Na-erite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Maka Ozi Ubi
1. Olee otú nzukọ maka ozi ubi pụrụ isi nyere anyị aka?
1 Nzukọ maka ozi ubi ndị e duziri nke ọma na-eme ka anyị nweta ezi agbamume na ntụziaka ndị bara uru tupu anyị amalite ozi ọma. Ọ na-enyere anyị aka ikere òkè n’ozi ìgwè ka anyị wee nwee ike iso ndị ọzọ rụkọọ ọrụ n’ozi ubi iji na-akwadorịta ma na-enyerịta ibe anyị ọzụzụ. (Ilu 27:17; Ekli. 4:9, 10) Olee ihe ndị anyị pụrụ ime iji rite uru zuru ezu ná nzukọ ndị a?
2. Olee ihe ụfọdụ onye na-eduzi nzukọ maka ozi ubi pụrụ ịtụle?
2 Ihe Onye Na-eduzi Ya Ga-eme: A naghị edepụta kpọmkwem ihe a ga-ekwurịta ná nzukọ maka ozi ubi. N’ihi ya, i kwesịrị ịkwadebe nke ọma ma ọ bụrụ na ọ bụ gị ga-eduzi ya. Ewerela ihe mmụta dịịrị ụbọchị dị ka ihe ị ga na-eji eduzi nzukọ maka ozi ubi, ọ bụ ezie na ị pụrụ ikpebi iwebata ya n’okwu gị ma ọ bụrụ na ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke ụbọchị ahụ kwuru banyere ozi ubi. Chee echiche banyere ihe ga-abara ndị ga-eje ozi ubi n’ụbọchị ahụ uru. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịhọrọ ikwu otú a pụrụ isi zie mmadụ ozi ọma ma ọ bụkwanụ mee ihe ngosi ya. Ị pụrụ ịhọrọ ịtụleghachi otu ihe e kwuru n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, ma ọ bụ n’ihe omume e mere ná Nzukọ Ije Ozi n’oge na-adịbeghị anya. N’oge ọzọ, ị pụrụ ịtụle otú a pụrụ isi merie otu ihe ịma aka e nwere ike izute n’ókèala unu, ma ọ bụkwanụ gị ekwuo otú a pụrụ isi mee ka mmadụ nwee mmasị n’ozi Bible na otú a pụrụ isi malite ịmụrụ ya Bible, karịsịa ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị nkwusa ga-aga nletaghachi. N’agbanyeghị ihe ị họọrọ ikwu banyere ya, hụ na okwu gị kporo ọkụ ma gbaakwa ume.
3. Minit ole ka nzukọ ahụ ga-ewe, oleekwa ihe ndị e kwesịrị ime n’ime oge ahụ?
3 Malite nzukọ ahụ n’oge, ọbụnadị ma a sị na ị maara na ụfọdụ ga-abịa n’azụ oge. Jiri ezi uche hazie ìgwè nke ọ bụla, ma kenye ndị n’enwetabeghị ebe ha ga-arụ, ókèala. Nzukọ ahụ ekwesịghị ịgafe minit 10 ruo 15, o kwesịghịkwa iru otú ahụ ma ọ bụrụ na a na-enwe ya mgbe e mechisịrị nzukọ ọgbakọ. Tupu ị na-emechi nzukọ ahụ, onye ọ bụla kwesịrị ịma onye ya na ya ga-arụ na ebe ha ga-arụ. E kwesịrị iji ekpere mechie nzukọ ahụ.
4. Gịnị ga-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka irite uru zuru ezu ná nzukọ maka ozi ubi?
4 Unu Pụrụ Inye Aka: Dịkwa ka ọ dị ná nzukọ ndị ọzọ ọgbakọ na-enwe, anyị na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù ma na-echebakwara ndị ọzọ echiche ma ọ bụrụ na anyị na-abịa n’ezi oge. Tinye ọnụ ná nzukọ ahụ. Ị pụrụ ịhapụ ka onye na-eduzi ya kenye gị onye gị na ya ga-arụ, ma ọ bụ ị pụrụ ịhọrọ ime ndokwa nke aka gị tupu oge nzukọ ahụ eruo. Ọ bụrụ na ị họọrọ ime ndokwa nke aka gị, gbalịsie ike ịdị ‘na-agbasapụ’ site n’isoro ndị nkwusa dịgasị iche iche na-arụkọ ọrụ, kama iso nanị ezi ndị enyi gị na-arụkọ mgbe ọ bụla. (2 Kọr. 6:11-13) E mechihaala nzukọ ahụ, ahazigharịla otú e si hazie ya, gawakwa ozugbo n’ókèala e kenyere gị ọrụ.
5. Olee ihe mere e ji enwe nzukọ maka ozi ubi?
5 Ihe mere e ji enwe nzukọ maka ozi ubi adịghị iche n’ihe mere e ji enwe nzukọ ọgbakọ. Ihe mere e ji enwe nzukọ ndị a bụ ka anyị wee nwee ike ịdị ‘na-echebara ibe anyị echiche ma kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.’ (Hib. 10:24, 25) Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ịdị na-erite uru ná nzukọ ndị a, nke a ga-enyere anyị aka ịga n’ihu n’ozi anyị—nke bụ́ “ezi ọrụ” n’ezie!