Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Febụwarị 28
IZU NA-AMALITE NA FEBỤWARỊ 28
Abụ nke 5 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 18 ¶10-18 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Esta 1-5 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Zie Ndị Mmadụ Ozi Na-ewuli Elu. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 202. Jiri akwụkwọ a ga-enyefe na Mach mee ihe ngosi otú e nwere ike isi mee ihe e kwuru na paragraf nke atọ.
Nkeji 10: Rite Uru n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke ga-esi n’okwu mmalite dị n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ—2011. Gbaa mmadụ niile ume ka ha na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị n’ụbọchị ọ bụla. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo oge ha ji atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị nakwa uru ndị ha riterela. Jiri nkeji ole na ole kọwaa ihe e kwuru gbasara isiokwu dịịrị afọ 2011. Tụlee isiokwu bụ́ “A Gaghịzi Na-atụle Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị ná Nzukọ Ozi Ubi.”
Nkeji 10: Jikere Inyefe Magazin n’Ọnwa Mach. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo ihe ndị dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ n’ime ha ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ ma ha chọọ iji otu n’ime isiokwu ahụ nyefee magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ onye ahụ. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.
Abụ nke 33 na Ekpere