Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Febụwarị 28, 2011. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a, bụ́ nke ga-ewe nkeji iri abụọ. Ihe ndị a ga-atụle ga-abụ ihe ndị a mụrụ n’izu Janụwarị 3 ruo Febụwarị 28, 2011.
1. Olee ọrụ Hezekaya bidoro ịrụ mgbe ọ malitere ọchịchị, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya taa? (2 Ihe 29:16-18) [w09 6/15 p. 9 para. 13]
2. Olee otú 2 Ihe E Mere 36:21 si gosi na amụma e buru na Jeremaya 25:8-11 mezuru emezu? [w06 11/15 p. 32 para. 1-4]
3. Olee otú Ezra 3:1-6 si gosi na ọ bụ kpọmkwem afọ iri asaa ka Jeruselem tọgbọọrọ n’efu otú ahụ Baịbụl bu ụzọ kwuo? [w06 1/15 p. 19 para. 2]
4. Gịnị mere o ji ju Ezra anya mgbe ọ nụrụ na ndị Izrel na ndị ala ahụ na-alụrịta di na nwunye? (Ezra 9:1-3) [w06 1/15 p. 20 para. 1]
5. Olee ndị bụ “ndị ukwu” e kwuru okwu ha na Nehemaya 3:5, oleekwa àgwà ha ndị anyị na-ekwesịghị ịkpa? [w06 2/1 p. 10 para. 1; w86 6/1 p. 21 para. 9]
6. Olee otú Nehemaya, bụ́ Gọvanọ, si bụrụ onye ndị nlekọta ọgbakọ kwesịrị iṅomi? (Nehe. 5:14-19) [w06 2/1 p. 10, para. 4]
7. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ileghara “ụlọ Chineke anyị” anya otú ahụ ụmụ Izrel nọ n’oge Nehemaya na-elegharaghị ụlọ Chineke anya? (Nehe. 10:32-39) [w98 10/15 p. 21 para. 12]
8. Olee ajụjụ ndị anyị nwere ike ịjụ onwe anyị ma anyị tụgharịa uche n’àgwà Nehemaya? (Nehe. 13:31) [w96 9/15 p. 16 para. 3]
9. Esta na Eze Ahazuirọs hà kwara iko? (Esta 2:14-17) [w91 1/1 p. 31 para. 6]
10. Gịnị mere Mọdekaị ji jụ ịkpọrọ Heman isiala? (Esta 3:2, 4) [w06 3/1 p. 9 para. 4]