Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 19
IZU NA-AMALITE NA MEE 19
Abụ nke 131 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 7 ¶9-17 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 30-33 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọpụpụ 32:1-14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Okpukpe Niile Hà Dị Mma?—td 31B (Nkeji 5)
Nke 3: Ị̀ Na-echeta Ịsị I Meela?—lr isi nke 18 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ihe Mere Anyị Ji Bụrụ Ndị Ozi. Okwu. O si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 77 ruo na peeji nke 78, paragraf nke 2. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe mere ha ji enwe obi ụtọ ma ha gaa ozi ọma.
Nkeji 10: Ì Nwere Ike Ịsụ Ụzọ Inyeaka n’Oge Unu Nọ Ezumike? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Na nkenke, kwuo ụdị onye nwere ike ịbụ ọsụ ụzọ inyeaka dị ka e si kọwaa ya na peeji nke 113, paragraf nke 1 n’akwụkwọ Ndị A Haziri. Gwa ụfọdụ ndị na-arụ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ndị sụrụla ụzọ inyeaka mgbe ha nọ ezumike ka ha kọọ ihe mere ha obi ụtọ n’oge ahụ. Gbaa mmadụ niile ume ka ha chee echiche mara ma hà ga-asụ ụzọ inyeaka n’oge ezumike.
Nkeji 10: “Na-abịa n’Oge.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlewe paragraf nke 4, jụọ ụmụnna ihe ndị na-enyere ha aka ịna-abịa n’oge.
Abụ 44 na Ekpere