Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 9/1 p. 30-31
  • Pọl Ejiri Obi Ike Gbaa Àmà n’Ihu Ndị Oké Ozu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Pọl Ejiri Obi Ike Gbaa Àmà n’Ihu Ndị Oké Ozu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzara Ọnụ Obi Ike nke Pọl
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • “Okwu Jehova Nọ Na-agbasa”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Kpọsaa Alaeze Jehova N’atụghị Egwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 9/1 p. 30-31

Ha Mere Uche Jehova

Pọl Ejiri Obi Ike Gbaa Àmà n’Ihu Ndị Oké Ozu

ỌDỊICHE dị n’etiti ndị ikom abụọ ahụ pụtara nnọọ ìhè. Otu kpu okpueze ebe e kere nke ọzọ agbụ. Otu bụ eze; nke ọzọ, onye mkpọrọ. Ka ọ nọsịrị afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ, Pọl onyeozi guzo ugbu a n’ihu onye na-achị ndị Juu, bụ́ Herọd Agrịpa nke Abụọ. Eze na nwunye ya, bụ́ Banaisi, abịawo “n’oké ebube, batakwa n’ụlọ ọnụnụ okwu, ha na ndị isi ọchịagha, na ndikom a maara aha ha n’obodo ahụ.” (Ọrụ 25:23) Otu akwụkwọ nkà mmụta na-ekwu, sị: “Ikekwe e nwere ọtụtụ narị ndị mmadụ nọ n’ebe ahụ.”

Onye na-achị achị a họpụtara ọhụrụ, bụ́ Festọs, emewo ndokwa maka nzukọ ahụ. Onye na-achị achị bu ya ụzọ, bụ́ Filiks, enwewo afọ ojuju ịhapụ Pọl ka ọ hụsie anya n’ime mkpọrọ. Ma Festọs gbaghara izi ezi nke ebubo ndị e boro Pọl. Leenụ, Pọl siri ọnwụ nke ukwuu na aka ya dị ọcha nke na o kwuworị ka e wega okwu ya n’ihu Siza! Okwu Pọl kpaliri ọchịchọ ịmata ihe nke Eze Agrịpa. “Ọ ga-adị m mma ka mụ onwe m nụrụkwa nwoke ahụ,” ka ọ sịrị. Festọs mere ndokwa ngwa ngwa, ma eleghị anya na-enwe mgbagwoju anya n’ihe eze ga-eche banyere onye mkpọrọ a pụrụ iche.—Ọrụ 24:27–25:22.

N’echi ya, Pọl hụtara onwe ya ka ọ na-eguzo n’ihu ìgwè ndị oké ozu dị ukwuu. “Agụrụ m onwe m n’onye ngọzi dịịrị, na agaje m ịgọpụ onwe m n’ihu gị taa,” ka ọ gwara Agrịpa, “nke ka ebe ị mazuru omenala nile na ajụjụ nile dị n’etiti ndị Juu: n’ihi ya arịọ m gị ka i were ogologo ntachi obi nụrụ m.”—Ọrụ 26:2, 3.

Nzara Ọnụ Obi Ike nke Pọl

Nke mbụ, Pọl gwara Agrịpa banyere oge ndụ ya ndị gara aga dị ka onye na-esogbu ndị Kraịst. ‘Achọrọ m ụzọ ime ka ha kwuluo Chineke,’ ka ọ sịrị. “M wee na-esogbu ha wee ruo obodo dị iche iche dị n’azụ ala anyị.” Pọl gara n’ihu ịkọwa otú o siri hụ ọhụụ dị ịrịba ama ebe Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie jụrụ ya, sị: “Gịnị mere ị na-esogbu m? Ọ dị ike ka ị gbaa ndụdụ e ji achụ ehi ụkwụ.”a—Ọrụ 26:4-14.

Mgbe ahụ Jisọs nyere Sọl ọrụ ịgbara ndị nke mba nile àmà “nke ihe ị hụrụ m n’ime ha, na nke ihe M ga-eme ka ị hụ m anya n’ime ha.” Pọl kọrọ na ya jiri ịdị uchu gbalịsie ike ịrụzu ọrụ e kenyere ya. Ma, “ọ bụ n’ihi ihe ndị a,” ka ọ gwara Agrịpa, “ka ndị Juu jidere m n’ụlọ ukwu Chineke, wee nwaa igbu m.” N’ịkpali mmasị Agrịpa nwere n’okpukpe ndị Juu, Pọl mesiri ike na ịgba àmà ya n’ezie gụnyere ‘ekwughị ihe ọ bụla karịa ihe ndị amụma na Mosis kwuru na ha gaje ime’ banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Mesaịa ahụ.—Ọrụ 26:15-23.

Festọs napụrụ ya okwu n’ọnụ. “Oké mmụta akwụkwọ gị na-eme gị ka ị ghọọ onye anya na-adịghị mma” ka o tiri ná mkpu. Pọl zaghachiri, sị: “Abụghị m onye anya na-adịghị mma, Festọs onye dị oké ebube; ana m ekwuwa okwu nke eziokwu na nke anya udo.” Pọl wee sị Agrịpa: “Eze maara ihe banyere ihe ndị a, onye m na-agwawakwa okwu: n’ihi na e mere ka m kwenye na ọ dịghị ihe ọ bụla n’ihe ndị a e zonarịrị ya; n’ihi na e meghị ihe a ná nkụkụ.”—Ọrụ 26:24-26.

Mgbe ahụ Pọl gwara Agrịpa okwu kpọmkwem. “Eze Agrịpa, ì kweere ndị amụma?” Obi abụọ adịghị ya na ajụjụ ahụ mere ka ahụ ghara iru Agrịpa ala. E kwuwerị, o nwere echiche ọ ga-ejigide, ikwenyekwara Pọl ga-abụ idụnyere ihe Festọs kpọrọ ‘anya adịghị mma,’ úkwù. Ikekwe ka ọ na-achọpụta obi abụọ Agrịpa, Pọl zara ajụjụ ya n’onwe ya. “Amatara m na i kwere,” ka o kwuru. Agrịpa kwuru okwu ugbu a, ma o mere ka okwu ya ghara ikpughe mmetụta ya. “Ị na-eji okwu nta,” ka ọ sịrị Pọl, “eme ka m kwenye ịbụ Kristian.”—Ọrụ 26:27, 28, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.

Pọl ji nkà jiri okwu Agrịpa ahụ na-agaghị n’ihe a chọrọ kpọmkwem kwuo otu isi ihe siri ike. “Ana m ekpere Chineke” ka ọ sịrị, “ka, ma ọ bụ n’iji okwu nta ma ọ bụ n’iji okwu ukwu, ọ bụghị nanị gị onwe gị, kama ọ bụkwa ndị nile na-anụ olu m taa, ga-aghọ aha mmadụ mụ onwe m bụkwa, ma ọ́ bụghị agbụ ndị a.”—Ọrụ 26:29.

Agrịpa na Festọs ahụghị ihe ọ bụla Pọl mere kwesịrị ọnwụ ma ọ bụ ịtụ mkpọrọ. Ma, a pụghị ịkagbu arịrịọ ya iwega okwu ikpe ya n’ihu Siza. Ọ bụ n’ihi nke ahụ ka Agrịpa ji sị Festọs: “A pụrụ ịhapụ nwoke a ka ọ laa, ma ọ bụrụ na ọ kpọkughị Siza.”—Ọrụ 26:30-32.

Ihe Mmụta Nye Anyị

Ụzọ Pọl ji gbaa àmà n’ihụ ndị oké ozu bụ ihe nlereanya dị ịrịba àmà nye anyị. N’ịgwa Eze Agrịpa okwu, Pọl jiri akọ mee ihe. Obi abụọ adịghị ya na ọ maara banyere akụkọ ọjọọ gbara Agrịpa na Banaisi gburugburu. Alụmdi na nwunye ha bụ mmekọahụ n’etiti ndị ikwu, n’ihi na Banaisi bụ n’ezie nwanne Agrịpa nke nwanyị. Ma n’oge a Pọl ahọrọghị izi ozizi banyere omume ọma. Kama nke ahụ, o mesiri isi ihe ndị ya na Agrịpa kwekọrọ ọnụ ike. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na onye Farisii gụrụ akwụkwọ bụ́ Gameliel ziri Pọl ihe, o kwetara na Agrịpa mazuru omenala ndị Juu. (Ọrụ 22:3) N’agbanyeghị ụkpụrụ omume onwe onye nke Agrịpa, Pọl ji nkwanye ùgwù gwa ya okwu n’ihi na Agrịpa nwere ọkwá.—Ndị Rom 13:7.

Ọ bụ ezie na anyị ji obi ike na-agba àmà banyere nkwenkwe anyị, ọ bụghị ihe mgbaru ọsọ anyị ikpughe ma ọ bụ ịkatọ omume adịghị ọcha nke ndị na-aṅa anyị ntị. Kama nke ahụ, iji mee ka ọ dịrị ha mfe ịnara eziokwu, anyị kwesịrị imesi akụkụ dị mma nke ozi ọma ahụ ike, na-ekwusi okwu ike banyere olileanya ndị anyị na ha nwekọrọ ọnụ. Mgbe anyị na-agwa ndị tọrọ anyị ma ọ bụ ndị nwere ikike okwu, anyị kwesịrị ịghọta ọkwá ha. (Levitikọs 19:32) N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ iṅomi Pọl, bụ́ onye sịrị: “Aghọwo m ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ.”—1 Ndị Kọrint 9:22.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Okwu ahụ bụ́ ‘ịgba ndụdụ eji achụ ehi ụkwụ’ na-akọwa omume nke oké ehi merụrụ onwe ya ahụ ebe ọ na-agba ụkwụ n’ígwè dị nkọ nke e mepụtara iji na-achị ma na-eduzi anụmanụ ahụ. N’otu aka ahụ, site n’isogbu ndị Kraịst, nanị ihe Sọl ga-ewetara onwe ya bụ mmerụ ahụ, ebe ọ na-alụso ndị nwere nkwado Chineke ọgụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya