Iduzi Nzukọ Ozi Ubi Otú Ga-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma nke Ọma
1. Gịnị mere anyị ji enwe nzukọ ozi ubi tupu anyị agawa ozi ọma?
1 O nwere ụbọchị iri mmadụ asaa n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs chọrọ ịga ozi ọma. Tupu ha agawa, ha na Jizọs nọkọrọ. (Luk 10:1-11) Ọ gbara ha ume ná nnọkọ ahụ. Otú o si gbaa ha ume bụ na ọ gwara ha na Jehova, bụ́ “Onye nwe owuwe ihe ubi,” ga-anọnyere ha ma nyere ha aka. Ọ gwakwara ha ihe ndị mere ka obi sie ha ike ma zipụ ha “abụọ abụọ.” Taa, ọ bụ otu ihe ahụ mere anyị ji enwe nzukọ ozi ubi tupu anyị agawa ozi ọma. Ná nzukọ ahụ, a na-agba anyị ume ma na-agwa anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka n’ozi anyị. Ọ bụkwa na ya ka a na-anọ ekenye anyị ndị anyị na ha ga-arụ n’ozi ọma.
2. Nkeji ole ka nzukọ ozi ubi kwesịrị ịna-ewe?
2 Ihe niile a na-eme ná nzukọ ozi ubi ugbu a, ma ikenye ụmụnna ndị ha na ha ga-arụ ma ikpe ekpere anaghị akarị nkeji iri na ise. Ma malite n’ọnwa Eprel, nzukọ ozi ubi ga na-ewezi nkeji ise ma ọ bụ isii. Ma, o kwesịghị ịgafe nkeji asaa. O kwesịghịkwa iru nkeji ise ma ọ bụrụ na a ga-enwe ya ozugbo a gbasara ọmụmụ ihe, ebe ọ bụ na ụmụnna ka mụchara ihe. Igbu nzukọ ozi ubi nkenke ga-eme ka ndị niile pụtara ozi ọma nwekwuo oge ha ga-eji kwusaa ozi ọma. Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na e nwere ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị nkwusa maliterela ozi ọma tupu e nwewe nzukọ ozi ubi, oge ha ga-agụpụ agaghị ebu ibu.
3. Olee otú e kwesịrị isi na-enwe nzukọ ozi ubi ka ọ baara ndị niile pụtara ozi ọma uru?
3 E kwesịrị ịna-enwe nzukọ ozi ubi otú ga-abara ndị pụtara ozi ọma uru. Ọ na-akara ọtụtụ ọgbakọ mma ka ìgwè ozi ubi nke ọ bụla na-enwe nzukọ ozi ubi nke ha kama ọgbakọ niile izukọta. Ime otú a nwere ike ime ka ọ dịrị onye ọ bụla mfe ịga ma ebe a na-ezukọ ma ebe ha ga-ekwusa ozi ọma. Ọ ga-adị mfe ikenye onye ọ bụla onye ya na ya ga-arụ, ya adịkwara onye nlekọta ìgwè ozi ubi mfe ileru ndị nọ n’ìgwè ọ na-elekọta anya. Ọ bụ otú ihe si dị n’ọgbakọ ka ndị okenye ga-eji kpebie nke ga-akara ọgbakọ ha mma. Tupu e jiri ekpere na-agaghị egbu oge mechie nzukọ ozi ubi, e kwesịrị ịgwa onye ọ bụla onye ya na ya ga-arụ nakwa ebe ha ga-arụ.
4. Gịnị mere na anyị ekwesịghị iche na ọmụmụ ihe ndị ọzọ ka nzukọ ozi ubi mkpa?
4 Ọ Dị Mkpa Ka Ọmụmụ Ihe Anyị Ndị Ọzọ: Ihe mere e ji enwe nzukọ ozi ubi bụ maka ndị pụtara ozi ọma. N’ihi ya, ọ bụghị ndị nkwusa niile ga-enwe ike ịbịa ya. Ma, ọ pụtaghị na ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ ka ya dị mkpa. Nzukọ ozi ubi so n’onyinye Jehova nyere anyị ka anyị nwee ike ịna-ahụ ibe anyị n’anya ma na-enyere ha aka ime ihe dị mma otú ahụ anyị na-eme n’ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ. (Hib. 10:24, 25) N’ihi ya, onye ọ bụla e nyere iduzi ya kwesịrị ịkwado nke ọma ka ihe ya na ụmụnna ga-atụle nye Jehova otuto, meekwa ka ndị bịara ya mụta ihe. Onye ọ bụla chọrọ iso ọgbakọ aga ozi ọma kwesịrị ịgba mbọ bịa nzukọ ozi ubi ma ọ bụrụ na ọ ga-adịrị ya mfe.
