Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/01 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iduzi Nzukọ Ozi Ubi Otú Ga-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Na-erite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Maka Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Nzukọ Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • A Gaghịzi Na-atụle Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị ná Nzukọ Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 9/01 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Ihe ọmụma dị aṅaa ka e kwesịrị ịtụle ná nzukọ ije ozi ubi?

Nzube e ji enwe nzukọ ije ozi ubi bụ iji nyere anyị aka ilekwasị anya n’ọrụ ga-esochi—ije ozi. N’ihi ya, onye nduzi ya kwesịrị ịkwadebe nke ọma ma dị njikere iwepụta ihe ndị na-agba ume, ndị doro anya, ma dị irè. Ọ bụrụ na ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ na-ekwu kpọmkwem banyere ọrụ ime nkwusa, a pụrụ ịgụ ma tụlee ya n’ụzọ dị nkenke. Otú ọ dị, nzukọ ahụ kwesịrị ilekwasị anya karịsịa n’ọrụ ahụ e ji n’aka, inyere ndị nile na-arụ ọrụ ịgba àmà aka ịbụ ndị a kwadebere nke ọma karị iji jezuo ozi ahụ n’ụbọchị ahụ.—2 Tim. 4:5.

A pụrụ ịtụle isi ihe ndị dabara adaba sitere n’Ozi Alaeze Anyị iji mee ka mmadụ nile mara akwụkwọ ndị e eji eje ozi n’oge ahụ na ụzọ isi nyefee ha. N’Ụbọchị Magazin, a pụrụ ime ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ site ‘n’Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ.’ Maka mkpọsa ndị ọzọ, a pụrụ ịkọwapụta otu okwu mmeghe ma ọ bụ abụọ ndị dị n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible ndị kwesịrị ekwesị n’ókèala unu. A pụrụ ịtụle ma ọ bụ mee ihe ngosi nke otu akụkụ nke ozi ahụ, dị ka ụzọ isi jiri Bible mee ihe n’ọnụ ụzọ, ụzọ isi zaghachi n’ihe pụrụ igbochi mkparịta ụka, otú e si ekwe nkwa iduzi ọmụmụ Bible, ma ọ bụ ụzọ e si esochi mmasị.

Nzukọ maka ije ozi ekwesịghị ịgafe minit 10 ruo 15, bụ́ nke na-agụnye ịhazi ìgwè dị iche iche, ikenye ha ókèala, na ikpe ekpere. Mgbe e mechisịrị, mmadụ nile pụtaranụ kwesịrị ịmara onye e kenyere ha na ebe ha na-aga ịrụ, ha kwesịkwara ịgawa n’ókèala ahụ n’egbughị oge. N’ihi ịdị nkenke nke nzukọ ahụ, ọ dị mkpa na mmadụ nile bịara n’oge. Mgbe nzukọ maka ije ozi na-esochi nzukọ ọgbakọ, dị ka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, o kwesịrị ịdị mkpirikpi karị. Ọ dịghị mkpa ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ ebe ọ bụ na e buruwo ụzọ nwee ntụle mara mma nke ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ.

E kwesịrị ikenye tupu oge eruo ụmụnna nwoke ruru eru, ndị e mere baptism, iduzi nzukọ ije ozi ubi nke ọ bụla. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha nọ ya maka iduzi n’otu ụbọchị kpọmkwem, ndị okenye kwesịrị ịhọpụta ụmụnna nwanyị e mere baptism ndị pụrụ ime otú ahụ mgbe ọ dị mkpa. Ka nwanna nwanyị ahụ nọ ala, ọ pụrụ ịmalite mkparịta ụka ìgwè nke ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ ma ọ bụ isi ihe ndị ọzọ metụtara ozi ubi, na-eme ka okwu ya dị nkenke. O kwesịrị ikpuchi isi ya.

Nzukọ ije ozi ubi bụ ohere ndị magburu onwe ha anyị nwere ịbụ ndị a gbara ume na ndị a kwadebere ikere òkè n’ozi. Ruo n’ókè onye nduzi ahụ kwadeberuru nke ọma, otú a ka mmadụ nile ga-eriteru uru.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya