Nye Jehova Otuto Site n’Ọrụ Ọma
1 Mgbe oké ifufe fekwasịrị gị, lee ihe ọma ọ na-abụ inweta ebe mgbaba! Ọ bụrụ na ime ebe ahụ na-ekpotụ ọkụ ma dị nchebe, ọ bụrụkwa na ndị bi n’ebe ahụ nwere omume obiọma, obi na-adị gị ụtọ ịnọ n’ebe ahụ. Ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-eduzi ndị mmadụ gaa n’ebe mgbaba dị otú ahụ pụọ n’usoro ihe nke Setan. Àgwà anyị kwa ụbọchị ọ̀ pụrụ inyere ndị ọzọ aka ịhụ otú ebe a dị nchebe si bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ? Ee, n’ihi na Jisọs sịrị na ndị mmadụ ‘ga-ahụ ọrụ ọma nile anyị, wee too Nna anyị Nke bi n’eluigwe.’—Mat. 5:16.
2 Olee otú anyị pụrụ isi kpaa àgwà ka ọrụ anyị wee dọta ndị ọzọ n’ebe Jehova nọ, nakwa n’ebe nzukọ ya dị? Ọ bụ site n’ikwe ka okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Luk 6:31 na 10:27 na-akpụzi ndụ anyị kwa ụbọchị. Nke a ga-akwali anyị igosi nchegbu ịhụnanya maka ụmụ mmadụ ibe anyị, na-eme ka anyị dị iche n’ụwa a na-adịghị ahụ n’anya, nke na-adịghịkwa eche banyere ndị ọzọ.
3 Otu nwanna nwanyị nke ji ụgbọ epeepe na-eme njem hụrụ otu nwanyị nke ọrịa njem ụgbọ mmiri ji nnọọ nke na o nweghị ike ilekọta obere nwa ya. Nwanna nwanyị ahụ kwuru ka ya lekọta nwatakịrị ahụ. Mgbe nwanyị ahụ jụrụ ya otú ya pụrụ isi kelee ya, nwanna nwanyị ahụ sịrị: ‘Biko gee Ndịàmà Jehova ntị mgbe ọzọ ha kpọtụụrụ gị.’ Nwanyị ahụ mere otú ahụ, ugbu a kwa, ya na di ya bụ Ndịàmà. Ọrụ ọma mere ka ha meghachi omume n’ụzọ dị iche n’ebe ozi Alaeze ahụ dị.
4 O Metụtara Ndụ Anyị Dum: Àgwà anyị na-akpa na gburugburu ebe anyị bi, mgbe anyị nọ n’ebe anyị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’oge ntụrụndụ, na-eme ka ndị ọzọ buru ihe ụfọdụ n’obi banyere anyị na okpukpe anyị. N’ihi ya, ọ dị mma ka anyị jụọ onwe anyị, sị: ‘Olee otú ndị na-ahụ m si ele mụ na ezinụlọ m anya? Ndị agbata obi anyị hà na-ewere ụlọ anyị na mbara èzí anyị dị ka nke na-adị ọcha na nke a na-elekọta anya? Ndị ọrụ na ụmụ akwụkwọ ibe anyị hà na-ele anyị anya dị ka ndị na-abịa n’oge na ndị dị uchu? Ndị ọzọ hà ga-ele ejiji anyị anya dị ka nke kwesịrị ekwesị na nke e kwesịrị ịkwanyere ùgwù?’ Ọrụ ọma anyị pụrụ ime ka ofufe Jehova bụrụ nke na-adọrọ adọrọ karị nye ndị ọzọ.
5 Pita dọrọ aka ná ntị na a ga-akwa ndị Kraịst emo. (1 Pita 4:4) Anyị aghaghị ijide n’aka na àgwà anyị abụghị ihe na-akpata ikwu okwu ọjọọ. (1 Pita 2:12) Ọ bụrụ na ọrụ anyị kwa ụbọchị na-ewetara Chineke anyị na-efe ofufe otuto, mgbe ahụ anyị ga-adị ka oriọna e weliri elu, nke na-adọta ndị ọzọ ịbịa n’ebe ahụ dị nchebe nke Jehova na-enye.—Mat. 5:14-16.