Anyị ekwesịghị iche na ọmụmụ ihe anyị ndị ọzọ ka nzukọ ozi ubi mkpa
5. (a) Olee otú onye nlekọta ije ozi si ahazi nzukọ ozi ubi? (b) Olee otú ụmụnna nwaanyị kwesịrị isi eduzi nzukọ ozi ubi?
5 Otú Onye Ga-eduzi Ya Ga-esi Akwado: Ka mmadụ nwee ike ịkwado ihe omume o nwere n’ọmụmụ ihe nke ọma, a ga-enye ya ya n’ezigbo oge. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị nzukọ ozi ubi. Mgbe ọ bụla ìgwè ozi ubi pụtara ozi ọma, ọ bụ onye nlekọta ìgwè ahụ ma ọ bụ onye na-enyere ya aka kwesịrị iduzi nzukọ ozi ubi. Ma, ọ bụrụ na ọgbakọ niile ga-ezukọ maka nzukọ ozi ubi, onye nlekọta ije ozi ga-ekenye otu nwanna ka o duzie ya. Ihe ndị nlekọta ije ozi ụfọdụ na-eme bụ idepụta aha ụmụnna na ụbọchị ha ga-eduzi nzukọ ozi ubi mapawa na bọọdụ ịma ọkwa. Onye nlekọta ije ozi ekwesịghị ime onye ọ bụla ọ hụrụ, ya enye ya iduzi nzukọ a. Ọ ga-eleru anya ala n’ihi na nzukọ ozi ubi ga-aka abara ụmụnna uru ma ọ bụrụ na onye ga-eduzi ya ma otú e si akụzi ihe, marakwa ahazi ihe. Ọ bụrụ na okenye, ohu na-eje ozi, ma ọ bụ nwanna ọzọ ruru eru anọghị ya iduzi nzukọ a, onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịgwa nwanna nwaanyị merela baptizim ka o duzie ya ma ọ bụrụ na o ruru eru.—Kwuo ihe dị n’isiokwu bụ́ “Otú Nwanna Nwaanyị Ga-esi Eduzi Ya.”
6. Gịnị mere onye ga-eduzi nzukọ ozi ubi kwesịrị iji kwadoo nke ọma?
6 Ọ na-abụ e nye anyị ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ma ọ bụ ná Nzukọ Ije Ozi, anyị akpọ ya mkpa ma kwadoo ya nke ọma. Ọtụtụ n’ime anyị anaghị echere ka anyị ruo ọmụmụ ihe tupu anyị amụwa ya. N’ihi ya, onye e nyere iduzi nzukọ ozi ubi ekwesịghị ịnọ n’ebe ezukọrọ maka ozi ọma mụwa ihe ọ ga-ekwu. Ebe ọ bụ na oge a ga-ejizi na-enwe nzukọ ozi ubi agaghịzi aharu ka nke e ji enwe ya ugbu a, onye ga-eduzi ya kwesịrị ịkwado nke ọma ka onye ọ bụla bịara ya nwee ihe ọ ga-ejide aka mgbe ọ na-aga ozi ọma, e nweekwa ike imechi nzukọ ahụ n’oge. Onye ga-eduzi nzukọ a kwesịkwara ịmata ebe a ga-arụ tupu ụmụnna ezukọọ maka ozi ọma.
