Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 11/15 p. 13-18
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Nkà Ime Ka E Kweta Na-eme Ihe
  • Nkà Ime Ka E Kweta nke Na-eru n’Obi
  • Jiri Nkà Na-eji Okwu Chineke Eme Ihe
  • Na-ele Ozi Anyị Anya Otú Chineke Si Ele Ya
  • Pọl Ejiri Obi Ike Gbaa Àmà n’Ihu Ndị Oké Ozu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • “Okwu Jehova Nọ Na-agbasa”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 11/15 p. 13-18

Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ

“Agrịpa gwara Pọl, sị: ‘Ná mkpirikpi oge ị ga-eme ka m kweta ịghọ onye Kraịst.’”—ỌRỤ 26:28.

1, 2. Gịnị mere Pọl onyeozi ji pụta n’ihu Gọvanọ Festọs na Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ?

NA SESARIA na 58 O.A., Eze Herọd Agrịpa nke Abụọ na nwanne ya nwanyị bụ́ Benis letara Gọvanọ Pọshiọs Festọs nke Rom. N’ịbụ ndị Gọvanọ Festọs gwara ka ha bịa, ha “ji ngosipụta okomoko dị ukwuu . . . banye n’ụlọ ịnụrụ okwu, tinyere ndị ọchịagha na ndị ikom a ma ama n’obodo ahụ.” A kpọtara Onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi n’ihu ha mgbe Festọs nyere iwu ka e mee otú ahụ. Gịnị mere onye a na-eso ụzọ Jizọs Kraịst ji nọrọ n’ihu oche ikpe nke Gọvanọ Festọs?—Ọrụ 25:13-23.

2 Ihe Festọs gwara ndị ọbịa ya zara ajụjụ ahụ. O kwuru, sị: “Eze Agrịpa na unu nile ndị so anyị nọrọ n’ebe a, unu na-ahụ nwoke a bụ́ onye ìgwè ndị Juu dum rịọworo m arịrịọ banyere ya ma na Jeruselem ma n’ebe a, na-eti mkpu na o kwesịkwaghị ịdị ndụ. Ma achọpụtara m na o meghị ihe ọ bụla nke kwesịrị ọnwụ. Ya mere mgbe nwoke a n’onwe ya rịọrọ ka Onye Ebube ahụ kpegharịa ikpe ya, ekpebiri m iziga ya. Ma banyere ya, ọ dịghị ihe doro anya m nwere idegara Onyenwe m. N’ihi ya akpọtara m ya n’ihu unu, karịsịakwa n’ihu gị, Eze Agrịpa, ka m wee nwee ike inweta ihe m ga-ede mgbe e mesịworo nnyocha ikpe. N’ihi na o yiri m ihe ezi uche na-adịghị na ya iziga onye mkpọrọ ma gharakwa ime ka a mata ebubo ndị a na-ebo ya.”—Ọrụ 25:24-27.

3. N’ihi gịnị ka ndị ndú okpukpe ji boo Pọl ebubo?

3 Okwu Festọs gosiri na e boro Pọl ebubo ụgha nke ịgba ọchịchị mgba okpuru—mpụ nke ntaramahụhụ ya bụ ọnwụ. (Ọrụ 25:11) Otú ọ dị, aka Pọl dị ọcha. Ọ bụ ekworo nke ndị ndú okpukpe nọ na Jeruselem kpatara ebubo ndị ahụ. Ha na-emegide ọrụ Pọl dị ka onye nkwusa Alaeze ma na-ewe oké iwe na ọ na-enyere ndị ọzọ aka ịghọ ụmụazụ Jizọs Kraịst. Ndị agha ji ngwá agha zuru ezu si Jeruselem kpọta Pọl n’obodo nwere ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ Sesaria, bụ́ ebe ọ nọ rịọ ka Siza kpegharịa ikpe ya. A ga-esi ebe ahụ kpọga ya Rom.

