Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 30
IZU NA-AMALITE NA MACH 30
Abụ nke 57 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 22 ¶9-17 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Samuel 14-15 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Samuel 14:36-45 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú E Si Amụta Asụsụ ahụ Dị Ọcha? Oleekwa Otú E Si Asụ Ya?—Zef. 3:9 (Nkeji 5)
Nke 3: Otú Amụma Baịbụl Buru Banyere Oge Ikpeazụ Si Na-emezu—igw p. 13 ¶1 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: “Dị Njikere Ịrụ Ezi Ọrụ Ọ Bụla.”—Taị. 3:1.
Nkeji 15: Fim Ndị Ọzọ Anyị Ga Na-eji Ezi Ozi Ọma Dị na jw.org/ig. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ kpọnye fim bụ́ Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl? E lechaa ya, unu atụlee otú e nwere ike isi jiri ya zie ndị mmadụ ozi ọma. A tụlechaa ya, a kpọnye fim bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? ma tụlee ya otú a tụlere nke mbụ. A ga-eme ihe ngosi.
Nkeji 15: “Jiri Ihe Dị n’Akwụkwọ Bụ́ Ihe Baịbụl Na-ekwu Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma.” Ajụjụ na azịza. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi jiri akwụkwọ bụ́ Ihe Baịbụl Na-ekwu na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. A ga-eme ihe ngosi.
Abụ nke 114 na Ekpere