Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Oct. 15
“Olee otú ị ga-esi kọwaara ụmụaka ma ọ bụ ndị ọzọ ihe mere ọtụtụ ihe ọjọọ ji na-eme taa? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-aza ajụjụ bụ́, ‘Onye Na-akpata Ihe Ọjọọ Nile?’ [Gụọ 1 Jọn 5:19.] Mbipụta Ụlọ Nche a ga-enyere gị aka ịghọta onye bụ ajọ onye ahụ na otú anyị pụrụ isi guzogide ya.”
Teta! Nov. 8
“Ì chere na ekpere nke ndị ndú okpukpe ma ọ bụ nke onye ọ bụla ọzọ na-ekpe pụrụ iweta udo ụwa? [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-ekwe nkwa na oge ga-abịa mgbe a ga-enwe udo zuru ụwa ọnụ. [Gụọ Aịsaịa 9:6, 7.] Ị̀ chọpụtara na ọ bụ onye ọchịchị pụrụ iche ga-eweta udo ụwa? Mbipụta Teta! a na-egosi onye bụ onyeisi ọchịchị ahụ na otú ọ ga-esi weta ezi udo.”
◆ “Amụma Bible na-egosi na oge na-abịa mgbe ọ na-adịghị onye ga-asị, ‘Ana m arịa ọrịa.’ [Gụọ Aịsaịa 33:24.] Nke a ọ̀ gaghị abụ ihe magburu onwe ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Otú ọ dị, ọrịa dị iche iche na-enye ihe a kpọrọ mmadụ nsogbu taa, gụnyere ọrịa AIDS. Mbipụta Teta! a na-aza ajụjụ ahụ bụ́, Ọ̀ dị mgbe a ga-akwụsị ọrịa AIDS?”
Ụlọ Nche Nov. 1
“Ọtụtụ n’ime anyị na-agbalị iso ndị ọzọ na-adị n’udo. Ma, ikekwe ị ga-ekweta na ọ na-adịkarị mfe ikwu ya ekwu karịa ime ya eme. [Nye ohere maka nzaghachi.] Bible na-akọwa ihe mere o ji dị otú ahụ. [Gụọ Jems 3:2.] Isiokwu a na-egosi otú ịrịọ mgbaghara pụrụ isi mee ka e nwetaghachi ma nọgide na-enwe udo.”