4. Ihe dị aṅaa dị ịtụnanya ka Eze Agrịpa kwuru?

4 Weregodị anya nke uche gị hụ Pọl n’obí onye ọchịchị ahụ n’ihu otu ìgwè nke gụnyere onye na-achị akụkụ dị mkpa nke Alaeze Ukwu Rom. Eze Agrịpa lere Pọl anya ma sị: ‘I nwere ike ikwu okwu.’ Ka okwu na-agbọsị Pọl n’ọnụ, ihe dị ịrịba ama mere. Ihe Pọl na-ekwu malitere inwe mmetụta n’ahụ́ eze ahụ. N’ezie, Eze Agrịpa kwuru, sị: “Ná mkpirikpi oge ị ga-eme ka m kweta ịghọ onye Kraịst.”—Ọrụ 26:1-28.

5. N’ihi gịnị ka okwu Pọl gwara Agrịpa ji dị nnọọ irè?

5 Cheedị banyere nke ahụ! N’ihi nkà Pọl ji gọpụrụ onwe ya, ike Okwu Chineke nwere ịbami n’ime mmadụ metụtara onye ọchịchị ahụ. (Ndị Hibru 4:12) Gịnị mere ngọpụ Pọl ji dị irè otú ahụ? Gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta n’aka Pọl bụ́ nke pụrụ inyere anyị aka n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị? Ọ bụrụ na anyị enyochaa ngọpụ ya, isi ihe abụọ pụtara nnọọ ìhè: (1) Pọl kwuru okwu n’ụzọ ga-eme ka e kweta. (2) O ji ihe ọmụma ya nke Okwu Chineke mee ihe n’ụzọ bụ́ ịgba, dị nnọọ ka onye ọrụ aka si eji ngwá ọrụ eme ihe n’ụzọ dị irè.

Jiri Nkà Ime Ka E Kweta Na-eme Ihe

6, 7. (a) Gịnị ka “ime ka e kweta” pụtara dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible? (b) Ọrụ dị aṅaa ka nkà ime ka e kweta na-arụ n’inyere ndị ọzọ aka ịnakwere ozizi Bible?

6 N’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi, e ji okwu Grik maka ime ka e kweta mee ihe ugboro ugboro n’ihe metụtara Pọl. Gịnị jikọrọ nke a na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị?

7 N’asụsụ mbụ e ji mee ihe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, “mee ka e kweta” pụtara “ime ka e kwenye” ma ọ bụ “ime ka e nwee mgbanwe nke uche site ná mmetụta nke ntụgharị uche ma ọ bụ ntụle nke omume,” ka Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere na-ekwu. Inyocha ihe bụ́ isi ọ pụtara na-eme ka anyị ghọtakwuo ya. Ọ na-enye echiche nke ntụkwasị obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na i mee ka mmadụ kweta ịnakwere ozizi Bible, i mere ka ọ tụkwasị gị obi, nke mere ka o kwenye na ozizi ahụ bụ eziokwu. N’ụzọ doro anya, o zughị nanị ịgwa mmadụ ihe Bible na-ekwu iji mee ka o kwere na ya ma mee ihe kwekọrọ na ya. Ị ghaghị ime ka onye na-ege gị ntị kwenye na ihe ị na-agwa ya bụ eziokwu, ma onye ahụ ọ̀ bụ nwatakịrị, onye agbata obi gị, onye ọrụ ibe gị, nwata akwụkwọ ibe, ma ọ bụ onye ikwu gị.—2 Timoti 3:14, 15.