7. Olee ihe ndị onye ga-eduzi nzukọ ozi ubi na ụmụnna nwere ike ịtụle?
7 Ihe A Ga-ekwu na Ya: Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi anaghị agwa anyị ihe niile anyị ga-atụle ma anyị nwewe nzukọ ozi ubi n’ihi na otú ihe dị n’otu ókèala nwere ike ịdị iche n’otú ọ dị n’ókèala ọzọ. N’igbe bụ́ “Ihe Ndị E Nwere Ike Ịtụle ná Nzukọ Ozi Ubi,” e gosiri ihe ụfọdụ e nwere ike ịtụle ná nzukọ ozi ubi. Ọtụtụ mgbe, e nwewe nzukọ ozi ubi, a na-eduzi ya otú ndị pụtara ozi ọma ga-etinye ọnụ na ya. Mgbe ụfọdụ, e nwere ike ime ihe ngosi ma ọ bụ gosi vidio dị na jw.org/ig nke nwere ike inyere ụmụnna aka n’ozi ọma. Onye ga-eduzi nzukọ a kwadowe ihe ọ ga-ekwu, o kwesịrị iche echiche ka ọ mara ihe ndị ga-abara ụmụnna uru n’ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Onye ga-eduzi nzukọ ozi ubi kwadowe ihe ọ ga-ekwu, o kwesịrị iche echiche ka ọ mara ihe ndị ga-abara ụmụnna uru n’ozi ọma n’ụbọchị ahụ
8. Mgbe a na-enwe nzukọ ozi ubi na Satọdee na Sọnde, olee ihe nwere ike ịka mma ka a tụlee?
8 Na Satọdee ọ bụla, ọtụtụ ndị nkwusa na-enye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! Ọtụtụ ndị na-apụta ozi ọma na Satọdee anaghị apụta ozi ọma n’etiti izu. N’ihi ya, o nwere ike isiri ha ike icheta ihe ha mụrụ mgbe ha na-enwe Ofufe Ezinụlọ gbasara otú ha nwere ike isi nye ndị mmadụ magazin. Ọ bụ ya mere ọ ga-eji dị mma ka onye ga-eduzi nzukọ ozi ubi tụlee aro ndị a tụrụ n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” nke na-adị n’azụ Ozi Alaeze Anyị. O nwekwara ike ịtụle otú e nwere ike isi jiri ihe a kọrọ n’akụkọ ụwa, ihe mere n’obodo, ma ọ bụ ememme ndị mmadụ na-eme nye mmadụ magazin. Ihe ọzọ o nwere ike ịtụle bụ ihe ụmụnna ga-agwa onye ha nyere magazin ka ha nwee ike ịbịara ya nletaghachi. Ọ bụrụ na e nwere ndị maliterela inye ndị mmadụ magazin a na-enye ndị mmadụ n’ọnwa ahụ, onye na-eduzi nzukọ a nwere ike ịgwa ha ka ha kwuo otú ha si enye ya ndị mmadụ ma ọ bụ kọọ ahụmahụ ha nwere mgbe ha na-enye ya. Onye na-eduzi nzukọ ozi ubi na Sọnde nwekwara ike ime ụdị ihe ahụ mgbe a na-atụle otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ akwụkwọ a na-enye n’ọnwa ahụ. N’oge ọ bụla, anyị nwere ike inye ndị mmadụ akwụkwọ Bible Na-akụzi, Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!, Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi, ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. E nwewe nzukọ ozi ubi, onye na-eduzi ya nwere ike iji nkeji ole na ole kwuo otú a ga-esi enye ndị mmadụ otu n’ime ha.
9. N’ọnwa a na-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ traktị pụrụ iche, olee ihe e nwere ike ịtụle ná nzukọ ozi ubi na Satọdee ma ọ bụ Sọnde?
9 Ọ bụrụ na ọgbakọ na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ na-ekesa traktị pụrụ iche na Satọdee ma ọ bụ na Sọnde, onye ga-eduzi nzukọ ozi ubi nwere ike ikwu otú a ga-esi nye ndị mmadụ magazin n’oge ahụ. O nwekwara ike ịtụle ihe ụmụnna ga-eme ma mmadụ chọọ ka a bịaghachi na nke ya. E nwekwara ike ịkọ ahụmahụ e nwere n’oge a na-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù ma ọ bụ traktị pụrụ iche.
10, 11. Gịnị mere na ịkwado akwado tupu anyị agawa nzukọ ozi ubi ji baa uru?
10 Otú Ndị Nkwusa Ga-esi Akwado: Ndị nkwusa nwere ihe ndị ha ga na-eme ka nzukọ ozi ubi baara mmadụ niile uru. Ọ bụrụ na ha akwadoo ihe ha ga-ekwu n’ozi ọma n’oge ha na-enwe ofufe ezinụlọ ma ọ bụ n’oge ọzọ, ha ga-amụta ihe ndị ga-enyere ha na ụmụnna ndị ọzọ aka n’ozi ọma. Ụzọ ọzọ ha ga-esi akwado bụ iwere akwụkwọ ha ga-eji aga ozi ọma tupu ha agaa n’ebe a ga-enwe nzukọ ozi ubi. Ọ ga-eme ka ha malite ozi ọma ozugbo e nwechara nzukọ ozi ubi.
11 Ndị nkwusa kwesịkwara irute ebe a na-ezukọ tupu nzukọ ozi ubi amalite. O nweghị ọmụmụ ihe anyị anyị kwesịrị ịbịa n’azụ oge. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị abịa nzukọ ozi ubi n’azụ oge, e nwere ọtụtụ ihe anyị nwere ike imeghasị. E nwere ọtụtụ ihe nwanna na-eduzi ya na-eburu n’obi mgbe ọ na-eke ndị pụtara ozi ọma. Ọ bụrụ na ọ bụ mmadụ ole na ole pụtara, o nwere ike ikwu ka ha niile gawa ebe ha rụfọrọ arụfọ. Ọ bụrụkwa na ebe a ga-arụ dị anya, o nwere ike ike ozi ọma ka ndị nwere ụgbọala buru ndị nke na-enweghị. Ọ bụrụ na ebe ha ga-aga ozi ọma bụ ebe ndị omekome na-akpakarị ike, o nwere ike ikekọta ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ma ọ bụkwanụ kee ozi ọma otú anya ụmụ nwoke ga na-eru ebe ụmụ nwaanyị nọ. O nwere ike ikenye ndị ahụ́ na-esichaghị ike ebe ugwu na-adịghị ma ọ bụkwanụ ebe ụlọ elu na-adịghị. E nwere ike ikekọta ndị kwusarala ozi ọma ọtụtụ afọ na ndị nke ka malitere ọhụrụ. Ma ọ bụrụ na ndị nkwusa abịa n’azụ oge, e nwere ike ibido n’isi megharịwa ihe a niile a hazicharala. Ọ bụ eziokwu na ihe nwere ike ịdapụta mgbe ụfọdụ, anyị abịa nzukọ ozi ubi n’azụ oge, ma ọ bụrụ na anyị na-abịakarị ya n’azụ oge, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ma ihe mere o ji dị otú ahụ ọ̀ bụ na anyị ejighị nzukọ ozi ubi kpọrọ ihe ka ọ̀ bụ na anyị anaghị ebido n’oge mewe ihe anyị kwesịrị ime tupu anyị agawa ozi ọma.
12. Ọ bụrụ na ị na-eji aka gị ahọrọ ndị gị na ha ga-arụ, gịnị ka i kwesịrị iburu n’obi?
12 Tupu a malite nzukọ ozi ubi, onye nkwusa nwere ike ịhọrọ onye ya na ya ga-arụ. E nwekwara ike ikenye ya onye ya na ya ga-arụ. Ọ bụrụ na ị na-eji aka gị ahọrọ ndị gị na ha ga-arụ, gbalịa ka ọ ghara ịbụ naanị otu ndị. (2 Kọr. 6:11-13) Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịhọrọ onye nkwusa ọhụrụ ka gị na ya rụọ ka i nyere ya aka ịmụtakwu otú ọ ga-esi na-ezi ozi ọma. (1 Kọr. 10:24; 1 Tim. 4:13, 15) E kewe ozi ọma, gee ntị nke ọma ka ị nụ ihe e kwuru gbasara otú a ga-esi arụ ebe unu na-aga. E mechaa nzukọ ozi ubi, e kwesịghị ịgbanwe ihe nwanna duziri nzukọ ahụ hazicharala, gawanụ ebe e kenyere unu ozugbo.
13. Ọ bụrụ na anyị niile agbaa mbọ mee òkè anyị, olee otú nzukọ ozi ubi ga-esi baara anyị uru?
13 Mmadụ iri asaa ahụ Jizọs zipụrụ ka ha gaa zie ozi ọma ‘ji ọṅụ lọta.’ (Luk 10:17) O doro anya na otú ahụ ha na Jizọs si nọkọọ tupu ha agawa nyeere ha ezigbo aka n’ozi ha. Taakwa, nzukọ ozi ubi nwere ike ịbara anyị uru otú ahụ o si baara ha. Ọ bụrụ na anyị niile agbaa mbọ mee òkè anyị, nzukọ ozi ubi ga-agba anyị niile ume, nyekwara anyị aka n’ozi anyị. Anyị ga-enwekwa ike ‘ikwusa ozi ọma alaeze Chineke ka ọ bụrụ àmà nye mba niile.’—Mat. 24:14.