Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/97 p. 1
  • Nzukọ Na-akpasu Ọrụ Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Na-akpasu Ọrụ Ọma
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Uru Ọmụmụ Ihe Ndịàmà Jehova Ga-abara Gị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-ezukọ Maka Ife Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Nzukọ Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Na-erite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Maka Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 8/97 p. 1

Nzukọ Na-akpasu Ọrụ Ọma

1 Akụkụ abụọ dị oké mkpa nke ofufe anyị bụ ịga nzukọ ọgbakọ na ikere òkè n’ozi ubi. Ha abụọ na-aga ụkwụ na ụkwụ. Otu na-emetụta ibe ya. Nzukọ ndị Kraịst na-akpasu ọrụ ọma, nke kasị mma n’ime ha bụ ọrụ nkwusa Alaeze na ime ndị na-eso ụzọ. (Hib. 10:24) Ọ bụrụ na anyị akwụsị ịga nzukọ, n’oge na-adịghị anya anyị pụrụ ịkwụsị ime nkwusa n’ihi na a gaghị akpasu anyị ime otú ahụ.

2 Ná nzukọ kwa izu, anyị na-anata ntụziaka ime mmụọ a haziri iji kpalie anyị ime nkwusa. A na-eme mgbe nile ka anyị mara banyere ịdị ngwa nke oge ndị a, na-akwali anyị iwegara ndị ọzọ ozi na-azọpụta ndụ nke Bible. A na-agba anyị ume ma na-ewusi anyị ike ịtachi obi n’ọrụ ime nkwusa. (Mat. 24:13, 14) Site n’iji ohere nke ịza ajụjụ ná nzukọ mee ihe, ọ na-amarakwu anyị ahụ ikwupụta okwukwe anyị n’ihu ndị ọzọ. (Hib. 10:23) Site n’idenye aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, anyị na-anata ọzụzụ iji ghọọ ndị ozi dịkwu irè na ime ka nkà izi ihe anyị ka mma.—2 Tim. 4:2.

3 Otú Nzukọ Ije Ozi Si Akpasu Anyị Ime Nkwusa: A na-agba anyị nile ume ileba anya n’ihe ọmụma dị n’Ozi Alaeze Anyị tupu oge eruo. A na-akụnyezi ihe ọmụma a n’uche anyị ka anyị na-aga Nzukọ Ije Ozi ma na-ahụ ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị e gosiri n’elu ikpo okwu. Mgbe anyị nọ n’ozi ubi, anyị pụrụ iche echiche laa azụ n’Ozi Alaeze Anyị, cheta ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị e gosiri, ma si otú a gbaa àmà dịkwu irè. Nke a abụwo ahụmahụ nke ọtụtụ ndị nkwusa.

4 Dị ka ụzọ iji sochie Nzukọ Ije Ozi, ụfọdụ na-esoro ndị ọzọ yie agba ikerekọ òkè n’ozi. Ndị nkwusa ka na-echeta isi ihe dị iche iche maka ozi ubi, a na-akpalikwa ha ịnwale ha n’ihi na nzukọ ndị a agbawo ha ume ikere òkè n’ọrụ ime nkwusa kwa izu.—Hib. 10:25.

5 E nweghị ihe e ji edochi anya nzukọ ndị Kraịst anyị, ebe anyị na ndị na-efe ofufe ibe anyị na-agbakọta ma bụrụ ndị a kpasuru ịrụ ọrụ ọma. Ọ bụrụ na ozi anyị ga-aga nke ọma, anyị aghaghị ịdị na-agachi nzukọ ọgbakọ anya. Ka anyị gosi ekele maka ndokwa a magburu onwe ya sitere n’aka Jehova site ‘n’ịghara ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.’—Hib. 10:25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya