Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-enyere Ụmụnna Aka Ka Ha Na-arụ Ezi Ọrụ
Baịbụl gwara anyị ná Ndị Hibru 10:24 ka anyị ‘na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ Otú anyị si eme ihe na ihe anyị na-ekwu nwere ike ime ka ụmụnna anyị na-arụ ezi ọrụ. Na-akọrọ ha ahụmahụ ndị i nwere. Mee ka ha ghọta na ijere Jehova ozi na-eme gị obi ụtọ. Ma, ọ gaghị adị mma ka i jiri ha na-atụnyere onwe gị ma ọ bụ jiri ha na-atụnyere ụmụnna ndị ọzọ. (Gal. 6:4) Jiri ihe ọ bụla ị na-emete na-agba ụmụnna ume ka ha hụ ibe ha n’anya ma na-arụ ezi ọrụ. Ejila ya eme ka obi na-ama ha ikpe. (Gụọ akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, p. 158, para. 4.) Ọ bụrụ na anyị emee ka ụmụnna anyị hụ ibe ha n’anya, ha ga na-emere ibe ha ihe ọma, na-ezikwa ndị ọzọ ozi ọma.—2 Kọr. 1:24.