8. Gịnị ka ime ka mmadụ kweta n’eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ gụnyere?

8 Olee otú ị pụrụ isi mee ka mmadụ kweta na ihe ị na-akpọsa site n’Okwu Chineke bụ eziokwu? Site n’iji nkọwa ezi uche dị na ya, arụmụka bụ́ ịgba, na arịrịọ sitere n’obi eme ihe, Pọl gbalịsiri ike ịgbanwe uche ndị ọ gwara okwu.a N’ihi ya, kama ikwusa nanị na ihe bụ eziokwu, i kwesịrị inye ihe àmà ndị na-eju afọ iji kwado okwu gị. Olee otú a pụrụ isi mee nke a? Hụ na okwu gị dabeere kpam kpam n’Okwu Chineke ọ bụghị n’echiche onwe onye. Jirikwa ihe àmà ndị kwekọrọ n’okwu gị kwado ihe ndị i ji obi gị kwuo site n’Akwụkwọ Nsọ. (Ilu 16:23) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i kwuo na ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enweta ndụ na paradaịs elu ala, jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị ka Luk 23:43 ma ọ bụ Aịsaịa 65:21-25 kwado nke ahụ. Olee otú ị pụrụ isi nyekwuo ihe àmà iji kwado isi ihe ndị i kwuru site n’Akwụkwọ Nsọ? Ị pụrụ iji ihe atụ ndị sitere n’ahụmahụ onye na-ege gị ntị nwere mee ihe. Ị pụrụ ichetara ya ihe ụtọ a na-enweta n’ụzọ dị mfe na nke na-adịghị efu ego na-adị n’ikiri ọdịda nke anyanwụ, ịnụ ísì ọma nke okooko osisi, ụtọ nke mkpụrụ osisi, ma ọ bụ ọṅụ nke ikiri ka nne nnụnụ na-enye ụmụ ya nri. Nyere ya aka ịhụ na ihe ụtọ ndị dị otú ahụ bụ ihe àmà na Onye Okike chọrọ ka anyị nụ ụtọ ndụ n’elu ala.—Eklisiastis 3:11, 12.

9. Olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ezi uche n’ọrụ nkwusa anyị?

9 Mgbe ị na-agbalị ime ka mmadụ kweta n’ozizi ụfọdụ nke Bible, kpachara anya ka ịnụ ọkụ n’obi gị ghara ime ka ọ dị ka i nweghị ezi uche, si otú ahụ na-emechi uche na obi nke onye na-ege gị ntị. Akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi na-ekwu okwu ịdọ aka ná ntị a: “Ndị mmadụ adịghị anabatakarị eziokwu nke a na-ejighị akọ kwuo bụ́ nke na-ekpughe ezighị ezi nke nkwenkwe onye ọzọ kwenyesiri ike na ya, ọbụna mgbe e ji ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwadoo ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ nanị na a katọọ ememe ndị a ma ama dị ka ihe ndị ọgọ mmụọ malitere, nke a nwere ike ọ gaghị agbanwe ihe ndị ọzọ na-eche banyere ha. Ịtụgharị uche na-akakarị enwe ihe ịga nke ọma.” N’ihi gịnị ka ị ga-eji gbalịsie ike iji ezi uche na-eme ihe? Akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị: “Ịtụgharị uche na-eme ka e nwee nkwurịta okwu, na-eme ka ndị mmadụ nwee ihe ha ga-echebara echiche ma e mesịa, na-emekwa ka e nwee ohere inwe mkparịta ụka n’ọdịnihu. Ọ pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu n’ime ka e kwenye.”—Ndị Kọlọsi 4:6.

Nkà Ime Ka E Kweta nke Na-eru n’Obi

10. Olee otú Pọl si malite ngọpụ ya n’ihu Agrịpa?

10 Ugbu a, ka anyị lerukwuo okwu Pọl ji gọpụrụ onwe ya n’isi 26 nke Ọrụ anya. Rịba ama otú o si malite okwu ya. Iji malite okwu ya, Pọl chọtara ihe kwesịrị ekwesị ọ ga-aja Agrịpa mma banyere ya ọ bụ ezie na eze ahụ so nwanne ya nwanyị bụ́ Benis na-enwe mmekọrịta na-asọ oyi. Pọl kwuru, sị: “Banyere ihe nile ndị Juu na-ebo m ebubo ha, Eze Agrịpa, ana m agụ onwe m n’onye nwere obi ụtọ na ọ bụ n’ihu gị ka m na-eme ngọpụ m taa, karịsịa ebe ị bụ ọkachamara n’omenala nile nakwa n’arụmarụ ndị dị n’etiti ndị Juu. Ya mere ana m arịọ gị ka i jiri ndidi nụrụ ihe m nwere ikwu.”—Ọrụ 26:2, 3.

11. Olee otú okwu Pọl gwara Agrịpa si gosipụta nkwanye ùgwù, abamuru dịkwa aṅaa si na ya pụta?

11 Ị̀ rịbara ama na Pọl gosiri na ya kwetara na Agrịpa nwere ọkwá dị elu site n’iji utu aha ya, bụ́ Eze, mee ihe? Nke a gosiri nkwanye ùgwù, sitekwa n’iji amamihe họrọ okwu ndị o ji mee ihe, Pọl sọpụụrụ Agrịpa. (1 Pita 2:17) Onyeozi ahụ kweere na Agrịpa bụ ọkachamara n’omenala na n’iwu ndị dị mgbagwoju anya nke ndị Juu ọ na-achị ma kwuo na obi dị ya ụtọ na ya pụrụ ime ngọpụ ya n’ihu onye ọchịchị dị otú ahụ ma nke a na-akọ. Pọl, onye bụ́ Onye Kraịst, emeghị omume dị ka onye chere na ọ karịrị Agrịpa, bụ́ onye na-abụghị Onye Kraịst. (Ndị Filipaị 2:3) Kama nke ahụ, Pọl rịọrọ eze ahụ ka o jiri ndidi nụrụ ihe o nwere ikwu. N’ụzọ dị otú a, Pọl mere ka e nwee ọnọdụ ga-eme ka ọ dịrị Agrịpa nakwa ndị ọzọ na-ege ntị mfe karị ikwere ihe ọ na-aga ikwu. Ọ nọ na-atọ ntọala, na-eme ka e nwee ihe ha kwekọrịtara na ya, bụ́ ebe arụmụka ya ga-ehiwe isi.

12. N’ọrụ nkwusa Alaeze ahụ, olee otú anyị pụrụ isi ruo n’obi ndị na-ege anyị ntị?

12 Dị ka Pọl mgbe ọ nọ n’ihu Agrịpa, site ná mmalite ruo ná ngwụsị nke okwu anyị mgbe anyị na-ezi ozi Alaeze ahụ, ka anyị ruo n’obi ndị na-ege anyị ntị. Anyị pụrụ ime nke a site n’iji obi anyị kwanyere onye ahụ anyị na-ekwusara ozi ọma ùgwù, nakwa site n’igosi ezi mmasị ná nzụlite na echiche ya.—1 Ndị Kọrint 9:20-23.

Jiri Nkà Na-eji Okwu Chineke Eme Ihe

13. Dị ka Pọl, olee otú ị pụrụ isi kpalie obi ndị na-ege gị ntị?

13 Pọl chọrọ ịkpali ndị na-ege ya ntị ime ihe kwekọrọ n’ozi ọma ahụ. (1 Ndị Tesalonaịka 1:5-7) Iji mezuo nke ahụ, o ruru ha n’obi, bụ́ isi iyi nke mkpali. N’ịlaghachi ná ngọpụ Pọl n’ihu Agrịpa, rịba ama ụzọ Pọl si ‘jizie okwu Chineke ejizie’ site n’izo aka n’ihe ndị Mozis na ndị amụma kwuru.—2 Timoti 2:15.

14. Kọwaa otú Pọl si kwuo okwu n’ụzọ ga-eme ka e kweta mgbe ọ nọ n’ihu Agrịpa.

14 Pọl maara na Agrịpa bụ onye Juu n’ọnụ. N’ịdabere n’ihe ọmụma Agrịpa nwere banyere okpukpe ndị Juu, Pọl kwuru na n’ezie na ya ‘adịghị ekwusa ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga ihe Ndị Amụma nakwa Mozis kwuru na ha gaje iwere ọnọdụ’ banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Mezaịa ahụ. (Ọrụ 26:22, 23) N’ịgwa Agrịpa okwu kpọmkwem, Pọl jụrụ, sị: “Eze Agrịpa, ì kwere ná Ndị Amụma?” Agrịpa abanyela ná nsogbu. Ọ bụrụ na o kwuo na ya ekweghị ná ndị amụma, ọ ga-emebi aha ya dị ka onye kweere n’okpukpe ndị Juu. Ma ọ bụrụ na o kwenyere arụmụka Pọl, ọ ga-apụta na ọ na-ekwenyere ndịozi n’ihu ọha, e nwekwara ike ịkpọ ya Onye Kraịst. Pọl ji amamihe zaa ajụjụ ya n’onwe ya, na-asị: “Amaara m na i kwere.” Gịnị ka obi Agrịpa kpaliri ya ịzaghachi? Ọ zara, sị: “Ná mkpirikpi oge ị ga-eme ka m kweta ịghọ onye Kraịst.” (Ọrụ 26:27, 28) Ọ bụ ezie na Agrịpa aghọghị Onye Kraịst, ihe àmà na-egosi na ozi Pọl kpaliri obi ya ruo n’ókè ụfọdụ.—Ndị Hibru 4:12.

15. Olee otú Pọl si nwee ike iguzobe ọgbakọ na Tesalonaịka?

15 Ị̀ rịbara ama na ụzọ Pọl si kwusaa ozi ọma ahụ gụnyere ma nkwuwa okwu ma ikwu okwu n’ụzọ ga-eme ka e kweta? N’ihi na Pọl ji ụzọ ahụ mee ihe ka ọ ‘na-ejizi okwu Chineke ejizi,’ ụfọdụ ndị nụrụ ihe o kwuru sitere n’ịbụ nanị ndị na-ege ntị gaa n’ịghọ ndị kwere ekwe. Nke a bụ ihe mere na Tesalonaịka, bụ́ ebe Pọl chọtara ndị Juu na ndị Jentaịl na-atụ egwu Chineke n’ụlọ nzukọ. Ihe ndekọ dị n’Ọrụ 17:2-4 na-ekwu, sị: “Dị ka Pọl na-emekarị ọ bakwuuru ha, ruokwa ụbọchị izu ike atọ o so ha tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ, na-akọwa ma na-anwapụta site n’izo aka n’ebe dị iche iche na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ na ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie . . . N’ihi ya ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe.” Pọl kwuru okwu n’ụzọ na-eme ka e kweta. O so ha tụgharịa uche, nye nkọwa ma jiri Akwụkwọ Nsọ gosi na Jizọs bụ Mezaịa ahụ e kwere ná nkwa eri ogologo oge. Gịnị si na ya pụta? E guzobere ọgbakọ nke ndị kwere ekwe.

16. Olee otú ị pụrụ isi nwetakwuo obi ụtọ n’ikpọsa Alaeze ahụ?

16 Ị̀ pụrụ imeziwanye nkà gị nke ime ka e kweta mgbe ị na-akọwa Okwu Chineke? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-enwekwu afọ ojuju na obi ụtọ n’ọrụ gị nke ime nkwusa na ịkụziri ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. Nke a abụwo ahụmahụ nke ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ bụ́ ndị tinyere n’ọrụ aro ndị a tụrụ ka a na-eji Bible emekwu ihe n’ọrụ nkwusa ahụ.

17. Iji gosi otú iji Bible eme ihe n’ozi anyị si aba uru, kọọ ahụmahụ i nweworo n’onwe gị ma ọ bụ kọwaa isi ihe dị na nke dị na paragraf a.

17 Dị ka ihe atụ, onye nlekọta na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova dere, sị: “Ọtụtụ ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-ejizi Bible n’aka mgbe ha na-agba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Nke a enyeworo ndị nkwusa aka ịgụrụ ọtụtụ n’ime ndị ha zutere otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. O nyeworo ma ndị nwe ụlọ ma ndị nkwusa aka ịghọta na ozi anyị dabeere na Bible, ọ bụghị na magazin na akwụkwọ dị iche iche.” N’ezie, ma ànyị ga-eji Bible n’aka mgbe anyị na-eme nkwusa ma ọ bụ na anyị agaghị eme otú ahụ na-adabere n’ihe dịgasị iche iche, gụnyere omenala nke ógbè anyị. Otú o sina dị, e kwesịrị ịmara anyị dị ka ndị na-eji nkà eji Okwu Chineke eme ihe n’ụzọ na-eme ka e kweta n’ozi Alaeze ahụ.

Na-ele Ozi Anyị Anya Otú Chineke Si Ele Ya

18, 19. (a) Olee otú Chineke si ele ozi anyị anya, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ile ya anya otú o si ele ya? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma ná nletaghachi? (Lee igbe isiokwu ya bụ “Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ime Nletaghachi,” nke dị na peeji nke 16.)

18 Ụzọ ọzọ isi ruo n’obi ndị na-ege anyị ntị gụnyere ile ozi anyị anya dị ka Chineke si ele ya na inwe ndidi. Uche Chineke bụ ka ụdị mmadụ nile “bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Nke ahụ ọ́ bụghị ọchịchọ anyị? Jehova nwekwara ndidi, ndidi ya na-enyekwa ọtụtụ ndị ohere ichegharị. (2 Pita 3:9) N’ihi ya, mgbe anyị hụrụ onye dị njikere ige ntị n’ozi Alaeze ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ịgaghachi ugboro ugboro iji zụlite mmasị ahụ. Ọ na-ewe oge na ndidi ikiri mkpụrụ nke eziokwu ahụ ka ọ na-eto. (1 Ndị Kọrint 3:6) Igbe dị n’isiokwu a nke isiokwu ya bụ “Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ime Nletaghachi” na-atụ aro otú a pụrụ isi zụlite mmasị dị otú ahụ. Cheta, ndụ ndị mmadụ—nsogbu na ọnọdụ ha—nọgidere na-agbanwe. Ọ pụrụ ịchọ ime mgbalị ọtụtụ ugboro iji chọta ha n’ụlọ, ma o ruru mgbalị e mere maka ya. Anyị chọrọ inye ha ohere ịnụ ozi nzọpụta nke Chineke. N’ihi ya, kpegara Jehova Chineke ekpere maka amamihe iji zụlite nkà gị nke ime ka e kweta n’ọrụ gị nke inyere ndị ọzọ aka ịnakwere ozi Alaeze ahụ.

19 Ozugbo a chọtara onye chọrọ ịnụkwu ozi Alaeze ahụ, gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ime dị ka ndị ọrụ bụ́ Ndị Kraịst? Isiokwu anyị na-esonụ na-enye aka.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere nkà ime ka e kweta, lee ihe ọmụmụ nke 48 na 49 nke akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị mere ka ngọpụ Pọl n’ihu Eze Agrịpa dị irè?

• Olee otú ozi anyị pụrụ isi ruo n’obi?

• Gịnị ga-enyere anyị aka iji Okwu Chineke eme ihe n’ụzọ dị irè iji ruo n’obi?

• Olee otú anyị pụrụ isi na-ele ozi anyị anya dị ka Chineke si ele ya?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ụzọ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ime Nletaghachi

• Gosi ezi mmasị onwe onye n’ebe ndị mmadụ nọ.

• Họrọ otu isiokwu Bible na-adọrọ mmasị ikwurịta.

• Tọọ ntọala maka nleta nke ọ bụla.

• Nọgide na-eche banyere onye ahụ mgbe ị lasịrị.

• Laghachi ngwa ngwa, ikekwe mgbe otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ gasịrị, iji zụlite mmasị ahụ.

• Buru n’uche na nzube gị bụ ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.

• Na-ekpe ekpere ka Jehova mee ka mmasị ahụ na-eto.

[Foto dị na peeji nke 15]

Pọl kwuru okwu n’ụzọ ga-eme ka e kweta mgbe ọ nọ n’ihu Gọvanọ Festọs na Eze Agrịpa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya