Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Oct. 15
“Ọtụtụ ndị na-ele agụmakwụkwọ anya dị ka isi ihe ga-eme ka mmadụ nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ. Ì chere na e nwere ụdị mmụta pụrụ inyere mmadụ aka ịbụ ezigbo mmadụ na ịnagide nsogbu ndị ọ na-enwe ná ndụ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gụọ Ndị Rom 12:2.] Magazin a na-ekwu banyere otú anyị pụrụ isi rite uru n’ụdị mmụta kasị mma e nwere.”
Ụlọ Nche Nov. 1
“Ọ na-ewute ọtụtụ mmadụ mgbe ha na-ahụ ka e si emegbu ụfọdụ mmadụ n’ụwa. Ì chere na ọ dị onye pụrụ ime ka e nwee mgbanwe n’ụwa a n’ezie? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a lebara anya n’ihe ndị na-eme ka a ghara inwe mgbanwe. O gosikwara onye ga-eme ka e nwee mgbanwe ndị a nakwa otú ọ ga-esi mee ka e nwee ụwa nke ezi udo na ntụkwasị obi ga-adị na ya.” Gụọ Abụ Ọma 72:12-14.
Teta! Nov. 8
“Ọtụtụ mmadụ na-enwe mmasị ịgụ akwụkwọ akụkọ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị ọ bụla. Ọ̀ dị gị ka anyị pụrụ iwere ihe ndị a na-ede n’akwụkwọ akụkọ dị ka eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Teta! a na-atụ aro otú a ga-esi rite uru site n’ịgụ akwụkwọ akụkọ. Ọ na-akọwakwa ihe mere o ji dị mkpa ka a kpachara anya.” Gụọ Ilu 14:15.
“N’ụwa nile, e nwere nnukwu ọdịiche dị n’etiti ndị ọgaranya na ndị ogbenye. Ọ̀ dị gị ka ọ dị ihe a pụrụ ime iji mee ka ọdịiche a ghara ịdịkwa ọzọ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zasịa, gụọ Matiu 6:9, 10.] Magazin a na-egosi ihe mere anyị ga-eji nwee obi ike na Alaeze Chineke ga-eme ka ahaghị nhata a nke na-akpa ụmụ mmadụ ezé n’ụwa taa kwụsị.”