A Gaghịzi Na-atụle Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị ná Nzukọ Ozi Ubi
Ná mbụ, ọ na-abụ, e duziwe nzukọ ozi ubi, e nwere ike tụlee ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma ọ bụrụ na ihe e kwuru na ya bụ ihe gbasara ozi ọma. A gbanweela ya. A gaghịzi na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ná nzukọ ozi ubi. Dị ka a na-emebu, ebe onye na-eduzi nzukọ ozi ubi nwere ike isi nweta ihe ọ ga-eji eduzi ya bụ na Baịbụl, n’Ozi Alaeze Anyị, akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ kwuru gbasara ozi ọma. Onye ọ bụla e kenyere iduzi nzukọ ozi ubi n’ụbọchị ọ bụla kwesịrị ịtụle ihe ga-enyere ndị ga-aga ozi ọma n’ụbọchị ahụ aka. Oge e ji eduzi nzukọ ozi ubi nwere ike iru nkeji iri, ma o kwesịghị ịgafe nkeji iri na ise dị ka e si emebu ya, o kwesịghịkwa iru otú ahụ ma ọ bụrụ na a ga-enwe ya mgbe a gbasachara ọmụmụ ihe.