Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ịkwadebe Okwu Mmeghe
Ihe Mere O ji Dị Mkpa: Ọ bụrụ na ihe mbụ anyị gwara onye anyị gara na nke ya amasịghị ya, o nwere ike ime ka onye ahụ ghara ige anyị ntị. Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị nkwusa ji echebara ihe mbụ ha ga-ekwu n’ozi ọma echiche nke ọma. N’Ozi Alaeze Anyị nakwa n’akwụkwọ bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, e nwere ihe ndị e dere anyị nwere ike ikwu ma anyị gaa ozi ọma. Ma, a naghị ederucha ha niile n’isi ka anyị nwee ike iji aka anyị tinye ihe ndị ọzọ ga-adaba adaba. Ọ bụrụgodị na e deruru ihe ahụ n’isi, anyị nwere ike ikwugharị ya otú ọ ga-amasị onye anyị na-ezi ozi ọma ma ọ bụ anyị ejiri aka anyị kwadebe ihe anyị ga-ekwu. Ọ pụtara na anyị ga-emekwu nke ọma n’ozi ọma ma ọ bụrụ na anyị asaa anya ná mmiri kwadebe ihe mbụ anyị ga-ekwu, ka ọ ghara ịbụ anyị hụ mmadụ anyị agwa ya ihe ọ bụla gbatara anyị n’obi.—Ilu 15:28.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Jiri oge unu ji enwe ofufe ezinụlọ kwadebe ihe mbụ i nwere ike ikwu, mụgharịakwa ya.
Ị gaa ozi ọma, gwa onye gị na ya na-arụ ihe ị chọrọ ịgwa onye ị ga-ezi ozi ọma. (Ilu 27:17) Ị hụ na ihe mbụ ị na-agwa ndị mmadụ anaghị amasị ha, gbalịa chepụta ihe ọzọ.