Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb21 Nọvemba p. 7
  • Ihe Ndị Ga-eme Ka Nzukọ Ozi Ubi Baa Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Ga-eme Ka Nzukọ Ozi Ubi Baa Uru
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iduzi Nzukọ Ozi Ubi Otú Ga-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Na-erite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Maka Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Nzukọ Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
mwb21 Nọvemba p. 7
Foto ndị na-egosi: 1. Ebe otu nwanna nwoke na-akwadebe iduzi nzukọ ozi ubi. Foto ndị ọzọ dị ebe ahụ na-egosi ebe e sere traktị dị iche iche, ebe a na-akọ akụkọ ụwa na tiivi, na onye nwe ụlọ na-achọghị ịnara traktị. 2. Ebe nwanna nwoke ahụ na-eduzi nzukọ ozi ubi n’echi ya. O ji traktị na Baịbụl n’aka.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ihe Ndị Ga-eme Ka Nzukọ Ozi Ubi Baa Uru

Ọ bụ Jehova haziri ka anyị na-enwe nzukọ ozi ubi otú ahụ ọ haziri ka anyị na-enwe ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ọ haziri ya iji mee ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ. (Hib. 10:​24, 25) O kwesịrị ịna-ewe nkeji ise ruo nkeji asaa. Ịhazi ndị pụtara ozi ọma, ikenye ìgwè nke ọ bụla ebe ha ga-arụ, na ikpe ekpere socha n’ihe a ga-eme n’ime oge ahụ. (Ọ bụrụ na a ga-enwe nzukọ ozi ubi ozugbo a gbasara ọmụmụ ihe, o kwesịdịrị ịdị mkpụmkpụ karịa.) Onye ga-eduzi ya kwesịrị ikwu ihe ndị ga-abara ndị pụtara ozi ọma n’ụbọchị ahụ uru. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọtụtụ n’ime ndị pụtara ozi ọma na Satọdee agabeghị ozi ọma kemgbe izu ahụ, i nwere ike ikwu naanị banyere otú e si amalite mkparịta ụka. Olee isiokwu ndị ọzọ dị mma e nwere ike iji mee nzukọ ozi ubi?

  • Ihe gị na mmadụ nwere ike ikwurịta nke na-agba n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ

  • Otú e si eji ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya ma ọ bụ akụkọ gbara n’akwụkwọ akụkọ amalite mkparịta ụka

  • Ihe anyị ga-ekwu ma onye nwe ụlọ kwuo ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị

  • Ihe anyị ga-agwa onye na-ekweghị na Chineke, onye kweere n’evolushọn, onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bụ onye na-ekpe okpukpe a na-amachaghị n’ebe anyị bi

  • Otú anyị ga-esi eji ihe dị na jw.org, ihe dị na JW Library®, ma ọ bụ ihe dị na Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ezi ozi ọma

  • Otú anyị ga-esi eji otu ihe dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe ezi ozi ọma

  • Ikwu banyere otu n’ime ụzọ ndị anyị si ekwusa ozi ọma, dị ka iji ekwentị ma ọ bụ akwụkwọ ozi ezi ozi ọma, ikwusa ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo, ime nletaghachi ma ọ bụkwanụ iduzi ọmụmụ Baịbụl

  • Ichetara ụmụnna ihe ndị anyị kwesịrị ịna-eme n’ozi ọma, dị ka ịdị njikere ịgbanwe ihe ụfọdụ n’ozi anyị n’ihi ọnọdụ, izere nsogbu, ịkpa àgwà ọma, ile ndị mmadụ anya otú kwesịrị ekwesị, ma ọ bụkwanụ ihe ọzọ yiri ihe ndị a

  • Ịtụle otu ihe ọmụmụ si na broshọ Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe ma ọ bụkwanụ ile otu vidio ya

  • Otú mmadụ nwere ike isi gbaa onye ya na ya na-arụ n’ozi ọma ume ma ọ bụ nyere ya aka

  • Ịtụle otu amaokwu Baịbụl nke ga-enye aka n’ozi ọma ma ọ bụkwanụ ịkọ otu akụkọ na-agba ume gbasara ozi ọma

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya