaa otu ebe n’Akwụkwọ Nsọ, gịnị ka i nwere ike ime iji nyere onye ị na-agwa okwu aka ka ọ ghọta ihe ebe ahụ ị gụrụ na-ekwu?

3 Nke abụọ, kọwaa amaokwu Baịbụl ị gụrụ. Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịghọta ihe otu amaokwu Baịbụl a gụụrụ ha pụtara mgbe mbụ ha nụrụ ya. Ọ na-adịkarị mkpa na a ga-akọwa ya akọwa tupu ha aghọta ihe mere e ji gụọ ya. (Luk 24:26, 27) Mee ka isi ihe dị n’ebe ahụ ị gụrụ doo anya. I nwere ike ịjụ onye ahụ ajụjụ iji mara ma ọ̀ ghọtala ihe ebe ahụ na-ekwu nke ọma.—Ilu 20:5; Ọrụ 8:30.

4. Olee ihe ikpeazụ dị mkpa ka anyị mee iji ruo n’obi ndị anyị na-akụziri ihe?

4 Mee Ka O Chebara Ihe Baịbụl Kwuru Echiche: Nke atọ, gbalịsie ike iru n’obi onye nwe ụlọ site n’inyere ya aka ịhụ otú amaokwu Baịbụl ị gụrụ si gbasa ya. Isi otú ahụ nyere ya aka ịghọta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ga-eme ka anyị nwee ike ịgwa ya okwu ndị ga-eru ya n’obi, nke ga-emekwa ka ọ gbanwee otú o si eche echiche. (Ọrụ 17:2-4; 19:8) Dị ka ihe atụ, anyị gụọrọ mmadụ Abụ Ọma 83:18, anyị nwere ike ime ka onye ahụ ghọta otú ịma aha mmadụ si dị mkpa ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ya na onye ọzọ bụrụ enyi. Anyị nweziri ike ịjụ ya, sị, “Ì chere na ịma aha Chineke ga-eme ka obi sikwuo gị ike na Chineke ga-aza ekpere gị?” Isi otú a mee ka onye nwe ụlọ hụ otú amaokwu Baịbụl a gụrụ si gbasa ya ga-eme ka ọ hụ uru Okwu Chineke bara. Ọ bụrụ na anyị esi otú a na-eru n’obi ndị anyị na-akụziri Okwu Chineke, ọ ga-eme ka ndị nwere obi eziokwu bịa fewe ezi Chineke dị ndụ bụ́ Jehova.—Jere. 10:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya