Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/01 p. 1
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Kwenye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Kwenye
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Nkà Ime Ka Mmadụ Kwenye Na-eru n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Na-eru n’Obi Ndị Ị Na-akụziri Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Olee Otú Anyị Kwesịrị Isi “Azaghachi Onye Ọ Bụla”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 2/01 p. 1

Ụzọ Isi Mee Ka Ndị Ọzọ Kwenye

1 A maara Pọl onyeozi dị ka onye ozi na-eme ka mmadụ kwenye. (Ọrụ 19:26) Ọbụna Eze Agrịpa gwara ya, sị: “Ị na-eji okwu nta eme ka m kwenye ịbụ Kristian.” (Ọrụ 26:28) Gịnị mere ka ozi Pọl bụrụ nnọọ nke na-eme ka mmadụ kwenye? Ọ na-esoro ndị mmadụ tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nso n’ụzọ ezi uche dị na ya, na-eme ka arụmụka ya kwekọọ n’ihe ndị na-ege ya ntị maara.—Ọrụ 28:23.

2 N’iṅomi Pọl, mgbe anyị na-eje ozi, ọ dịkwa anyị mkpa ime ka ndị mmadụ kwenye. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iji nghọta eme ihe mgbe anyị na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu nakwa mgbe anyị na-ege ha ntị. (Ilu 16:23) Nzọụkwụ atọ dị mkpa ga-enyere anyị aka imezu nke a.

3 Gee Ntị nke Ọma: Ka onye nke ọzọ na-ekwu okwu, gee ntị iji chọpụta ihe gị na ya kwekọrịtara bụ́ ebe ị ga-agbakwasị ụkwụ. Ọ bụrụ na o welite okwu mgbochi, gbalịa ịghọta ihe kpatara ya. Ọ ga-aba uru ịma kpọmkwem ihe o kweere, ihe mere o ji kwere ya, na ihe mere o ji dị ya ka ọ bụ eziokwu. (Ilu 18:13) Jiri akọ mee ka o kwupụta echiche ya.

4 Jụọ Ajụjụ: Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo na ya kweere n’Atọ n’Ime Otu, ị pụrụ ịjụ, sị: “Ị̀ nọwo na-ekwere Atọ n’Ime Otu kemgbe?” Gaa n’ihu ịjụ, sị: “Ọ̀ dị mgbe i mere ezi nnyocha banyere ihe Bible na-ekwu n’isiokwu a?” Ị pụkwara ịjụ, sị: “Ọ bụrụ na Chineke so n’Atọ n’Ime Otu, ọ̀ bụ na anyị agaghị atụ anya na Bible ga-ekwu otú ahụ n’ụzọ doro anya?” Ihe ndị ọ ga-aza gị ga-enyere gị aka isoro onye ahụ tụgharịa uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu.

5 Jiri Ezi Ntụgharị Uche Mee Ihe: Otu Onyeàmà jụrụ otu nwanyị kweere na Jisọs bụ Chineke ajụjụ, sị: ‘Ọ bụrụ na ị na-achọ inye ihe atụ iji gosi na mmadụ abụọ hà nhata, olee ndị ihe jikọtara n’ezinụlọ ị pụrụ iji maa atụ?’ Ọ zara, sị: “M pụrụ iji ụmụnne abụọ.” Nwanna ahụ kwukwara, sị: “Ikekwe ọbụna ejima yiri nnọọ onwe ha. Ma n’ịkụziri anyị iwere Chineke dị ka Nna ahụ ma ya onwe ya dị ka Ọkpara ahụ, echiche dị aṅaa ka Jisọs na-enye?” Nwanyị ahụ ghọtara ihe a na-ekwu, na otu tọrọ nke ọzọ ma nwee ikike ka ukwuu. (Mat. 20:23; Jọn 14:28; 20:17) E jiriwo nkà nke ime ka mmadụ kwenye ruo uche na obi ya.

6 N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile na-anabata eziokwu ahụ, n’agbanyeghị otú anyị pụrụ isi jiri ezi uche na izi ezi chee ya n’ihu ha. Ma dị ka Pọl, ka anyị dị uchu n’ịchọpụta ndị nwere obi eziokwu n’ókèala anyị, na-eme ka ha kweta ịnakwere ozi Alaeze ahụ.—Ọrụ 19:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya