Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Oct. 15
“Ebe ọ bụ na Chineke bi n’eluigwe, ụfọdụ na-ekwu na ọ gatụghị ekwe omume ịmata Ya. Ì chetụla otú ahụ n’onwe gị? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Jọn 17:3.] Magazin a na-akọwa otú anyị pụrụ isi nweta ihe ọmụma banyere Chineke.”
Ụlọ Nche Nov. 1
“A bịa n’okwu banyere otú a ga-esi zụlite ụmụaka taa, ihe ụfọdụ na-ekwu dị iche n’ihe ibe ha na-ekwu. Ì chere na ndị nne na nna ga-enwetali ndụmọdụ ndị bara uru n’okwu a? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, ị gụọ Abụ Ọma 32:8.] Na magazin a, e depụtara ntụziaka ndị bara uru sitere na Bible banyere otú a ga-esi azụlite ụmụaka.”
Teta! Oct.-Dec.
“Ì chere na anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ? [Chere ka ọ zaa.] Legodị nkwa Jizọs kwere ebe a maka ndị nwụrụ anwụ. [Gụọ Jọn 5:28, 29.] Isiokwu a kọwara ihe Bible kwuru na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ.” Gosi ya isiokwu ahụ dị na peeji nke 26.
“Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ nile na-enwe mmasị ikiri televishọn. Ọ̀ dị gị ka anyị kwesịrị ịdị na-ahọ ihe anyị na-ekiri na ya ahọ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gị agụọ Ilu 13:20.] Magazin a kwuru mmetụta TV na-enwe n’ebe anyị nọ, kwuo kwa ụzọ anyị pụrụ isi na-achịkwa otú anyị si ekiri TV.”