Ihe Ndị A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Oct. 15
“Ụfọdụ ndị chere na ebe ọ bụ na anyị amaghị ihe ga-eme echi, na ọ ka mma ka anyị biwe ndụ otú sọrọ anyị taa. Olee ihe i chere banyere ya? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe magburu onwe ya Jizọs kwuru n’ebe a. [Gụọ Matiu 6:34.] Magazin a kọwara otú anyị nwere ike isi mee atụmatụ maka ọdịnihu ma ghara ịdị na-echegbu onwe anyị maka ihe echi ga-abụ.”
Ụlọ Nche Nov. 1
“Ì chere na ụwa ga-aka mma ma ọ bụrụ na ndị mmadụ adịkwuo umeala n’obi? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Jizọs kwuru banyere ịdị umeala n’obi. [Gụọ Matiu 23:12.] Magazin a kọwara uru ọ bara mmadụ ịdị umeala n’obi, ọbụna n’ụwa a onye ọ bụla chọrọ ịka ibe ya.”
Teta! Oct.–Dec.
“Olee ebe i chere ndị nne na nna nwere ike isi nweta ndụmọdụ ga-enyere ha aka ịzụ ụmụ ha? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Bible kwuru n’ebe a. [Gụọ 2 Timoti 3:16.] Magazin a na-ekwu otú Bible nwere ike isi nyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha ka ha nwee obi ụtọ.”
Ya bụrụ onye na-eto eto ka ị na-agwa okwu, i nwere ike ịsị: “E jirila ụfọdụ ndị na-eto eto ibe gị gbaa asịrị. Mmadụ ò jitụla gị gbaa asịrị? [Chere ka ọ zaa.] Bible na-enye anyị ezigbo ndụmọdụ banyere ihe anyị ga-eme ma e jiri anyị gbaa asịrị. Ọ na-agwakwa anyị otú anyị onwe anyị ga-esi zere iji ndị ọzọ agba asịrị.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke iri na abụọ, gụọkwa otu amaokwu Bible dị n’isiokwu ahụ.