Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Nov. 15
“Ụfọdụ ndị kweere na inwekwu ego ga-eme ka ndụ ha bụrụ nke na-enye afọ ojuju karị. Ì chere na nke ahụ bụ eziokwu? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama ihe otu nwoke nke bara ọgaranya nke ukwuu dere. [Gụọ Eklisiastis 5:10.] Magazin a na-ekwu banyere ụkpụrụ ndị bara uru karịa akụ̀ na ụba.”
Ụlọ Nche Nov. 1
“Ọtụtụ ndị ejighị n’aka na ndị ndú bụ́ mmadụ pụrụ ịgwọta nsogbu ndị e nwere taa. Ì chere na ọ dị onye pụrụ imezu ihe e buru n’amụma n’amaokwu ndị a? [Gụọ Abụ Ọma 72:7, 12, 16. Mgbe ahụ nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-akọwa onye onye ndú a e buru n’amụma bụ na ihe ọ ga-arụzu.”
Teta! Nov. 8
“Ọtụtụ ndị na-ahụ mkpa ọ dị ịzụ ụmụaka malite mgbe ha dị obere. Ị̀ na-ahụ mkpa ọ dị ime nke a taa? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Ilu 22:6. Sapetazie ebe isiokwu ndị ahụ dị.] Mbipụta Teta! a na-atụle kpọmkwem ihe ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji nyere ụmụ ha aka ịghọ ndị okenye na-akwụwa aka ọtọ, ndị na-enwekwa ihe ịga nke ọma.”
“Nduzi dị ụmụaka mkpa iji guzogide nrụgide ha na-enweta taa, í cheghị otú ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Ndị Efesọs 6:4.] Magazin a na-atụle ihe ịdọ aka ná ntị pụtara n’ezie. Ọ na-ekwukwa otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi nye nduzi na mgbazi n’emeghị ka ụmụ ha nwee nkụda mmụọ.”