Jiri Ihe Dị n’Akwụkwọ Bụ́ Ihe Baịbụl Na-ekwu Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma
1. Olee akwụkwọ ọhụrụ ga-enyere anyị aka izi ndị mmadụ ozi ọma?
1 E nwere akwụkwọ nta e wepụtaara anyị n’oge na-adịbeghị anya. Aha ya bụ Ihe Baịbụl Na-ekwu. Olee otú anyị ga-esi jiri ya na-akwado ihe anyị ga-agwa ndị mmadụ ma anyị gaa ozi ọma? A haziri akwụkwọ a otú e si hazie akwụkwọ bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible. E nwere isiokwu dị iche iche na ya, nweekwa amaokwu Baịbụl ndị e ji kọwaa ha. N’ihi ya, ọ ga-enyere anyị ezigbo aka izi ndị mmadụ ozi ọma.
2. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ bụ́ Ihe Baịbụl Na-ekwu zie ndị mmadụ ozi ọma?
2 Ị chọọ iji ajụjụ nke asatọ zie mmadụ ozi ọma, i nwere ike ịgwa onye ahụ, sị: “Taa, ọtụtụ ndị na-ajụ, sị, ‘Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata?’ [N’ebe ụfọdụ, ọ na-akacha mma ka anyị gosi onye anyị gara na nke ya ajụjụ ahụ.] Gịnị ka gịnwa chere? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl zara ajụjụ a nke ọma.” Sapee Baịbụl gị gụọ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Baịbụl dị n’ebe ahụ ma kọwaa ya. Ọ bụrụ na o nwere mmasị n’ihe ị na-agwa ya, i nwere ike igosi ya ajụjụ iri abụọ ahụ dị na peeji nke mbụ n’akwụkwọ ahụ ma gwa ya ka ọ họrọ nke ọ ga-achọ ka unu leba anya mgbe ọzọ ị ga-abịa. I nwekwara ike inye ya akwụkwọ anyị na ndị mmadụ na-eji amụ Baịbụl nke kọwakwuru isiokwu ahụ gị na ya tụlere.
3. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ bụ́ Ihe Baịbụl Na-ekwu zie ndị dị ka ndị Alakụba ozi ọma?
3 Anyị gaa ozi ọma hụ ndị dị ka ndị Alakụba, anyị nwere ike iji ihe dị n’isiokwu nke anọ, nke iri na atọ ruo na nke iri na asaa zie ha ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ị chọọ iji ihe dị n’isiokwu nke iri na asaa zie mmadụ ozi ọma, i nwere ike ịsị ya: “Anyị bịara ka anyị na gị kparịta ihe ụfọdụ ga-enyere ezinụlọ aka. E nweghị ezinụlọ na-anaghị enwe nghọtahie mgbe ụfọdụ. Ì chere na ọ bụ eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] E nwere ndụmọdụ na-enyere ọtụtụ ndị di na nwunye aka. Ndụmọdụ ahụ bụ na nwaanyị kwesịrị ịna-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu. [Agwala ya na ihe a i kwuru si ná Ndị Efesọs 5:33. Ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị ka gị na ya na-ekwu, gwa ya ihe e kwuru ná Ndị Efesọs 5:28.] Ọ bụrụ na di na nwunye emee ihe a, ì chere na ọ ga-enyere ha aka?”
4. I zichaa ndị dị ka ndị Alakụba ozi ọma, olee ihe i nwere ike ime?
4 I zichaa onye ahụ ozi ọma, gwa ya na ị ga-abịa ọzọ. I nwere ike ikpebi na unu ga-eleba anya n’amaokwu Baịbụl ọzọ dị n’isiokwu ahụ. Ka oge na-aga, gwa ya na ihe ndị ahụ ị na-akọrọ ya si na Baịbụl. Nye ya akwụkwọ anyị ị ma na ọ ga-achọ ịgụ. Ma, ihe ị ga-eji mara nke ị ga-enye ya bụ ihe ndị unu kwurịtara n’oge gara aga nakwa otú o si were Baịbụl.—Gụọ ihe ntinye dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Disemba 2013.