Na-ejenụ Ije Dị Ka Ndị Maara Ihe
1 Mgbe Jizọs kpọrọ mmadụ anọ na-akụ azụ ka ha bịa bụrụ ụmụazụ ya, ha egbughị oge n’ikpebi ihe ha ga-eme, kama nke ahụ, “ozugbo ahụ, . . . ha sooro ya.” (Mat. 4:18-22) Mgbe Sọl onye Tasọs ghọrọ Onye Kraịst, e meekwa ka ọ hụwa ụzọ, o gbughịkwa oge, kama nke ahụ, ‘ozugbo ahụ n’ụlọ nzukọ, ọ malitere ikwusa Jizọs.’ (Ọrụ 9:20) Oge anaghị eche mmadụ; ọ gafehaala, ọ gafechaala. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ‘ka anyị na-eje ije dị ka ndị maara ihe’ n’otú anyị si eji oge anyị eme ihe.—Efe. 5:15, 16.
2 Ihe Ndapụta: Ohere ndị anyị nwere ife Jehova ugbu a nwere ike ifunyụ anya. (Jems 4:14) “Mgbe na ihe ndapụta” nwere ike ịdabara onye ọ bụla. (Ekli. 9:11) Ọzọkwa, ọ dịghị onye ga-abụ nwata ruo mgbe ebighị ebi, n’ụwa ugbu a kwa, ọ dịghị onye nwere ike ịgbanahụ “ụbọchị ihe ọjọọ” ndị ha na ime agadi na-eso, bụ́kwa ndị na-ebelata ihe ndị anyị nwere ike ime n’ozi Jehova. (Ekli. 12:1) N’ihi ya, ọ baghị uru igbu oge ịrara onwe anyị nye Chineke ma ọ bụ ichere ruo mgbe ihe nile dịchara mma tupu anyị emewe ihe nile anyị nwere ike ime ugbu a n’ozi anyị. (Luk 9:59-62) Obi ruru Ebreham ala n’oge agadi ya, ọ nwụkwara dị ka ‘agadi ndụ ya juru afọ’ n’ihi na o ji ndụ ya mee ihe bara uru, fee nanị Jehova.—Jen. 25:8.
3 Oge Dị Ntakịrị: Ihe ọzọ mere anyị kwesịrị iji jiri oge anyị na-eme ihe bara uru bụ na “oge fọdụrụnụ dị ntakịrị.” (1 Kọr. 7:29-31) N’oge na-adịghị anya, ajọ ụwa a ga-abịa ná njedebe. Ohere ndị anyị nwere ikere òkè ná nnukwu ọrụ nke ịchịkọta ndị yiri atụrụ n’oge ‘iwe ihe ubi ụwa’ ga-agwụ. (Mkpu. 14:15) Anyị aghaghị ịkpachara anya ka nchegbu nke ndụ na ihe ndọpụ uche ghara ịnapụ anyị oge ndị anyị kwesịrị iji eje ozi. (Luk 21:34, 35) Lee ka obi ga-esi dị anyị ụtọ ma anyị leghachi anya azụ ma hụ na anyị mere ihe nile anyị nwere ike ime n’owuwe ihe ubi ahụ!
4 Anyị aghaghị ịnọ na nche mgbe nile ka ihe ùgwù ije ozi ndị na-enye ọṅụ anyị nwere ike inweta ghara ịkwa anyị. Ka anyị kpebisie ike ime ihe nile anyị nwere ike ime iji nwee ike ijere Jehova ozi kwa ụbọchị “ma ọ bụrụhaala na a pụrụ ịkpọ ya ‘Taa.’” (Hib. 3:13) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-egosi na anyị bụ nnọọ ndị maara ihe, n’ihi na “onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.